Igbo Mass Readings for September 8 2024, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 8 2024, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 35:4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ọ ga-eme ka ndị ntị chiri nụ ihe, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọñụ.

Gwa ndị ahụ na-asụ ngọngọ ume: “Ụjọ atụla ụnụ. Jisienụ obi ike. Lee Chineke ụnụ ka Ọ na-abịa ịbọtara ụnụ ọbọ. O ji ịkwụ ụgwọ nke o jiri bụrụ Chineke na-abịa ịzọpụta ụnụ.”

Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị kpuru isi; bịakwa kpọghee ntị ndị ntị chiri. Ndị ngwọrọ ga-awụlite elu ka ele. Ire ndị ogbi ewee tie mkpu ọñụ. Mmiri iyi ga-asọpụta n’ọzara. Abịakwa nwee osimiri ga-asọpụta n’ala kpọrọ nkụ.

Uzuzu na-ahụ ọkụ ga-aghọ ọdọ mmiri; ala ahụ kpọrọ nkụ ewee ghọọ isi iyi.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 145:7-10. Az. 1

Azịza: Mkpụrụ obi too Onyenweanyị. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Ọ bụ Onyenweanyị na-edebe nkwa O kwere ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu.

Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri.

Onyenweanyị na-eme ka ndị e ji eji nwere onwe ha. Azịza.

2. Onyenweanyị na-eme ka ndị isi hụwa ụzọ.

Onyenweanyị na-eme ka ndị huru ehuru guzoro eguzoro.

Onyenweanyị hụrụ ndị ezi omume n’anya.

Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa. Azịza.

3. Onyenweanyị na-ekulite nwaogbenye na nwanyị isimkpe,

ma Ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma.

Onyenweanyị ga-achịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Zayọn! Chineke gị ga-esi na ndụdụgandụ chịruo na ndụdụgandụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis dị asọ dere

Isi okwu: Chineke ahọpụtala ndị ogbenye ka ha keta alịeze.

Ụmụnna m, ebe anyị niile bụ ndị kwere n’Onyenweanyị Jesu Kristi Onye dị ebube, K’anyị hapụ ile mmadụ anya n’ihu, si otu a na-akpa oke. Dị ka ihe ịma atụ, ọ bụrụ na onye ọgaranya yi uwe mara mma, yikwara mgba n’aka e ji ọlaedo mee na mkpịsị aka ya, abata n’ụlọ nzukọ ụnụ, ọ bụrụkwa na nwa ogbenye abata nke yi uwe na-adịghị ọcha, ọ bụrụ na ụnụ elee onye ọgaranya ahụ anya sị ya, “Bịa nọdụ n’otu oche a e debere iche n’ihi gị,” ma ụnụ asị onye ogbenye ahụ, “Di anyị, i nwere ike iguzo n’ebe ahụ,” ma ọ bụ “Bịa nọdụ ala n’ebe a ụkwụ m dị,” Ọ bụ na ụnụ esitebeghị n’ụzọ dị otu a gosị na ụnụ nabatara otu onye karịa ibe ya?

Nke a o gosikwaghị na ụnụ abụrụla ndị ikpe nwere echiche ọjọọ? Geenụ ntị ka m gwa ụnụ ụmụnna m, Ọ bụ na ụnụ amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dị ka ndị ogbenye mee ha ka ha bụrụ ọgaranya site n’Okwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ Chineke Kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?

MBEKU – Jọn 8:12

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Abụ M ihè nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M ga-enwe ihè nke ndụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 7:31-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi okwu: O mere ndị ntị chiri ka ha nụwa ihe; mee ndị ogbi ha kwube okwu.

Jesu hapụrụ ala Taya, bịa si n’ụzọ Sidọn lọghachi n’Osimiri Galili, wee banye n’ọnụmara Obodo Iri ahụ. Ndị mmadụ wee kpọtara Ya otu nwoke ntị chiri, nke na-adịghị ekwu okwu.

Ha rịọrọ Jesu ka O bikwasị ya aka ọgwụgwọ. Jesu si n’ebe ahụ igwe mmadụ nọ, kpọrọ ya pụọ ebe naanị Ya na ya nọ. Jesu wee rụnye ya mkpịsị aka na ntị, bịakwa buru asụ mesa n’ire onye ogbi ahụ.

O wee lee anya n’eluigwe, sụọ ude, sị nwoke ahụ, “Efeta!” nke isi ya bụ, “Ghere oghe!” Ngwa ngwa ntị nwoke ahụ wee meghee. Ihe kedoro ya n’ire wee tọghasịa.

O wee kwube okwu nke ọma. Jesu nyere ndị nọ ebe ahụ iwu, ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla. Ma mgbe Ọ na-agwa ha akọrọla onye ọ bụla, bụ mgbe ha na-akọsa akụkọ ahụ n’ebe ọ bụla.

Egwu jidere ha bụ ụdị nke ahụ a na-enweghị ọnụ e ji akọwa ya. “O meela ihe niile nke ọma! O mere ndị ntị chiri, ka ha nụwa ihe, bịakwa mee ndị ogbi ka ha kwuwe okwu.”

Igbo Mass Readings for September 9 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for September 8 2024, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 11, 2023