Igbo Mass Readings for October 15 2023, Ụka Nke Iri Abụọ na Asatọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 15 2023, Ụka Nke Iri Abụọ na Asatọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 25:6-10
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Onyenweanyị ga-akpọ nnukwu oriri bịakwa hichaa onye ọ bụla anya mmiri.
Ọ bụ n’ugwu nke a, ka Onyenweanyị nke igwe ndị agha, ga akpọrọ agbụrụ niile oke oriri, nke jupụtara na nri gbara abụba na mmanya bụ ọkachamma.
N’ugwu nke a, Ọ ga-ebibi ihe nfụchi ahụ fụchiri agbụrụ niile, na ihe mkpụchi ahụ e jiri kpuchi mba niile.
Ọ ga-ala ọnwụ n’iyi ruo mgbe ebighi ebi. Onyenweanyị Chineke ga ehicha anya mmiri niile n’ihu ha. Ọ ga-esi n
’ụwa niile wepụ nkwulu a na-ekwulul ndị nke Ya.
N’ụbọchị ahụ, a ga-asị: “Lee Chineke anyị, Onye anyị na-ele anya na Ọ ga-azọpụta anyị. Ka anyị ñụrịanụ ọñụ bịakwa nwee obi añụrị na Ọ zọpụtala anyị.”
N’ihi na aka nke Onyenweanyị ga-anọzi n’elu ugwu a.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps. 22 Az. 6
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị, ụbọchị ndụ m niile.
1. Dinwenụ bụ onye nche m.
O nweghị ihe ọ bụla ga-akọ m.
Ebe ahịhịa ndụ juru eju ka Ọ na-enye m ezumike.
Ọ na-eduga m n’agịga mmiri ka m zuru ike,
bịakwa na-agba m ume ka m kute ume ndụ. Azịza.
2. Ọ na-eduzi m n’ụzọ ziri ezi n’ihi aha Ya.
Ọ bụrụgodu na m na-aga na ndagwurugwuru nke ọchịchịrị,
egwu ọbụla agaghị atụ m.
N’ihi na I ji mkpara na ngụ Gị nọrọ m n’akụkụ,
iji gbaa m ume. Azịza.
3. I ji aka Gị kwadoro m oriri nke m ga-eri n’ihu ndị iro m.
I ji aka Gị tee m ude n’isi.
Iko mmanya m ejula n’ọnụ. Azịza.
4. Sọ ịdịmma na obi ọma Gị ga na-eso m n’ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Onyenweanyị ebighị ebi,
ebighị ebi. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:12-14, 19-20
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa
Isi Okwu: O nweghị ihe ọ bụla m na-agaghị emeri site n’enyemaka Onye ahụ na-agba m ume.
A mụtala m otu e si adị ndụ mgbe a nọ n’ụkọ, na otu e si ebi ndụ mgbe a nọ n’ụba. Agafeela m ihe ndị a, ha abịakwa doo m anya.
N’ihi ya, ebe ọ bụla na n’oge ọbụla, anọ m n’afọ ojuju: ma anọ m na nriju afọ, ma anọ m n’ebumọnụ; ma anọ m n’uju, ma anọ m n’ụkọ.
N’ime Onye ahụ na-enye m ike, enwere m ike ime ihe ọbụla.
Ma ụnụ mere nke ọma n’aka ụnụ nyeere m mgbe m nọ na mkpa. Chineke m ga-akwụ ụnụ ụgwọ, bịakwa gbooro ụnụ mkpa ụnụ n’uju, site n’ụdị akụ na ụba ahụ,
O gosiri anyị na Kristi Jesu. Ka otito dịrị Chineke Nna anyị, ebighị ebi, ebighị ebi, Amen.
MBEKU – Jọn 10:27
Alleluịa, Alleluịa:
Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-anụ olu M. Ama M ha, ha na-esokwa M.”
Alleluịa.
OZIỌMA – Matiu 22:1-14 ma ọ bụ 22:1-10
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Kpọbanụ onye ọ bụla n’oriri agbamakwụkwọ.
Jesu gwara ndị isi nchụaja na ndị okenye mmadụ okwu n’ilu ọzọ sị: “Alaeze eluigwe dị ka otu onye eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwunye maka nwa ya nwoke.
O zipụrụ ụmụ odibo ya, ka ha kpọọ ndị a kpọrọ oku maka oriri ọlụlụ nwunye, ma ndị a kpọrọ oku jụrụ ịbịa.
Ọ bịakwara zipụ ụmụ odibo ya ndị ọzọ sị ha: Gwanụ ndị a kpọrọ oku: “Lee! E dozichaala m ihe oriri.
Egbuola m ehi na ewu gbara abụba maka oriri. Ihe dum ezuole! Bịawanụ oriri ọlụlụ nwunye”!
Ma ndị a kpọrọ oku lefuuru ya anya, gawara nke ha: Otu jere n’ubi ya. Nke ọzọ jee n’ụlọ ahịa ya.
Ndị ọzọ jidere ụmụ odibo eze mesie ha ike, wee gbuo ha. Ihe a wutere eze nke ukwuu. O wee zipụ ndị agha ya, ka ha kwụgbuo ndị ogbu ọchụ ahụ, kpọọ obodo ha ọkụ.
Eze bịakwara gwa ụmụ odibo ya sị: “Akwadochaala m oriri ọlụlụ nwunye nwa m, ma ndị a kpọrọ ka ha rie ya egosila na ha etorughị ogo iri ya.
N’ihi ya, gaanụ n’akụkụ okporo ụzọ, kpọkọta ndị niile ha hụrụ, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ. Ụlọ oriri ahụ jupụtakwara na ndị a kpọrọ.
“Ma mgbe eze batara ihụ ndị bịara oriri, ọ hụrụ otu nwoke nọ ebe ahụ n’eyighị uwe oriri ọlụlụ nwunye.
Eze jụrụ ya: ‘Enyi m, olee otu i si bata ebe a n’eyighị uwe ọlụlụ di na nwunye?’ Ma nwoke ahụ gbachiri ya nkịtị.
Eze gwara ndị na-ejere ya ozi sị: “Keenụ ya ụkwụ na aka, tụpụ ya na mbara ezi, n’ime ọchịchịrị; ebe ahụ ka ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.’
N’ihi na ọ bụ ezie na a kpọrọ ọtụtụ mmadụ, ma ọ bụ mmadụ ole na ole ka a họtara.
Igbo Mass Readings for October 16 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Asatọ N’Oge Nkịtị
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.