Igbo Mass Readings for September 7 2025, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 7 2025, Ụka nke Iri Abụọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:13-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: Onye ga-akọta ihe Chineke chọrọ?
Οlee mmadụ nwere ike ịmata obi Chineke? Ma ọ bụ, onye ga-akọta ihe Chineke bu n’uche? Echiche nọ mmadụ n’obi abụghị ihe a na-atụkwasị obi. Ihe anyị bu n’uche na-agafe agafe, n’ihi na ahụ na-anwụ anwụ na-anyịda mkpụrụobi; ụlọ aja nke a abịa were ọtụtụ ihe na-adagide uche mmadụ.
O sirila anyị ike ịmata ihe nọ n’ụwa. Ọ bụkwa anyị nnukwu ọrụ ịchọta ihe dị n’ihu. Ma, olee onye ga-achọpụta ihe nọ n’eluigwe? Onye pụrụ ịmata ihe I bu n’uche ma ọ bụghị na i nyere mmụọ nke amamihe, bịakwa zidata mmụọ Gị dị asọ nke si n’elu kacha elu?
N’ihi nke a, ka ụzọ ndị nọ n’ụwa ji kwụrụ ọtọ, abịakwa kụziere ndị mmadụ ihe na-amasị Gị. Onyenweanyị, maka na site n’ụbọchị mbụ, ọ bụ site n’amamihe ka e jiri zọpụta ihe ọ bụla na-amasị Gị.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 89:3-6. 12-14. 17. Az. 1
Azịza: Onyenweanyị, Gị bụ onye nchedo anyị site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
1. Ị na-emegharị mmadụ ka ọ bụrụ ntụ;
Ị bịakwa sị: “Ụmụ mmadụ, laghachinụ azụ.”
N’ihi na puku afọ n’ihu Gị dị ka ụnyaahụ gara aga;
ọ dị ka nche abalị. Azịza.
2. Ị na-azachapụ ndị mmadụ dịka nrọ:
dịka ahịhịa na-epulite n’ụtụtụ.
N’ụtụtụ ọ pụọ bịa mịta ifuru.
Ma n’oge mgbede, ọ kpọnwụọ bịa nwụsịsịa. Azịza.
3. Mee ka anyị mata otu ndụ anyị si dị nkenke,
ka anyị wee nweta amamihe n’obi anyị.
Onyenweanyị, majụọ! Iwe Gị ọ ga-adịgide ebighị ebi?
Gosị ụmụodibo Gị ebere Gị. Azịza.
4. Na chi ọbụbọ, mee ka anyị jupụta n’ịhụnanya Gị.
Anyị ga-añụrị na egorikwa ụbọchị niile nke ndụ anyị.
Ka ihu ọma nke Dinwenụ Chineke anyị dịnyere anyị;
ka e were nyekwa ọrụ aka anyị ọganihu. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 9-10:12-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Filemọn
Isi Okwu: Biko, nabata ya: ọ bụghịkwa dịka ohu ọzọ kama ọ bụ dịka ezigbo nwanne.
Kama n’ihi ịhụnanya, ọ ka mma ịrịọ gị arịrịọ. Ana m echetara gị na ọ bụ mụ onwe mbụ Pọl, na-edere gị akwụkwọ a. Ugbu a, aghọọla m agadi. Ma nke ka nke bụ na, abụtọkwa m onye a tụrụ mkpọrọ n’ihi Kristi Jesu.
Biko, ana m arịọ gị arịrịọ banyere nwa m; nwa m mụtara ebe a, a tụrụ m mkpọrọ n’ụkwụ na n’aka. Nwa m na-ekwu maka ya bụ Onesimọs. Ana m ezighachiri gị ya; e nwere ike ịsị na m sikwa otu ahụ na-ezitere gị akụkụ onwe m.
Ọ garala atọ m ụtọ n’obi, ka mụ na ya nọdụ; ka ọ na-ejere m ozi i kwesịrị ijere m, oge a niile m nọ mkpọrọ n’ihi Oziọma ahụ. Ma achọghị m ime ihe ọ bụla n’enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka a manyere gị amanye ka i mee obi ọma; ka a ga-asị na obi ọma ahụ esighị gị n’obi pụta.
Kama achọrọ m ka obi ọma i mere bụrụ nke siri gị n’obi pụta. Ama m na a napụrụ gị Onesimọs nwa oge ntakịrị, ka e wee nyeghachie gị ya mgbe niile mgbe niile ruo mgbe ebighị ebi.
Ugbu a, e nyeghachighị gị Onesimọs ọzọ dịka ohu, kama ọ bụ dịka ihe karịrị ohu, nke bụ nwanne dị ụtọ. Ọ bụ onye m bu n’obi karịchaa. Mana nke gị na ya bụ na, ọ bụghị sọsọ na ọ bụ nwanne gị n’ime Onyenweanyị, ma ọ bụkwa nwanne gị, onye gị na ya si n’otu agbụrụ.
Ihe ọ pụtara bụ: Ọ bụrụ na i ji ihe niile jikọtara anyị ọnụ kpọrọ ihe, nabata ya nke ọma otu ị ga-esi anabata m nke ọma.
MBEKU – Abụọma 118:135
Aleluya, aleluya!
Ka ihu Gị chakwasị nwodibo Gị. Kuziere m iwu Gị.
Aleluya!
OZIỌMA – 14:25-33
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Onye na-ebughị ụzọ jụ ihe niile o nwere, enweghị ike ịbụ nwa azụ M.
Otu mgbe, nnukwu igwe mmadụ so Jesu na-aga n’ụzọ. O wee chigharịa, sị ha, “Onye ọ bụla na- abịakwute M, ma ọ kpọghị nna ya na nne ya asị, na nwunye ya, na ụmụ ya, na nwanne ya nwoke, na nwanne ya nwanyị, na ndụ ya, onye ahụ enweghị ike ịbụ nwaazụ M.
Onye ọ bụla kwa na-agaghị eburu obe ya soro m n’azụ, e nweghị ike ịbụ nwaazụ M. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụnụ nọ ebe a, na-akwado iwu ụlọ elu, ọ bụ na ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala; pịa ego ole ụlọ elu ga-ewe, ka o wee mara ma o nwere ego ga-ezu ụlọ elu?
Ọ bụrụ na o bughị ụzọ mee otu a, o nwere ike ịtọ ntọala e ji ewu ụlọ elu, tupu ọ chọpụta na ọ bụrụla ọrụ ọ na-enweghị ike ịrụcha. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-eji ya na-eme ihe ọchị, na-asị: “Leenụ kemgbe nwoke a bidoro iwu ụlọ a, ma o nwebeghị ike wuchaa ya’!
“Ma ọ bụ, olee eze ga-achịrị puku ndị agha iri, buru agha gawa ibuso eze ọzọ nwere puku ndị agha iri abụọ? Ọ bụ na ọ gaghị ebu ụzọ nọdụ ala, tụlee ma o nwere ike ibuso ya agha?
Ma ọ bụrụ na o nweghị ike, ọ ga-eziga ndị ozi rịọ, kwe nkwa, mee ka e kpee udo mgbe onye na-ebuso ya agha nọ n’ebe dị anya. N’otu aka ahụ kwa, onye ọ bụla n’ime ụnụ na-ebughị ụzọ jụ akụ na ụba ya niile, enweghị ike ịbụ nwaazụ M.
Igbo Mass Readings for September 8 2025, Emume nke Ọmụmụ nke Vegin Marịa dị Ngọzi