Igbo Mass Readings for October 12 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 12 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 5:14-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Ndị Eze
Isi Okwu: Naaman lọghachiri n’ebe Elisha nọ, wee kwere na Dinwenụ.
N’usoro okwu Elisha, onye Chineke, Naaman manyere n’osimiri Jọdan ugboro asaa, wee bụrụ onye a sachara ọrịa ekpenta. Ahụ ya bịara dị mịrịmịrị ka ahụ nwatakịrị.
Mgbe Naaman na ndị niile so ya lọghachiri na be Elisha, Naaman guzooro n’ihu ya were kwuo sị: “Ugbu a ka m jiri mara na e nweghị Chineke ọzọ n’ụwa niile karịakwa n’ala Izrel.
Biko, nara onyinye nke a n’aka nwodibo gị.” Ma Elisha zara ya sị: “N’aha Chineke dị ndụ, Onye m na-agbara odibo, agaghị m ana gị ihe ọ bụla.” Ọ bụ ezie na Naaman rịọsiri ya ike, ma Elisha jụrụ ajụ.
Naaman were kwuo sị: “Ebe ị na-ekweghị anara m ihe ọ bụla, kwenụ ka e kponye m aja si n’ala ụnụ; aja ịnyịnya ibu abụọ nwere ike ibu, n’ihi na nwodibo gị enweghị ike ịchụnyere chi ọzọ aja nsure ọkụ, ma ọ bụ ụdị aja ọ bụla. Ọ bụ sọ Chineke ka m ga-achụnyere aja.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 97:1-4 Az. 2
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile nzọpụta Ya.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihi na Ọ rụọla ọruụ ebube.
Aka nri Ya dị asọ ewetala nzọpụta.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile nzọpụta Ya.
2. Onyenweanyị egosila nzọpụta Ya;
O gosịla mba niile ikpe Ya ziri ezi.
O chetala ịhụnanya na eziokwu Ya maka ụlọ Izrel.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile nzọpụta Ya.
3. Ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chukwu anyị.
Ụwa niile, ñụrịbanụ na Chineke,
tibenụ mkpu ọñụ, kwebenụ ukwe otito.
Azịza: Onyenweanyị egosila mba niile nzọpụta Ya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:8-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Timoti
Isi Okwu: Ọ bụrụ na anyị akwụdosie ike, anyị ga-esokwa Kristi na-achị!
Chetakwa Oziọma ahụ m na-ebugharị: “Na Jesu Kristi, Onye bilitere n’ọnwụ, si n’agbụrụ Devid pulite’. Ọ bụ n’ihi ihe a, ka e jiri bo m ahụhụ n’isi; nke na e kere m agbụ, ka a ga-asị na, arụ m mere bụ e mebeghị.
Mana ha enweghị ike ike ozi Chineke agbụ. Ọ pụtara na ana m edi ahụhụ niile a, n’ihi ndị a họtara ahọta; ka o wee bụrụ na n’oge ikpeazụ, ha ga-enweta nzọpụta ahụ nọ n’ime Kristi Jesu; na otito na ebube dị ebighị ebi, nke so ya na-aga.
Ihe a bụ okwu anyị kwesịrị ịdabere n’elu ya: Ọ bụrụ na anyị soro Ya nwụọ, ọ pụtara na anyị ga- eso Ya adị ndụ.
Ọ bụrụ na anyị jigidesie okwukwe anyị ike ruo na ngwụcha, anyị ga-eso Ya achị.
Ọ bụrụ na anyị agọnarị Ya, Ọ ga-agọnarị anyị.
Ọ bụrụ na anyị ekwesịghị ntụkwasị obi, O kwesịrị ntụkwasị obi, maka na O nweghị ike ịgọnarị onwe Ya.
MBEKU – 1 Thes. 5:18
Aleluya, aleluya!
Na-enyenụ ekele n’ihe niile: Nke a bụ mmasị Chineke maka ụnụ niile n’ime Jesu Kristi.
Aleluya!
OZIỌMA – 17:11-19
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: O nweghị onye n’ime ha nwere ike lọghachi azụ inye Chineke ekele karịa nwoke a bụ onye ọbịa.
Otu mgbe, Jesu si n’agbata Samerịa na Galili na-aga Jerusalem. Mgbe Ọ na-abanye n’otu obodo nta, ndị ekpenta iri zutere Ya. Ha guzopụrụ iche wee kpọọ Ya: “Nna anyị! Jesu! Meere anyị ebere!”
Mgbe Ọ hụrụ ha, Ọ sịrị ha: “Gaanụ, gosị ndị Ụkọchukwu onwe ụnụ!” Mgbe ha na-aga n’ụzọ, ka a sachara ha ọrịa ekpenta. Mgbe otu n’ime ha hụrụ na a gwọọla ya, ọ laghachiri were oke olu, na-enye Chineke otito.
Ọ bịara daa n’ala n’ụkwụ Jesu, na-enye Ya ekele. Nwoke ahụ bụ onye Samerịa. N’ihi ya ka Jesu jiri jụọ sị: “Ọ bụ na ọ bụghị mmadụ iri ka a gwọrọ ekpenta?
Olee ebe itolu ndị ọzọ nọ? Ọ pụtara na o nweghị onye ọzọ lọghachiri inye Chineke otito, ma ọ bụghị onye a bụ onye mba?” O wee sị nwoke ahụ: “Bilie, gaa nke gị, okwukwe gị azọọla gị!”
Igbo Mass Readings for October 12 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.