Igbo Mass Readings for September 27 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 27 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:25-28

Ihe Ọgụgụ nke e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel

Isi Okwu: Ọ bụrụ na onye njọ ewepụ aka na njọ, n’ezie ọ ga-ebi.

Οkwu Onyenweanyị ruru m ntị sị m: “Ụnụ na-ekwu, Ụzọ Onyenweanyị ezighị ezi.” Ụlọ Izrel, biko geenụ ntị: Ọ bụ ụzọ M bụ nke na-ezighị ezi? Ọ bụ na ọ bụghị ụzọ ụnụ bụ nke na-ezighị ezi?

Mgbe onye ezi omume siri n’ezi omume chigharịa, malite ime mmehie, ọnwụ gbuo ya, ọ bụ n’ihi ajọ omume o metara ka o jiri nwụọ. Ma onye ajọ omume si n’ajọ omume chigharịa, malite ime ezi omume, ọ ga-echedo ndụ ya. N’ihi na ọ tụleela n’obi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 24:4-9 Az. 6

Azịza: Onyenweanyị, chetanụ ebere Gị.

1. Onyenweanyị, mee ka m mata ụzọ Gị.

Kuziere m okporo ụzọ Gị.

Duziwe m n’ezi okwu Gị, na- agbazikwara m. Azịza.

2. Onyenweanyị, cheta na obi ebere na obi ọma Gị na-na-adị sitere na mgbe ochie.

E chetakwala njọ m mere na okorobịa n’adịghị ike m.

Onyenweanyị cheta m n’obi ọma Gị, n’ihi na Ị dị mma. Azịza.

3. Onyenweanyị dị mma bụrụkwa onye ezi omume.

Otu a ka O si egosi ndị njọ ụzọ.

Ọ na-eduba onye umeala n’ezi omume,

bịakwa na-akuziri ndị umeala ụzọ Ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-11 maọbụ 2:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa.

Isi Okwu: Echiche ụnụ ga-adị ka nke Kristi

A sị ụnụ ji ndụ anyị dị n’ime Kristi kpọrọ ihe! A sị ịhụnanya nwere ike ịkpalite ụnụ ka ụnụ mee ihe ọ bụla, ma ọ bụ Mmụọ Nsọ ahụ anyị nwekọtara ọnụ!

A sị ọ bụ inwe obi ebere ma ọ bụ obi ọma ka ụnụ jiri kpọrọ ihe, jikọtanụ ọnụ n’inwe otu obi na inwe ịhụnanya. Werenụ otu uche gbawa mbọ inweta otu ihe ahụ anyị na-achọ.

Ihe a bụ sọ otu ihe ga-eme ka m jupụta n’añụrị. Onye emekwala ka e too naanị ya. Onye aghọkwala aghụghọ. Kama onye ọ bụla ga na-achọ ihe ga-abara ibe ya uru.

Were ya, na nke onye nke ọzọ, ka nke gị mkpa; ka a ghara inwe onye bu ụzọ na-achọ nke onwe ya, nke onwe ya. Kama ka onye ọ bụla chewe maka ọdịmma ndị ọzọ.

Uche ụnụ kwesịrị ịdị ka nke Kristi Jesu: [Onye dị ezie n’ụdị Chineke. Ma O kwedosịghị aka ike n’ịha n’otu nke Ya na Chineke. Kama, O mere onwe Ya ka onye na-abụghị ihe ọ bụla; O werela ọnọdụ ohu.

Ọ bịa dị ka mmadụ. Ọ bụghị sọ na Ọ bịara dị ka mmadụ, kama O wedatara onwe Ya n’ala, wee rubegide isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe. Ma Chineke buliri Ya oke elu, bịakwa nye Ya aha kacha aha niile; ka o wee bụrụ na a kpọọ aha Jesu, ihe niile ga-egbu ikpere n’ala – ma ihe niile dị n’eluigwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ihe niile dị n’okpuru ụwa.

A kpọọ aha Jesu, ire niile ga-ekwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, maka otito na ebube nke Chineke Nna.

MBEKU – Jọn 6, 63.68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji ozi nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya.

OZIỌMA – 21:28-32

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’alaeze Chineke.

Jesu jụrụ ndị isi nchụaja na ndị okenye sị: “Gịnị ka ụnụ chere? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ. O jekwuuru nke diọkpara sị ya: ‘Nwa m, jee ọrụ n’ubi m taa.

Ma ọ zara sị: ‘Agaghị m eje.’ Ma o mesịrị chegharịa, jee ọrụ n’ubi nna ya. Nwoke ahụ jekwukwara nwa ya nke abụọ, ziekwa ya otu ozi ahụ. Nwa ya zara ya: ‘Nna m, aga m ejerịrị ya.

Ma o jeghị. N’ime ụmụ abụọ ndị a, olee nke mere ihe nna ya chọrọ”? Ha zara sị: “Ọ bụ nke mbụ.” Jesu wee sị ha: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’Alaeze Chineke.

N’ihi na mgbe Jọn Ome Mmirichukwu jiri ịkwụba aka ọtọ bịakwute ụnụ, ụnụ ekweghị n’ihe o kwuru. Ma ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwanyị akwụna kweere na ya. Ọ bụna mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emesịghị chegharịa, kwere na ya.”

Igbo Mass Readings for September 28 2026, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for September 27 2026, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 11, 2023