Connect with us

Igbo Sunday Readings - Cycle C

Igbo Mass Readings for August 24 2025, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for August 24 2025, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 24 2025, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 66:18-21

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya

Isi Okwu: Ha ga-esite na mba niile kpọchighata ụmụ nne ụnụ niile.

Onyenweanyị kwuru nke a: “Ana M abịa ịkpọkọta mba niile dị n’asụsụ niile. Ha ga-abịa wee hụrụ ebube M. Aga M enye ha ihe ịrịba ama, bịakwa si na ndị a zọpụtara n’ime ha zipu ndị ga-aga na mba niile: Na Tarshish, Put, Lud, Moshech, Rọsh, Tubal, na Javan, na mba mmiri ndị dị anya, ndị na-anụbeghị ihe banyere M, na ndị na-ahụbeghị ebube M.

Advertisement

Ha ga-ekwusa otito M na mba niile. Ha ga-esi na mba niile duru ụmụnne ụnụ niile, dịka onyinye ha buteere Onyenweanyị. Ha ga-eduru ha n’elu ịnyịnya, na n’ụgbọ e ji ịnyịnya adọkpụ, n’elu akwa, n’elu nwa ịnyịnya, na n’elu enyi ọzara were dute ha n’ugwu nsọ M bụ Jerusalem; ọ bụ Onyenweanyị kwuru nke a.

Ọ ga-adị ka otu ụmụ Izrel si ejiri efere dị ọcha, buru onyinye ha na-ebutere Onyenweanyị n’ụlọ nsọ Ya.” Onyenweanyị kwuru sị: “Aga m esi n’etiti ha họrọ ndị M ga-enye ụkọchukwu na ndị na-ejere M ozi n’ebe nchụaja M”.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 116:1.2 Az. Mk. 16:15

Azịza: Gaanụ na mba niile, kwusawanụ Oziọma. maọbụ Aleluya.

1. Mba niile, tobenụ Onyenweanyị,

Advertisement

mmadụ niile, jikọtanụ ọnụ nye Ya otito. Azịza.

2. N’ihi na ịhụnanya Ya siri ike n’ebe anyị nọ.

Ịkwụdosi ike nke Onyenweanyị dị ebighị ebi. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:5-7, 11-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ e degaara ndị Hibru

Advertisement

Isi Okwu: Onyenweanyị na-apịa ndị Ọ hụrụ n’anya ụtalị.

Ụnụ echefuola okwu agbamume ahụ e dere, n’ebe Chineke gwara ụnụ okwu dịka ụmụ Ya sị?: “Nwa m, e ledala anya n’ọzụzụ Onyenweanyị na-azụ gị site n’inye gị ahụhụ.

Obi adakwala gị mba mgbe Ọ na-abara gị mba. N’ihi na onye Onyenweanyị hụrụ n’anya ka Ọ na-enye ọzụzụ. Onye ọ bụla Ọ kpọrọ nwa Ya ka Ọ na-apịa ụtalị.” Ahụhụ so n’ihe e ji enye ọzụzụ.

Chineke na-emere ụnụ ihe nna na-emere ụmụ ya. O nwere nwa nna ya hapụrụ ịzụ azụ? Ọ bụ ezie na ọ na-ewute mmadụ n’obi, oge a na-enye ya ahụhụ.

Advertisement

Ọ naghị atọ obi ụtọ, ma ọlị. Ma e mesịa, ọ na-amịta mkpụrụ nke udo na ịdịmma ebe ahụ a kụnyere ya. Ya mere setịpụnụ aka ụnụ ahụ ike gwuru. Guzosienụ ike n’ụkwụ ụnụ ahụ na-ama jijiji. Debe ụkwụ ụnụ n’ụzọ ziri ezi. Ka ndị na-adịghị ike hụ ụnụ. Ọ bụrụ na ha esoro ụnụ ha ga-adị ike.

MBEKU – Jọn 14:6

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, eziokwu na ndụ. O nweghị onye nwere ike ịbịakwute Nna m beere sọ ma o sitere n’aka M”.

Aleluya!

Advertisement

OZIỌMA – 13:22-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ndị mmadụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda ya, bịa were ọnọdụ ha n’oriri nke alaeze Chineke.

Jesu na-agagharị n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche, na-akuzi nkuzi. Oge niile ahụ, Ọ nọkwa n’ụzọ O si aga Jerusalem. Otu onye jụrụ Ya sị: “Nna anyị, ọ bụ sọ mmadụ olemole ka a ga-azọpụta?”

Jesu zara sị: “Gbaanụ mbọ isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye. N’ihi na ana M agbara ụnụ ama, na ọtụtụ mmadụ ga-achọ ka ha banye, ma ha agaghị enwe ike.

Advertisement

Oge na-abịa mgbe Nna nwe ụlọ ga-ebili gbachie ọnụ ụzọ ụlọ Ya. N’oge ahụ, e leghị anya, ụnụ guzoro n’ezi, na-akụ aka n’ọnụ ụzọ na-asị: ‘Nna anyị, megheere anyị ụzọ!’

Ma Ọ ga-aza ụnụ sị: ‘Amaghị M ebe ụnụ si bịa!” N’oge ahụ, ụnụ ga-amalite ịsị, ‘Anyị na Gị rikọrọ, ñụkọọkwa; Ọ bụkwa n’ọnụ ama anyị ka Ị nọrọ kuzie nkuzi’! “Mana ihe Ọ ga-aza ha bụ: ‘N’ezie, amaghị M ebe ụnụ si bịa. Ngwa! Sinu n’ebe M nọ pụọ; ụnụ bụ ndị arụrụ ala!”

Mgbe ahụ a ga-enwe oke ibe akwa na ịta ikikere eze, mgbe ụnụ hụrụ Ebreham, na Aịzik, na Jekọp, na ndị amụma niile, ka ha nọ n’Alaeze Chineke ma ụnụ onwe ụnụ abụrụ ndị a chụpụrụ n’ezi.

Ụmụ mmadụ ga-esikwa n’ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, sikwa n’Ugwu na Ndịda, bịa were ọnọdụ n’oriri nke alaeze Chineke. Ma ụfọdụ ndị ikpeazụ ugbu a ga-abụ ndị bu ụzọ; ụfọdụ ndị bu ụzọ ga-abụ ndị ikpeazụ.”

Advertisement

Igbo Mass Readings for August 25 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ na Otu N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for August 24 2025, Ụka nke Iri Abụọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.