Igbo Mass Readings for October 19 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 19 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:8-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ọpụpụ

Isi Okwu: Mgbe ọ bụla aka Mosis lara elu, ụmụ Izrel na-emeri

Ndị Amalek bịara buso ụmụ Izrel agha na Refidim. Mosis were gwa Joshua sị: “Họpụtara onwe gị ụmụ okorobịa. N’ụtụtụ echi, gaanụ ka ụnụ na ndị Amalek lụọ agha.

Mgbe a na-alụ agha ahụ, aga m eguzo n’elu ugwu, jide mkpara Chineke n’aka.” Joshua mere ihe Mosis gwara ya, wee lụso ndị Amalek agha. Ma Mosis na Erọn na Hur rịgooro n’elu ugwu.

Mgbe ọ bụla aka Mosis lara elu, ụmụ Izrel na-enwe mmeri; ma mgbe ọ bụla Mosis wedatara aka ya ala, mmeri abụrụ nke ndị Amalek. Ma aka bidoro nyịwa Mosis arọ; N’ihi ya, ha were okwute dowere ya ka ọ nọdụ ala.

Erọn na Hur ewere na-akwalite aka Mosis; otu onye na-akwalite aka nri ya, onye nke ọzọ na-akwalite aka ekpe ya. Ihe a ka aka ya jiri lagide elu ruo mgbe anyanwụ dara. Joshua were mma agha gbuchapụ Amalek na ndị nke ya.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 120:1-8 Az. 2

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.

1. Eleliri m anya n’ugwu: Olee ebe enyemaka m ga-esi abịa?

Enyemaka m ga-esi n’aka Onyenweanyị,

Onye mere eluigwe na ala.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.

2. Ya ekwekwala ka ụkwụ gbachapụ gị.

Ụra atụkwala Onye ahụ na-eche gị.

Mba! Onye ahụ na-eche Izrel mụ anya;

Ọ naghị arahụ ụra.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.

3. Onyenweanyị bụ Onye nche gị,

bụrụkwa ebe nchedo gị. Ọ nọ gị n’aka nri.

Anwụ agaghị emerụ gị ahụ n’ehihie.

Ọnwa agaghị emerụ gị ahụ n’abalị.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.

4. Onyenweanyị ga-echekwaba gị,

ka ajọ ihe ọ bụla ghara irute gị.

Ọ ga-echekwaba ndụ gị.

Onyenweanyị ga-echekwaba ọpụpụ na mbata gị,

bido ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.

Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị, Onye mere eluigwe na ala.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:14 4:2

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Timoti

Isi Okwu: Onye weere onwe ya nye Chineke na-akwụsi ike, bịakwa jikere nke ọma maka ịrụ ọrụ ọma ọ bụla.

Jidesie aka ike n’ihe a kuziri gị, na ihe ahụ were gị anya na ọ bụ eziokwu. Chetakwa ndị kuziiri gị ihe a, na, otu o si bụrụ, na i bidoro na nwata mụta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.

Ọ bụ n’ihe ndị a, ka i si amụta amamihe nke na-eduba na nzọpụta, site n’ikwere na Jesu Kristi. Ihe niile e dere n’Akwụkwọ Nsọ bụ ihe Chineke kwuru.

Ha niile bara uru maka ikuzi nkuzi, maka ịgbaziri onye gahiere ụzọ, maka iduzi ndụ ndị mmadụ na ikuziri ha ịdị nsọ. Ọ bụ otu a ka onye ihe Chineke na-anụ ọkụ n’obi, sị abụ onye e nyere ngwa ọrụ, na onye a kwadoro nke ọma maka ịrụpụta ezi ọrụ.

N’ihu Chineke na n’ihu Kristi Jesu, Onye ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, ana m eche gị ọrụ a n’ihu, n’aha Ịpụta ihe nke alaeze Ya. Na-ekwupụta ozi ahụ, ma a nabatara ya, ma a nabataghị ya, kwụsie ike na ya.

Tụọ mmadụ mmehie ya n’anya. Gbaziere ndị gahiere ụzọ. Gwa ndị mmadụ ka ha na-erube isi. Ma were ndidi mee ihe niile ndị a. Buru n’obi na ọ bụ nkuzi ka ị na-akuzi.

MBEKU – Hib. 4:12

Aleluya, aleluya!

Okwu Chineke bụ okwu dị ndụ, na-adịkwa ire. Ọ na-enyocha echiche na izu niile nke obi.

Aleluya!

OZIỌMA – 18:1-8

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Chineke ga-ekpeziri ndị nke Ya na-akpọku Ya.

Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu, banyere mkpa ọ dị ikpe ekpere ugboro ugboro, n’ekweghị ka obi daa mba: “Otu ọkaikpe bi n’otu obodo, onye na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịkwaghị asọpụrụ mmadụ.

Ma n’otu obodo ahụ kwa, otu nwanyị isimkpe na-abịakwute ya akwụsị akwụsị na-asị ya: “Achọrọ m ka i kpeziere m ikpe, kpepụta m n’aka onye iro m. “Na mbụ ọ jụrụ ajụ ime ihe nwanyị ahụ gwara ya.

Ma mgbe ogologo oge gasịrị, ọ mesịrị sị onwe ya: ‘Ọ bụ ezie na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghịkwa m asọpụrụ mmadụ. Ma nsogbu nwanyị isimkpe a na-enye m akarịala!

Ọ naghị ekwe ka ume na obi ruo m ala. N’ihi ya, aga m ekpeziri ya ikpe, ka m ghara ịnwụchuru ya na nsogbu ya.” Onyenweanyị wee sị: “Ụnụ anụla ihe ọkaikpe arụrụala ahụ kwuru?

Ọ bụ na ụnụ echeghị na Chineke ga-ekpeziri ndị Ọ họtara ahọta ikpe, ndị na-akpọku Ya abalị na ehihie, ma ọ bụrụgodụ mgbe O gburu oge n’ịgbatara ha ọsọ enyemaka?

Nkwa M kwere ụnụ bụ na Ọ ga-ekpeziri ha ikpe n’oge na-adịghị anya. Ma mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, Ọ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?”

Igbo Mass Readings for October 20 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for October 19 2025, Ụka nke Iri Abụọ na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.