Connect with us

Igbo Sunday Readings - Cycle B

Igbo Mass Readings for August 25 2024, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for August 25 2024, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 25 2024, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 24:1-2, 15-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Joshua

Isi Okwu: Anyị gà efe Onyenweanyị, n’ihi na-ọbụ Chineke anyị.

Joshua kpọkọtara ọnụmara Izrel niile na Shekem; ha na ndị ndu ha niile, na ndị okenye ha na ndị odozi okwu ha, na ndị isi ha. Ha niile bịara chee onwe ha n’ihu Chineke.

Advertisement

Mgbe ahụ Joshua gwara mmadụ niile ahụ okwu sị ha: Ọ bụrụ na ọ masịghị ụnụ ife Onyenweanyị, kpebierenụ onwe ụnụ taa onye ụnụ ga na-efe ofufe.

Ọ bụ chi niile ahụ nna ụnụ ha fere n’ofe Osimiri, ka Ọ bụ chi ndị Amọraịt ụnụ bi n’ala ha ugbu a? Ma, mụ onwe m na ezinụlọ m, anyị ga-efe Onyenweanyị ofufe.

Ndị Izrel niile zara sị ya, “Anyị agaghị ahapụ Onyenweanyị, anyị agaghị efe chi ọzọ ofufe. N’ihi na Onyenweanyị, bụ Chineke anyị. Ya onwe ya bụ Onye mere ka nna anyị ha si n’ala Ijipt pụta, hapụ ịbụ ohu ọzọ.

Ọ bụ ya mere ihe ịrịba ama ukwu ahụ niile n’anya ndị Izrel, mgbe anyị na-eje ije anyị n’ime ọzara. O chebere anyị site n’aka ndị iro anyị, mgbe anyị sitere n’ala ha gafee. Anyị ahọrọla Onyenweanyị n’ihi na ya onwe ya naanị bụ Chineke anyị.”

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 33:2-3, 16-23 Az. 9

Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.

1. Aga m agọzi Onyenweanyị mgbe niile.

Aga m akpụ otito Ya n’ọnụ m.

Ka mkpụrụobi m tobe Onyenweanyị.

Advertisement

Ndị ume ala ga-anụ olu m wee ñụrịa. Azịza.

2. Anya Onyenweanyị wụkwasara na ndị ezi omume.

O chere ntị n’akwa ha na-ebe.

Onyenweanyị na-ebuso ndị arụrụ ala agha,

Advertisement

iji mee ka a aghara ichetakwa ha ọzọ n’elu ụwa. Azịza.

3. Mgbe ọ bụla ndị ezi omume tikuru Onyenweanyị, Ọ na-anụ olu ha.

Ọ na-egboro ha mmekpa ahụ ha niile.

Onyenweanyị nọ ndị obi gbawara agbawa nso.

Advertisement

Ọ na-azọpụta ndị a gbapịara obi. Azịza.

4. Nsogbu chere onye ezi omume n’ihu akarịka!

Ma Onyenweanyị na-agbapụtacha ya na ha niile.

Ọ na-eche ọkpụkpụ ya niile nche,

Advertisement

ka a ghara inwe otu n’ime ha gbajirinụ. Azịza.

5. Ajọ omume gburu onye omekome.

Ma ndị iro onye ezi omume ga-akwụ ụgwọ mmehie ha.

Onyenweanyị ga-agbapụta ndụ ụmụodibo Ya.

Advertisement

Onye ọ bụla gbatara ọsọ ndụ n’ime Ya anọghị na mmehie. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:21-32

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi Okwu: Eji ihe omimi a atụnyere Kristi na Nzukọ ya.

Werenụ nwayọọ na-enye ibe ụnụ ohere iji sọpụrụ Kristi. Ndị nwunye kwesịrị ịsọpụrụ di ha, otu e si asọpụrụ Onyenweanyị. N’ihi na, otu Kristi si bụrụ isi Nzukọ, nke bụ ahụ Ya niile ahụ Ọ na-azọpụta, ka di bụrụ isi nwunye ya.

Advertisement

Otu Nzukọ si erubere Kristi isi, ka nwanyị a lụrụ alụ, kwesịrị isi rubere di lụrụ ya isi n’ihe niile. Di lụrụ nwanyị kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, dịka Kristi si hụ Nzukọ Ya n’anya; bịakwa hụruo ya n’anya nke iwere ndụ Ya chụọ aja maka ya, iji doo ya asọ.

O mere ya ka ọ dị ọcha, site n’ịsacha ya na mmiri, na ikwu okwu ahụ pụrụ iche; ka o wee bụrụ na mgbe Ọ kpọọrọ ya, ọ ga-adị ebube, n’ebughị ọrụ ma ọbụ mmerụ ma ọ bụ atụtụ ọ bụla: bịakwa dị asọ, ghara ibu mmehie ọ bụla.

N’ụzọ dị otu a, di lụrụ nwanyị kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, otu o si hụ ahụ nke ya n’anya. Mmadụ ịhụ nwunye ya n’anya bụ mmadụ ịhụ onwe ya n’anya.

Mmadụ anaghị akpọ ahụ ya asị; kama ọ na-azụ ya azụ, na-elekwa ya anya, dịka Kristi si elekwa Nzukọ Ya, n’ihi na Nzukọ bụ ahụ Kristi. Anyị onwe anyị bụkwa akụkụ ahụ Ya dị ndụ.

Advertisement

“N’ihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nna na nne, e jikọọ ya na nwanyị; ha abụọ wee ghọọ otu anụ-ahụ”. Ihe dị n’ihe omimi nke a ebuka! Mana ekwuru m na eji m ya atụnyere ihe dị n’agbata Kristi na Nzukọ Ya.

MBEKU – Jọn 15, 15

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Ana M akpọ ụnụ ndị enyi M, n’ihi na-emeela M ka ụnụ matachaa ihe niile Nna gwara M.

Aleluya!

Advertisement

OZIỌMA – 6:60-69

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Onye ka anyị ga-alakwuru? Ọ bụ Gị ji ozi nke ndụ ebighị ebi.

Ọtụtụ ndị na-eso ụzọ Jesu bụ ndị gere ntị na nkuzi ya kwuru sị: “Okwu nke a siri ike ịghọta! Onye kwanụ ga-ewere ya otu ahụ e si kwu ya? Jesu jiri obi mata na ndị na-eso ụzọ Ya nọ na ntamu n’ihi okwu ahụ O kwuru.

O wee sị ha: “Ihe a M kwuru, ọ na-ewute ụnụ? Olee otu ọ ga-adị ụnụ ma a sị na ụnụ ahụ Nwa nke Mmadụ ka Ọ na-arọgo n’ebe Ọ nọbu na mbụ? Ọ bụ mmụọ na-enye ndụ.

Advertisement

Anụ ahụ anaghị enye ihe ọ bụla. Okwu ndị a M gwara ụnụ bụ mmụọ. Ha na-enye ndụ.” Ma ụfọdụ n’ime ụnụ ekweghị.” N’ihi na Jesu sitere na mbụ mata ndị na-ekweghị ekwe, na onye ahụ ga-ere Ya.

Ọ bịakwa sị: “N’ihi nke a ka M ji sị ụnụ: Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ike ịbịakwute M, ma ọ bụrụ na Nna M ejighị aka ya kpọta ya.” Site mgbe ahụ gawa, ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Ya hapụrụ Ya, kwụsị iso Ya.

Jesu wee jụọ Ụmụazụ Ya iri na abụọ sị: “Ụnụ chọkwuru ịla?” Saịmọn Pita wee zaa sị: “Onyenweanyị, onye ka anyị ga-alakwuru? Ọ bụ Gị ji ozi nke ndụ ebighị ebi. Anyị kwere ekwe. Anyị ma na Ị bụ Onye Nsọ nke Chukwu.”

Igbo Mass Readings for August 26 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Advertisement

Igbo Mass Readings for August 25 2024, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.