Igbo Mass Readings for August 18 2024, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 18 2024, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Isi Okwu: Bịa rie oriri m kwadoro. Bịa ñụọ mmanya m kụrụ.

Amamihe ewuorola onwe ya ụlọ. Ọ kwụwala ogidi asaa ya. O gbuola anụ o ji akpọ oriri. Ọ kụọla mmanya maka ya. N’ezie, o doziela oche nri n’usoro. O zipụchaala ụmụodibo ya nwanyị.

O si n’elu na-akpọ obodo niile oku sị: “Ka onye ọ bụla ume na obi ruru ala bata n’ebe a.” Asị m onye na-enweghị uche: “Bịa rie oriri m kwadoro. Bịa ñụọ mmanya m kụrụ. Wepụ aka na nzuzu ka i wee dị ndụ. Gaa n’ihu n’okporo ụzọ nghọta.”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 33:2-3, 10-15. Az. 9.

Azịza: Detụ Onyenweanyị ọnụ ka ị hụ na Ọ dị ụtọ.

1. Aga m agọzi Onyenweanyị mgbe niile.

Aga m akpụ otito ya n’ọnụ m.

Ka mkpụrụ obi m tobe Onyenweanyị.

Ndị ume ala ga-anụ olu m wee ñụrịa. Azịza.

2. Ụnụ bụ ndị nke Ya, tụọnụ egwu Onyenweanyị,

N’ihi na o nweghị ihe ọ bụla kọrọ ndị na-asọpụrụ Ya.

Nnukwu mmadụ nwere ike ịda,

ogbenye nọrọ n’agụụ.

Ma o nweghị ihe ọma kọrọ onye na-achọ Onyenweanyị. Azịza.

3. Ụmụ m, bịanụ geere m ntị.

Aga m akuziri ụnụ ịtụ egwu Onyenweanyị.

Olee onye n’ime ụnụ chọrọ ndụ?

Onye ka ọ masịrị ịchịju ihe ọma aka bie ogologo ndụ? Azịza.

4. E kwurukwala ire gị.

E jikwala egbugbere ọnụ gị ekwu okwu aghụghọ.

Gbakete ihe ọjọọ azụ.

Chee ihu n’ihe ọma.

Chọwa udo, na-agba mbọ maka udo. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:15-20

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Efesọs

Isi Okwu: Chọpụtanụ ihe Onyenweanyị chọrọ ka ụnụ mee.

Lezienụ anya nke ọma n’ụdị ndụ ụnụ na-ebi. Biwenụ ka ndị nwere uche! Ụnụ ebile ka ndị na-enweghị uche! Agbụrụ taa bụ ndị arụrụ ala. Ma ndụ ụnụ na-ebi tosịrị ịzọpụta ha.

Ụnụ abụla ndị nzuzu. Kama chọpụtanụ ihe Onyenweanyị chọrọ ka ụnụ mee. Ụnụ abụla ndị añụrụma mmanya. Nke ahụ bụ ịñụfu obi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.

Mgbe ọ bụla ụnụ zukọrọ ọnụ, na-ekwenụ ukwe; na-abụnụ abụọma. Werenụ obi ụnụ niile na-abụrụnụ Onyenweanyị abụ otito; na-ekwerenụ Ya ukwe añụrị; ka o wee bụrụ na ebe niile na n’oge niile, a na-enye Chineke Nna anyị ekele, n’aha Jesu Kristi Onyenweanyị.

MBEKU – 1 Sam 3: 9, Jọn 6:68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwube na nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:51-58

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Anụ ahụ m bụ ihe oriri; ọbara m bụkwa ihe ọñụñụ.

Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Mụ onwe M bụ achịcha dị ndụ nke si n’eluigwe rịdata. Onye ọ bụla riri achịcha nke a ga-adị ndụ ebighị ebi. Achịcha ahụ M ga-enye bụ ahụ M, maka ndụ nke ụwa.”

Mgbe ahụ ka ndị Juu malitere ịrụrịta ụka n’etiti onwe ha na-asị: “Olee otu nwoke a ga-esi enye anyị ahụ Ya ka anyị rie?” Jesu wee sị ha, “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ọ bụrụ na ụnụ erighị anụ ahụ Nwa nke Mmadụ; ọ bụrụkwa na ụnụ añụghị ọbara Ya, ụnụ agaghị enwe ndụ n’ime ụnụ.

Onye ọ bụla riri anụ ahụ M, bịakwa ñụọ ọbara M, nwere ndụ ebighị ebi. Aga M eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na anụ ahụ M bụ ihe oriri n’eziokwu; ọbara M bụkwa ihe ọñụñụ n’eziokwu.

Onye ọ bụla riri anụ ahụ M, ñụọkwa ọbara M, bi ebi n’ime M; M birikwa ‘n’ime ya. “Dịka Mụ onwe M, Onye Nna zitere, si enweta ndụ site na Nna; otu ahụ kwa, ka onye ọ bụla riri M, ga-esi enweta ndụ site na M.

Leenụ achịcha ahụ si n’eluigwe rịdata. Ọ bụghị ụdị achịcha ahụ nna ụnụ ha riri wee nwụsịa. Kama onye riri achịcha nke a ga-adị ndụ ebighị ebi.”

Igbo Mass Readings for August 19 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for August 18 2024, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 8, 2023