Igbo Mass Readings for October 22 2023, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 22 2023, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 45:1,4-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Eji M aka nri Saịrọs wee na-emeri mba niile n’agha

Lee ihe Onyenweanyị gwara onye O tere mmanụ, bụ Saịrọs. Eji M aka nri ya n’aka M, were ya na- emeri mba dị iche iche n’ihu ya; na-emekwa ka ndị eze na-agbara ya odibo; bịakwa na-emeghe ibo ọnụ ụzọ n’ihu ya, wee mee ọnụ ụzọ ama ka o ghere oghe.

N’ihi nwodibo M bụ Jekọp na Izrel bụ onye dị M n’obi, akpọọla M gị aha gị, bịakwa tuo gị aha; ma ọ bụ ezie na ị maghị onye M bụ. Abụ M Dinwenụ, ọ dịghịkwa onye ọzọ.

O nweghị Chineke ọzọ ma e wepụ M. Ọ bụ M nyere gị ngwa ọgụ, ma ọ bụ ezie na ị maghị onye M bụ. Abụ m Dinwenụ, ọ dịghịkwa onye ọzọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 95: 1, 3-5, 7-10 Az. 7

Azịza: Nye Onyenweanyị otito na ebube.

1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ.

Ala niile, kweerenụ Onyenweanyị ukwe.

Kọọnụ akụkọ otito Ya n’etiti mba niile.

Kọọnụ akụkọ ọrụ ebube Ya n’etiti mmadụ niile. Azịza.

2. N’ihi na Onyenweanyị ebuka!

O kwesịrị inye Ya nnukwu otito.

Ọ dị egwu karịchaa chi niile.

N’ihi na chi niile nke ndị mba niile dị iche iche bụ ihe efu.

Ma ọ bụ Onyenweanyị mere igwe. Azịza.

3. Ezi na ụlọ ụmụ mba niile,

nyenụ Onyenweanyị otito na ebube.

Nyenụ Onyenweanyị ebube kwesịrị aha ya.

Butenụ onyinye bata n’ogige nsọ Ya. Azịza.

4. Yirinụ uwe nsọ fee Onyenweanyị ofufe.

Ụwa niile mawanụ jijiji n’ihu Ya.

Kwuonụ n’etiti mba niile sị: Onyenweanyị bụ eze.

Ọ kwụbara aka ọtọ na-achị mba niile. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonịka

Isi Okwu: Ugboro ugboro ka anyị na-echeta okwukwe ụnụ, na ịhụnanya ụnụ na nchekwube ụnụ.

Ihe a bụ akwụkwọ ozi nke Pọl, Silvanọs, na Timoti, na-edegara Nzukọ dị na Tesalonịka, nke bụ ndị dị n’ime Chineke Nna, na n’ime Onyenweanyị Jesu Kristi. Amara na udo dịrị ụnụ!

Anyị na-akpọtụ ụnụ aha mgbe niile n’ekpere, na-ekele Chineke maka ụnụ niile. Ugboro ugboro ka anyị nọ n’ihu Chineke Nna, na-echeta otu okwukwe ụnụ si pụta ihe n’ezi ọrụ; nke na ụnụ jiri ịhụnanya rụọ ọrụ, bịakwa nọgidesie ike na nchekwube n’ime Onyenweanyị Jesu Kristi.

Ụmụnna, anyị ma na Chineke hụrụ ụnụ n’anya. Anyị ma na ụnụ bụ ndị a họtara ahọta, n’ihi na, mgbe anyị buteere ụnụ Oziọma ahụ, Oziọma ahụ bịara, ọ bụghị dịka okwu nkịtị; kama, ọ bịakwutere ụnụ ka ike; ọ bịakwutere ụnụ ka Mmụọ Nsọ; ọ bịara bụrụ ihe ụnụ nabatara, were ụnụ anya nke ọma. Ụnụ hụrụ ụdị ndụ anyị biri, mgbe anyị na ụnụ nọ; nke bụ ụdị ndụ e ji kuziri ụnụ ihe.

MBEKU – Jọn 1, 12.14

Aleluya, aleluya!

Okwu Chineke ghọrọ mmadụ wee binyere anyị. O nyere ndị niile nabatara Ya ike ịghọ ụmụ Chineke.

Aleluya!

OZIỌMA – 22:15-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Were nke Siza nye Siza, were nke Chineke nye Chineke

Ndị Farisii pụrụ gbaa izu, otu ha ga-esi nwụde Jesu site n’okwu ọnụ Ya. Ha zigaara Ya ndị na-eso ụzọ ndị Farisii, na ndị otu Herọd ka ha jụọ Ya: “Nna anyị ukwu, anyị maara na Ị bụ onye ezi okwu; na Ị kwụrụ n’ezi okwu na-akuzi ụzọ e si efe Chineke, na Ị naghị asọ mmadụ anya, maka na ọ bụghị ọkwa ukwu e bugoro mmadụ ka ị na-agbakọ.

Ngwa! Gwazienụ anyị ihe I chere. O kwesịrị ekwesị ịtụ ụtụ nye Siza, ka ọ bụ na o kwesịghị?” Jesu maara ihe ọjọọ ha bu n’uche, wee sị ha: “Ndị arụrụala! Gịnị kpatara ụnụ ji esiri M ọnya?

Gosịnụ M ego ahụ ụnụ ji atụ ụtụ ahụ.” Ha nyere Ya otu mkpụrụ ego. O wee jụọ ha: “Isi onye ka e sere n’ego a? Aha onye ka e dere na ya?” Ha sị Ya. “Nke Siza!” O wee sị ha: “Ikpe kpere onwe ya! Were ihe ruuru Siza nye Siza, ma nyekwanụ Chineke ihe niile bụ nke ruuru Chineke.”

Igbo Mass Readings for October 23 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for October 22 2023, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 11, 2023