Igbo Mass Readings for September 28 2026, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for September 28 2026, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

Igbo Mass Readings for September 28 2026, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume - Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for September 28 2026, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:25-28

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Onye Amụma Izikel

Isi Okwu: Ọ bụrụ na onye njọ ewepụ aka na njọ, n’ezie ọ ga-ebi.

Okwu Onyenweanyị ruru m nti sị m: “Ụnụ na-ekwu, ụzọ Onyenweanyị ezighi ezi.” Ụlọ Izrel, biko geenụ ntị: Ọ bụ ụzọ M bụ nke na-ezighi ezi?

Ọ bụ na ọ bụghị ụzọ ụnụ bụ nke na-ezighi ezi? Mgbe onye ezi omume siri n’ezi omume chigharịa, malite ime mmehie, ọnwụ gbuo ya, ọbụ n’ihi ajọ omume o metara ka o jiri nwụọ.

Ma onye ajọ omume si n’ajọ omume chigharịa, malite ime ezi omume, ọ ga-echedo ndụ ya.

N’ihina ọ tụleela n’obi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie  ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps. 24:4-9. Az.6

Azịza: Onyenweanyị, chetanụ ebere Gị

1. Onyenweanyị mee ka m mata ụzọ Gị.

Kụziere m okporo ụzọ Gị.

Duziwe m n’ezi okwu Gị,

na-agbazikwara m. Azịza

2. Onyenweanyị, cheta na obi ebere na obi ọma Gị na-adị sitere na mgbe ochie.

E chetakwala njọ m mere na okorobịa n’adịghị ike m.

Onyenweanyị cheta m n’obi ọma Gị,

n’ihi na Ị dị mma. Azịza.

3. Onyenweanyị dị mma bụrụkwa onye ezi omume.

Otu a ka O si egosi ndị njọ ụzọ.

Ọ na-eduba onye umeala n’ezi omume,

bịakwa na-akuziri ndị umeala ụzọ Ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-11 ma ọ bụ  2:1-5

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Filipịa

Isi Okwu: Echiche ụnụ ga-adị ka nke Kristi.

A sị ụnụ ji ndụ anyị di n’ime Kristi kpọrọ ihe! A sị ịhụnaya nwere ike ịkpalite ụnụ ka ụnụ mee ihe ọ bụla ma ọ bụ Mmụọ Nsọ ahụ anyị nwekọtara ọnụ!

A sị ọ bụ inwe obi ebere ma ọ bụ obi ọma ka ụnụ jiri kpọrọ ihe, jikọtanụ ọnụ n’inwe otu obi na ịnwe ịhụnanya.

Werenụ otu uche gbawa mbọ ịnweta otu ihe ahụ anyị na-achọ. Ihe a bụ sọ otu ihe ga-eme ka m jupụta n’añụrị.

Onye emekwala ka e too nanị ya. Onye aghọkwala aghụghọ. Kama onye ọ bụla ga na-achọ ihe ga-abara ibe ya uru.

Were ya, na nke onye nke ọzọ ka nke gị mkpa; ka a ghara ịnwe onye bụ ụzọ na-achọ nke onwe ya, nke onwe ya.

Kama ka onye ọ bụla chewe maka ọdịmma ndị ọzọ. Uche ụnụ kwesịrị ịdị ka nke Kristi Jesu. Onye dị ezie n’ụdị Chineke.

Ma O kwedosighị aka ike n’ịha n’otu nke Ya na Chineke. Kama, O mere onwe ka onye na-abụghị ihe ọ bụla, O werela ọnọdụ ohu.

Ọ bịa dị ka mmadụ. Ọ bụghị sọ na Ọ bịara dị ka mmadụ, kama O wedara onwe Ya n’ala, wee rubegide isi ruo n’ọnwụ – bụ ọnwụ nke obe.

Ma Chineke buliri Ya oke elu, bịakwa nye Ya aha kacha aha niile; ka o wee bụrụ na a kpọọ aha Jesu, ihe niile ga-egbu ikpere n’ala – ma ihe niile dị n’eluigwe, ma ihe niile dị n’elu ụwa, ma ihe niile dị n’okpuru ụwa.

A kpọọ aha Jesu, ire niile ga-ekwupụtakwa na Jesu Kristi bụ Onyenweanyị, maka otito na ebube nke Chineke Nna.

MBEKU – Jọn 6, 63.68

Alleluịa, Alleluịa:

Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji ozi nke ndụ ebighị ebi.

Alleluịa.

OZIỌMA – Matiu 21:28-32

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’alaeze Chineke.

Jesu jụrụ ndị isi nchụaja na ndị okenye sị: “Gịnị ka ụnụ chere? Otu nwoke nwere ụmụ abụọ.

O jekwuru nke diọkpara sị ya: ‘Nwa m, jee ọrụ n’ubi m taa.’ Ma ọ  zara sị: ‘Agaghị m eje.’ Ma o mesiri chegharịa, jee ọrụ n’ubi nna ya.

Nwoke ahụ jekwukwara nwa ya nke abụọ, ziekwa ya otu ozi ahụ. Nwa ya zara ya: ‘Nna m, aga m emerịrị ya.’

Ma o jeghị. N’ime ụmụ abụọ ndị a, olee nke mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị: “Ọ bụ nke mbụ.”

Jesu wee sị ha: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna ga-ebu ụnụ ụzọ abanye n’Alaeze Chineke.

N’ihina mgbe Jọn Ome Mmirichukwu  jiri ịkwụba aka ọtọ bịakwute ụnụ, ụnụ ekweghị n’ihe o kwuru.

Ma ndị ọnakọ-ụtụ na ụmụnwaanyị akwụna kweere nay a. Ọ bụna mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emesighi chegharịa, kwere na ya.

Igbo Mass Readings for September 29 2026,

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for September 28 2026, Ụka Nke Iri Abụọ na Isii N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ