Igbo Mass Readings for September 28 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 28 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1.4-7

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Emọs

Isi Okwu: Ndị na-ebitọgharị ndụ na ndị na-abụgharị abụ na-enweghị isi ka a ga-achụpụ, zilaa mba ọzọ.

Dinwenụ pụrụ ime ihe niile na-asị: Ahụhụ dịịrị ndị ahụ na-ebi ndụ n’ime Zayọn, na ndị ahụ chere na ihe ọjọọ enweghị ike irute ha n’ebe ha nọ n’ugwu Samerịa.

Ụnụ na-edina n’elu akwa dị oke ọnụ ahịa, nke e ji ọdụ mee, na-eri anụ nwa atụrụ dị mma, na anụ ụmụ ehi gbara abụba. Ụnụ na-abụ abụ nke na-abaghị n’ihe mgbe ụnụ na-anụ ụda ụbọ akwara, na-eme onwe ụnụ dị ka ụnụ bụ ndị ọka ịbụ abụ dị ka Devid.

Ụnụ na-añụ ihe ọñụñụ site n’ọba; na ete onwe ụnụ mmanụ makarịsịrị mma, ma ịla n’iyi nke Josef adịghị ewute ụnụ. N’ihi ya, ụnụ aghaghị ịbụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri n’ala ndị ọzọ. Na mberede, oke oriri ụnụ na ndina ala ụnụ ga-agwụsị.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 145:6-10 Az. 2

Azịza: Mkpụrụobi m nye Onyenweanyị otito. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Ọ bụ Dinwenụ na-emezu nkwa O kwere ruo mgbe ebighị ebi;

Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-emegbu emegbu ikpe.

Ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri.

Onyenweanyị na-atọhapụ ndị e ji eji na mkpọrọ. Azịza.

2. Onyenweanyị na-emeghe anya ndị kpuru isi.

Ọ na-ekulikwa ndị ibu ha na-anyịgbu, nyekwara ha aka.

Onyenweanyị hụrụ ndị ezi omume n’anya.

Onyenweanyị na-echebe ndị ọbịa. Azịza.

3. Onyenweanyị na-ekulite nwaogbenye na nwanyị isimkpe,

ma ọ na-eme ka ụzọ ndị ajọ omume gbagọọ agbagọ.

Onyenweanyị ga-achịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Zayọn, Chineke gị ga-esi na ndụdụgandụ chịruo na ndụdụgandụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 6:11-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Timoti

Isi Okwu: Mee ihe niile e tiiri Gị n’iwu ruo mgbe Onyenweanyị Jesu Kristi ga-abịa ọzọ.

Ma n’aka nke i ji bụrụ Onye nke Chineke, chọba ezi omume na ịkwụba aka ọtọ, okwukwe, ịhụnanya, ịkwụdosi ike, na ịdị nwayọọ n’obi. Lụsiwe ọgụ ọma nke okwukwe ike.

Jidesiekwa aka ike na ndụ ebighị ebi, nke bụ uru dị n’oku a kpọrọ gị, mgbe ị nọrọ n’ihu ọha na eze ahụ gbaa akaebe, kwupụta okwukwe gị ahụ dị ọgọ.

N’ihu Chineke, Onye na-enye ihe niile ndụ; na n’ihu Jesu Kristi, Onye gbaara okwukwe anyị ahụ dị ọgọ akaebe n’ihu Pọntiọs Paịlet, ana m agwa gị ka ị kwụba aka gị ọtọ, na-edebe iwu Chineke, n’ebuteghị mmerụ, ka a ghara ịta gị ụta ọ bụla, wee ruo mgbe Onyenweanyị Jesu Kristi ga-apụta ihè.

Ịpụta ihe nke a bụ nke Chineke ga-egosi anyị, mgbe oge ahụ Ọ kara aka ruru. Ya bụ Chineke, bụ Onye ahụ dị ngọzị, Onye ahụ naanị ya na-achị ihe niile, Eze nke ndị eze, Onye nwe ndị nwe mmadụ.

Sọ Ya nwe anwụ anwụ. O bi n’ihè bụ agaru agaru; Onye mmadụ na-ahụbeghị, ma ọ bụ mmadụ na-apụghị ịhụ! Otito na nsọpụrụ na ike ọchịchị ebighị ebi dịrị Ya! Amen!

MBEKU – Luk 19:38

Aleluya, aleluya!

Ngọzi dịrị eze ahụ bịara n’aha Onyenweanyị, udo dịrị ụwa! Ebube dịrị igwe.

Aleluya!

OZIỌMA – 16:19-31

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Chetakwa na n’oge ndụ gị, ị natara ihe ọma, ebe Lazarọs natara ihe ọjọọ.

Jesu gwara ndị Farisii: E nwere otu ọgaranya na-eyi uwe mara mma, na-erikwa nri dị mma ụbọchị niile. Ma e nwekwara otu nwogbenye, ọnya zuru ahụ, a na-akpọ Lazarọs, na-atọgbọchi n’ọnụ-ụzọ esi abanye n’ụlọ ọgaranya ahụ.

Ihe ọ chọrọ bụ ka a tụpụrụ ya ọ bụladị iberibe nri si n’oche nri ọgaranya ahụ dapụ. Nkịta na-abịa, na-aracha ọnya ahụ juru ya n’ahụ. Mgbe nwogbenye ahụ nwụrụ, ndị mmụọma buuru ya, buga n’eze obi Ebreham.

Ọgaranya ahụ bịakwara nwụọ, e lie ya. Ebe ọgaranya ahụ nọ, na-ahụju anya n’ọkụ mmụọ, ka osiri letie anya, hụ Ebreham n’ebe dị anya; bịakwa hụ Lazarọs ka ọ nọ n’eze obi ya.

O tiri mkpu, sị: Nnaa Ebreham! Biko, meere m ebere zite Lazarọs, ka o detụ ọnụnụ mkpịsị aka ya na mmiri, bịa detụ m n’ire, mejụọ ire m! N’ihi na ọkụ nọ ebe a eregbuola m!’

Ma Ebreham zara ya: Nwa m! Chetakwa na mgbe ị dị ndụ n’ụwa, ị bụ onye ụwa ọma, ma Lazarọs bụ onye ụwa ọjọọ! Ma ugbu a, ihe asụgharịala! A na-akasi ya obi, ebe ị nọ na nhụju anya!

Ma ọ gwụbeghị! E nwere nnukwu oke olulu kewara anyị na ụnụ: Mmadụ ọ bụla enewkwaghị ike isite n’ebe a bịa n’ebe ụnụ nọ, ọ dịkwaghị onye nwere ike isite n’ebe ụnụ nọ bịa n’ebe a.’

Ma ọgaranya ahụ sịrị Ebreham: ‘Ebe ọ dị otu a, biko, Nna m, ana m arịọ gị, ka i ziga Lazarọs n’obi nna m. N’ihi na enwere m ụmụnne ise. Biko, ya gaa, dọọ ha aka na ntị, ka ha ghara iso m bata na nhụju anya a.’

Ma Ebreham sịrị ya: ‘Mosisi na ndị amụma nọ ebe ahụ. Ụmụnne gị, ha tọọ ntị n’ala na nkuzi Mosis na nke ndị amụma.’ Ma ọgaranya ahụ zara: ‘Nna m Ebreham, mba nke ahụ agaghị ezu!

A sị na e nwee onye si na’ala mmụọ gaa, gwa ha okwu, ha ga-echegharị.’ Ma Ebreham zara ya: ‘Ọ bụrụ na ha anụghị nke Mosis na ndị amụma kwuru, echeghị m na ha ga-echegharị ma mmadụ site n’ọnwụ bilie bịa gwa ha okwu.

Igbo Mass Readings for September 29 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Isii N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for September 28 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Last Update: July 11, 2023