Igbo Mass Readings for August 27 2023, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 27 2023, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 22:19-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Aga M atụkwasa mkpịsị igodo nke obi Devid n’ubu gị.

Lee ihe Onyenweanyị Chineke nke igwe ndị agha gwara Shebna, onye ahụ ji oke ọkwa nke ichedo obi eze: “Aga M akwatu gị na nnukwu ọkwa gị, bịakwa site n’ọnọdụ gị dị elu, kpụda gị n’ala. “N’ụbọchị ahụ, aga M akpọta nwodibo M bụ Eliakim nwa Hilkia.

Aga M eyikwasị ya uwe nru ala gị, kekwasịkwa ya ihe ike n’ukwu. Aga m ewere ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya n’aka. Ọ ga-abụ nna ndị niile bi na Jerusalem, na ndị niile bi n’ụlọ Juda.

Aga M ewere igodo na ọtụghe ọnụ ụzọ nke ụlọ Devid tụkwasa ya n’ubu. Ọnụ ụzọ ọ bụla ọ gbaghere, o nweghị onye ọ bụla pụrụ ịgbachi ya. Ọnụ ụzọ ọ bụla ọ gbachiri, nweghị onye ọ bụla pụrụ ịgbaghe ya.

Aga M eme ka ọ ghọọ ntu a kpọgidesiri ike n’ebe siri ike; n’ebe ọ na-aghaghị ekwe nfopụ. Ka ọ ghọọ ebe nwere ugwu n’ezi na ụlọ ya.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 137:1-3, 6, 8 Az. 8

Azịza: Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị èbi. A jụkwala ọrụ aka Gị.

1. Onyenweanyị, aga m eji obi m niile ekele Gị,

N’ihi na Ị nụla okwu si m n’ọnụ.

Aga m ekwe ukwe otito Gị n’ihu ndị mmụọma.

Aga m efe Gị n’ụlọ nsọ Gị. Azịza.

2. Aga m ekele aha Gị, n’ihi obi ọma na eziokwu Gị.

Mgbe m kpọrọ Gị oku, Ị zara m.

Ị gbara m ume. Azịza.

3. Onyenweanyị dị n’ebe kacha elu,

ma Ọ na-ahụ ndị e ji n’ala.

Ọ nọ n’ebe dị anya na-ele ndị nganga.

Onyenweanyị, obi ọma Gị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.

A jụkwala ọrụ aka Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:33-36

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ihe niile siri na Ya pụta. Ọ bụ Ya mere ihe niile. Ihe niile si Ya n’aka.

Akụ na ụba dị n’ime Chineke adịka omimi! Amamihe na mmụta Ya ebuka! Ịchọpụta ihe O bu n’obi, na ịghọta usoro O ji eme ihe akarịka mmadụ! Onye nwere ike ịkọwa ihe Onyenweanyị bu n’obi?

Onye nwere ike ịbụ onye na-adụ Ya ọdụ? Onye nwere ike inye Ya ihe Ọ na-enweghị, ma ọ bụ binye Ya ihe ọ bụla? Ihe niile dị adị si na Ya dịrị. Ọ bụ Ya kere ihe niile maka onwe Ya. Ka otito niile dịrị Ya ebighị ebi, ebighị ebi! Amen.

MBEKU – Jọn 14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, eziokwu na ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.

Aleluya.

OZIỌMA – 16:13-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ị bụ Pita. Aga M enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe.

Mgbe Jesu rutere n’ọnụmara Sizarịa Filipi, Ọ jụrụ Ụmụazụ Ya sị: “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?” Ha zara sị Ya: “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye ome mmirichukwu.

Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Ilaija; ndị ọzọ na-ekwu na ị bu Jeremaya, ma ọ bụ otu n’ime ndị amuụma mgbe ochie.” Ma Jesu jụrụ ha sị: “Ụnụ onwe ụnụ, onye ka ụnụ na-eche na Mụ onwe M bụ?”

Saịmọn Pita zara sị: “Ị bụ Kristi ahụ, Ị bụ Nwa Chineke dị ndụ.” Jesu zara ya sị: “Ngọzi dịrị gị, Saịmọn, nwa Jona! N’ihi na ọ bụghị mmadụ nkịtị kpugheere gị eziokwu nke a, kama ọ bụ Nna M nọ n’eluigwe.

Ugbu a, ana M agwa gị, Ị bụ Pita, N’elu nkume a ka M ga-ewukwasị Nzukọ M. Ọnụ-ụzọ ọkụ mmụọ enweghị ike imeri ya. Aga M achịnye gị mkpịsị-igodo alaeze eluigwe.

Ihe ọ bụla i kechiri n’elu ụwa, a ga-agụnye ya n’ihe e kechiri ekechi n’eluigwe. Ihe ọ bụla i keghapụrụ n’elu ụwa, a ga-agụnye ya n’ihe e keghapụrụ ekeghapụ n’eluigwe.” Mgbe ahụ, Jesu dọrọ Ụmụazụ Ya aka na ntị, dọsiekwa ha ike, ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla na Ya onwe Ya bụ Kristi ahụ.

Igbo Mass Readings for August 28 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for August 27 2023, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.