Igbo Mass Readings for September 24 2023, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 24 2023, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 55:6-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Echiche M abụghị echiche ụnụ
Chọwanụ Onyenweanyị mgbe e nwere ike ịchọta Ya. Kpọọnụ ya oku mgbe Ọ nọ nso. Ka ọkpa aghara hapụ ụzọ ọjọọ ya. Ka ajọ mmadụ hapụ ajọ echiche ya.
Ya chee Onyenweanyị ihu bịakwa rịọ ebere Ya. Ya bịakwute Chineke anyị maka na ọ bụ Onye amara na Onye nwere obi mgbaghara. N’ihi na Onyenweanyị kwuru sị: Echiche M abụghị echiche ụnụ, nke ụzọ M na-abụ ụzọ ụnụ.
Dịka eluigwe si dị elu karịa elu ala, otu ahụ ka ụzọ M si dị elu karịa ụzọ ụnụ. Otu ahụ kwa ka echiche M si dị elu karịa echiche ụnụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:2-3,8-9, 17-18 Az. 18
Azịza: Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku Ya nso.
1. Ụbọchị niile, aga m eto Gị.
Aga m eto aha Gị.
Aga m eto Gị ebighị ebi, ebighị ebi.
Onyenweanyị dị ukwu! O kwesịrị nnukwu otito.
Ịdị ukwu Ya karịrị ihe mmadụ pụrụ ịghọta. Azịza.
2. Onyenweanyị bụ Onye amara na Onye ebere.
Ọ naghị ewe iwe ọkụ. O jupụtara n’obi ọma.
Ọ na- emere ihe niile O kere ebere. Azịza.
3. Onyenweanyị kwụbara aka ọtọ n’ụzọ Ya niile.
Dịkwa asọ n’ọrụ aka Ya niile.
Onyenweanyị nọ ndị niile na-akpọku Ya nso,
ndị ji ezi okwu na akpọku Ya. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:20-24, 27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipi
Isi Okwu: Ndụ m dị bụ Kristi
A ga-esị na m kwanyere Kristi ugwu, ma adị m ndụ, ma anwụrụ m anwụ. N’ebe m nọ, ihe m ghọtara bụ na ndụ bụ Kristi. M nwụọ anwụ, eritere m uru.
M biri ndụ n’anụ ahụ, ejim ya rụpụta ọrụ bara uru. Ndụ na ọnwụ, a maghị m nke ọ dị m ka m họrọ. Ha abụọ dịcha m mma. Ọ na-adị m ka a tọhapụ m n’ụwa, ka m jee binyere Kristi.
Ọ dị ka ọ bụ nke ahụ kaara m mma. Ma, n’ihi ụnụ, ọ dịka ọ kara baa uru ma ọ bụrụ na m biri ndụ n’anụ ahụ. N’ihi ya, kpaanụ ezigbo agwa n’ụzọ kwesịrị Oziọma nke Kristi.
MBEKU – 1 Sam 3: 9., Jon 6:68
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwube na nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 20:1-16
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ị na-enwe anya ukwu maka na enwere m obi ọma?
Jesu gwara Ụmụazụ ya, sị: “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke nwere ubi vaịn, onye pụrụ n’isi ụtụtụ, ịchọta ndị ọrụ ọ ga-etinye n’ubi ya. Mgbe ya na ndị ọrụ ahụ kwubiri na ọ ga-akwụ ha otu mkpụrụ ego n’ụbọchị, o zigara ha n’ubi ya.
Mgbe elekere itolu gasịrị, ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ebe ha guzo na nkịtị n’Ọma-ahịa. O wee sị ha: ‘Jeenụ rụọrọ m ọrụ n’ubi m. Ihe ọ bụla ziri ezi ka m ga-akwụ ụnụ.
Ha wee jee. Ọ pụkwa ọzọ n’elekere iri na abụọ na n’elekere atọ n’ehihie, meekwa otu aka ahụ. “Ihe dị ka n’elekere ise na mgbede, ọ pụkwara hụ ndị ọzọ ka ha guzo na nkịtị. O wee sị ha: ‘Gịnị mere ụnụ ji guzo n’ebe a kemgbe taa n’arụghị ọrụ?
Ha zara ya: ‘N’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla goro anyị ọrụ! Ọ sị ha: ‘Gawanụ n’ubi m!’ “Ma mgbe o ruru mgbede, onye nwe ubi ahụ gwara odibo na-elekọtara ya ubi anya, sị: ‘Kpokọta ndị ọrụ, kwụọ ha ụgwọ ọrụ ha; malite na ndị ikpeazụ ruo na ndị bu ụzọ.
Ndị bịara ọrụ n’elekere ise nke mgbede pụtara, a kwụọ onye ọ bụla n’ime ha otu mkpụrụ ego. Ma mgbe ndị buru ụzọ bido ọrụ bịara, ha chere na a ga-akwụ ha ụgwọ kariri nke ndị ọzọ.
Ma ihe onye natara, ka ibe ya natara. Onye ọ bụla natara naanị otu mkpụrụ ego. “Mgbe ndị bu ụzọ natara ego ha, ha tamuru ntamu sị ọgaranya ahụ nwe ubi: ‘Ndị a bịakpere azụ rụrụ ọrụ naanị otu elekere.
Ma i meela ka anyị na ha hara otu – anyị bụ ndị sitere kemgbe chi bọrọ, dọlịwa ndọlị dị n’ọrụ; anwụ niile chara n’ụbọchị taa chara anyị n’isi!’ “Onye nwe ubi zara otu n’ime ha: ‘Enyi m, gịnị ka m ji mejọọ gị?
Ihe mụ na gị kwuru, ọ bụkwa na m ga-akwụ gị otu mkpụrụ ego n’ụbọchị? Nara ihe ruuru gị lawa. A chọrọ m ịkwụ onye ikpeazụ ụgwọ ahụ m kwụrụ onye bu ụzọ.
Ọ bụ na m enweghị ike iji ego m mee amara? Ọ na-ewute gị na abụ m onye obi ọma? “Otu a ka onye bu uzo ga-esi ghọọ onye ikpeazụ, onye ikpeazụ aghọọ onye bu ụzọ.”
Igbo Mass Readings for September 25 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Nkịtị