Igbo Mass Readings for September 29 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 29 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 11:25-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ
Isi Okwu: Ọ bụ n’ihi ịgbachitere m ka i ji chọọ ka m kwụsị ha?
Onyenweanyị gbadatara n’urukpu wee gwa Mosis okwu. O weere ụfọdụ mmụọ ahụ dị n’ime Mosis nye iri ndị okenye asaa ahụ. Mgbe mmụọ ahụ dakwasara ha, ha bidoro buwe amụma. Ugbu a, mmadụ abụọ a na-akpọ
Eldad na Medad anọghị n’ọgbakọ ahụ, mana a hapụrụ ha n’ụlọ obibi. E soro dee aha ha n’akwụkwọ, ma ha esoghị pụta n’ụlọ ikwuu ahụ. Ma mmụọ ahụ bịakwara dakwasa ha; ha wee na-ebu amụma ebe ha nọ n’ụlọ obibi.
N’ihi ya, mgbe otu nwata nwokorobịa gbaara ọsọ kọọrọ Mosis: “Eldad na Medad na-ebu amụma n’ụlọ obibi,” Joshua nwa Nun, onye bidoro na nwata sowe Mosis wee sị: “Nna m ukwu Mosis, sị ha kwụsị ya.”
Ma Mosis zara ya: “Ọ bụ n’ihi ịgbachitere m ka i ji chọọ ka m kwụsị ha? Ya kwe omume, ọ masịrị m ka ndị nke Onyenweanyị niile bụrụchaa ndị amụma! Ọ dị m nnọọ ka e nyecha ha niile mmụọ ahụ!”
ABỤỌMA N NA AZỊZA YA – 18:8, 10, 12-14. Az. 9
Azịza: Atụmatụ nke Onyenweanyị na-enye obi añụrị.
1. Iwu nke Onyenweanyị zuru oke.
Ọ na-agba anyị ume.
Atụmatụ nke Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasa obi.
Ọ na-enye onye umeala amamihe. Azịza.
2. Ịtụ egwu Onyenweanyị dị ọcha.
Ọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ihe nhazi nke Onyenweanyị bụ ezi okwu.
Ha niile zichara ezi. Azịza.
3. Ọ bụ ezie na nwodibo Gị kpachapụụrụ ha anya;
bịakwa were ileru anya ala nke ọma na-edebe ha.
Ma ọ bụ onye nwere ike ịchọpụta mgbe a dara?
Ghụchaa m na mmehie m mere n’amaghị ama. Azịza.
4. Nke ka nke, e kwela ka nwodibo Gị nyaa isi na njọ.
E kwela ka njọ chịa m.
Mgbe ahụ ka m ga-akwụba aka m ọtọ;
a gharakwa isota nnukwu njọ ọ bụla n’aka m. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Jemis dị asọ
Isi Okwu: Akụ na ụba ụnụ alaala n’iyii!
Ugbu a geenụ ntị, ụnụ ndị ọgaranya! Bidonụ ịkwa akwa! Bewenụ akwa maka ihe nhụju anya dị iche iche nke ga-abịakwasị ụnụ! Akụ na ụba ụnụ alaala n’iyii!
Uwe niile ụnụ nwere aghọọla ihe nra ripịarala! Ọlaọcha na ọlaedo ụnụ agbaala nchara! Nchara ha gbara gosiri ikpe a mara ụnụ, na nchara ga-agba ụnụ, nke ga-erichasị ahụ ụnụ.
Akụ na ụba ụnụ chekwabara, ga-abụrụ ụnụ ọkụ na- ere pịa pịa n’ụbọchị ikpeazụ. Lee, ụnụ ghọgburu ndị ọrụ gwuru ala n’ubi ụnụ. Geenụ ntị nụrụ akwa ụgwọ ọrụ ha, ụnụ jidere na mmegbu.
Ghọtanụ na iti mkpu nke ndị na-ewere ụnụ ihe n’ubi, erutela na ntị Onyenweanyị nke igwe ndị agha. Ụnụ na-ebi ndụ oriri na nkwari! Nke ahụ ga-eme ka obi na ahụ ụnụ maa abụba maka ụbọchị mgburi.
Ụnụ mara ndị mmadụ ikpe na-amaghị ha, bịakwa gbufuo ha na nkịtị! Ọ bụ ezie na ha adọghị onwe ha mgbe ha guzoro n’ihu ụnụ.
MBEKU – Jọn 17, 17
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ ezi okwu. Were ezi okwu Gị doo anyị asọ.
Aleluya!
OZIỌMA – 9:38-43, 45, 47-48
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Onye na-adịghị emegide anyị bụ onye nke anyị.
Jọn gwara Jesu: “Onye nkuzi, anyị hụrụ onye ji aha Gị na-achụpụ ajọ mmụọ. Anyị gbara mbọ igbochi ya, n’ihi na ọ bụghị onye otu anyị.” Jesu zara ya: “Ụnụ egbochila ya!
O nweghị onye jiri aha M rụọ ọrụ ebube, ga-atụgharị mgbe ahụ na-ekwutọ M. Onye na-adịghị emegide anyị bụ onye nke anyị. N’ịgwa ụnụ eziokwu, onye ọ bụla kunyere ụnụ otu iko mmiri oyi, n’ihi na ụnụ bụ ndị nke M, e nweghị mgbe ọ ga-ahapụ irite ụgwọ ya.”
Ma onye ọ bụla ga-edufu otu n’ime ụmụntakịrị ndị a kwere na M; ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume buru ibu n’olu ya, tụnye ya n’ime osimiri, ebe mmiri ga-eri ya.
Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ kaara gị mma, iburu otu aka banye na ndụ, karịa iburu aka abụọ banye n’ọkụ mmụọ ebighị ebi. Ọ bụrụ na ụkwụ gị emee ka i mehie gbupụ ya.
Ọ kaara gị mma ịda ngwụrọ, ma banye na ndụ; karịa inwe ụkwụ abụọ, ma a tụba gị n’ọkụ ala mmụọ. Ọ bụrụkwa na anya gị ga-ebutere gị ọdịda, ghụpụ ya!
Ọ kaara gị mma iburu anya mpịa banye n’alaeze Chineke, karịa iburu anya abụọ laa n’ọkụ ala mmụọ, ebe idide bụ anwụ anwụ, na ebe a na-adịghị emenyụ ọkụ ahụ emenyụ.”
Igbo Mass Readings for September 30 2024, Ncheta Jerome dị Asọ, Ukọchukwu na Dọktọ
Igbo Mass Readings for September 29 2024, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.