Igbo Mass Readings for September 22 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 22 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:12.17-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: Ka anyị maa ya ikpe ọnwụ ihere
Ndị ajọ mmadụ kwuru sị, Ngwanụ ka anyị gbaa onye ezi omume gburugburu kpugide ya, n’ihi na ọ na-akasị anyị anya. Ọ pụụrụ onwe ya iche bịa na-emeghasị ihe niile anyị na-eme.
Ọ na-abara anyị mba, na ata anyị ụta na anyị na-emebi iwu. Ọ na-ama anyị ikpe na anyị na-emerụ ọzụzụ a zụrụ anyị. Ngwanụ ka anyị leghaa ma okwu ya, ọ bụ ezi okwu.
Ka anyị chọpụta ihe ga-eme ya. N’ihi na, a na sị na onye ezi omume bụ nwa Chineke, Chineke ga-alụrụ ya ọgụ, bịakwa zọpụta ya n’aka ndị iro ya. Ka anyị were nkwutọ na ntamahụhụ leghaa ya, iji chọpụta ma ọ ga-anọrọ nwayọọ were ndidi digbuo ihe niile. Ka anyị ma ya ikpe ọnwụ ihere: n’ihi na ihe o kwutere n’ọnụ bụ, na Chineke ga-azọ ya.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 53:3-6, 8 Az. 6
Azịza: Onyenweanyị na-ewelite ndụ m.
1. Chineke m, were aha Gị zọpụta m.
Were ike Gị lụọrọ m ọgụ.
Chineke m, nụrụ arịrịọ m.
Chee ntị n’okwu si m n’ọnụ. Azịza.
2. N’ihi na ndị nganga ebiliela imegide m.
Ndị na-akpọghị ndụ ihe ọ bụla na-achọ iwepụ ndụ m n’ike.
Ha akpọkwaghị Chineke ihe ọ bụla. Azịza.
3. Ma lee, Chineke bụ enyemaka m.
Onyenweanyị na-akwalite ndụ m.
Aga m eji obi m niile achụrụ Gị aja.
Onyenweanyị aga m eto aha Gị n’ihi na Ị dị mma. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:16-4:3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis asọ dere
Isi Okwu: Mgbe ndị na-eme udo na-ekpe udo, ha na-agha mkpụrụ ga-amịta ịdị nsọ.
Ebe ọ bụla ekworo na oke ọchịchọ dị, n’ebe ahụ ka a na-ahụ ekwe ekwe, na ime ụdị arụ niile dị iche iche. Ma amamihe si n’eluigwe bịa, bụ ihe na-arụghị arụ.
O jupụtara n’udo, na-ewetakwa obi ọma, na ume na obi iru ala. O jupụtara n’ebere, na-egosikwa onwe ya site n’ịrụ ezi ọrụ. A naghị ahụ mmegbu na arụrụala n’ime ya.
Mgbe ndị na-eme udo na-ekpe udo, ha na-agha mkpụrụ ga-amịta ịdị nsọ. Olee ihe na-akpata ibu agha, na ịlụ ọgụ n’etiti ụnụ na ibe ụnụ? Ọ bụ na ọ bụghị oke ọchịchọ dị iche iche, nke na-ebuso ibe ha agha n’ime ụnụ?
Ị chọrọ ihe, ị chọtaghị ya n’ihi ya, ị kwadoro igburu ya mmadụ. Ị chọrọ ihe, i nwetaghị ya; n’ihi ya, i bido ọgụ na mgba, ka i nweta ya n’ike. Ihe i jiri enwetaghị ihe ị na-achọ bụ maka na ị naghị ekpe ekpere maka ya.
Ọ bụrụ na ị kpere ekpere, ma ịrịọtaghị ihe ị na-arịọ, ọ bụ maka na i kpezighị ekpere gị nke ọma. Ihe ị rịọrọ bụ ka e nye gị, ihe ga-ezuru gị oke ọchịchọ ahụ bi n’ime gị.
MBEKU – Matiu.11:25
Aleluya, aleluya!
Nna, ngọzi dịrị Gị, Onyenwe eluigwe na ụwa. Ọ bụ ụmụ ntakịrị ka I gosiri ihe omimi nke alaeze ahụ.
Aleluya!
OZIỌMA – 9:30-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: A ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee n’aka ndị mmadụ.
Jesu na Ụmụazụ Ya si n’ugwu gbadata, wee na-agafe na Galili. Ma o nweghị onye ọ bụla ọ chọrọ ka ọ mata, n’ihi na e nwere ihe Ọ na-akụziri Ụmụazụ Ya.
Ọ na-akụziri ha na: ‘A ga-arara Nwa nke Mmadụ nyefee n’aka ndị mmadụ. Ha ga-egbu Ya. Ma mgbe ha gbuchara Ya, Ọ ga-ebilitekwa ọzọ n’ụbọchị nke atọ.” Ma Ụmụazụ Ya aghọtaghị ihe O kwuru.
Ma ụjọ ekweghị ha jụghaa Ya ihe O kwuru. E mesịa ha bịarutere Kapanọm. Mgbe ha banyere n’ime ụlọ, Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị ka ụnụ na-arụrịta ụka banyere ya, mgbe anyị nọ n’ụzọ?”
Ha ekwughị ihe ọ bụla, n’ihi na mgbe ha nọ n’ụzọ, ha na-arụrịta ụka banyere onye kachasị ibe ya n’etiti ha. O wee nọdụ ala, kpọkọta Ụmụazụ iri-na-abụọ ahụ wee sị ha: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ga-eme onwe ya onye ikpeazụ na odibo mmadụ niile.” O wee kpọrọ otu nwantakịrị, guzowe ya n’etiti ha.
O kuuru nwanta ahụ n’aka ya sị ha: “Onye ọ bụla nabatara nwata ntakịrị dị otu a n’aha M, nabatara M. Onye ọ bụla nabatara M, ọ bụghị M ka ọ nabatara; kama ọ nabatara Onye ahụ zitere M.”
Igbo Mass Readings for September 23 2024, Ncheta Pius nke Pietrelcina
Igbo Mass Readings for September 22 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.