Igbo Mass Readings for August 17 2025, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 17 2025, Ụka nke Iri Abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 38:4-6.8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Jeremaya
Isi okwu: Ị mụpụtala m ka m bụrụ onye esemokwu n’ebe mba niile nọ.
Ndị ichie were gwa eze sị ya: “Ka e gbuo nwoke ahụ bụ Jeremaya, n’ihi na ọ na-eme ka obi jụọ ndị agha fọdụrụ n’ime obodo oyi. O sitere n’okwu ya na-eme ka obi jụọ mmadụ niile nọ n’obodo oyi.
Nwoke a anaghị achọ ọdịmma ndị obodo nke a kama ọ bụ mmebi ya. “Eze bụ Zedekaya were zaa sị: “Leenụ ya, ọ nọ n’aka ụnụ. Eze enweghị ike ịnọchibido ụnụ ihe ọ bụla”.
Ha were jiri eriri tụba Jeremaya n’ime ụmị Malkiya, nwa eze Amelek, ụmị nọ n’ogige ụlọ nche. Mmiri anọghị n’ime ụmị ahụ, karịakwa naanị apịtị; Jeremaya, ewere dakpuo n’ime apịtị ahụ.
Ebed-melek were si n’ụlọ eze pụta bịa gwa eze okwu sị ya: “Eze, onye nwe m, ndị a akpaala agwa ọjọọ n’ihe niile ha mere megide onye amụma Jeremaya, site n’ịtụba ya n’ụmị ebe ọ ga-anọ nwụọ n’agụụ: nri ọ bụla adịkwaghị n’obodo ahụ”. Eze were nye Ebed-melek onye Kush iwu sị ya: “Site n’ebe a, kpọrọ iri mmadụ atọ gaa dọpụta onye amụma Jeremaya tupu ọ nwụọ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 39:2-4.18 Az. 14
Azịza: Onyenweanyị, gbata ọsọ bịa nyere m aka.
1. Atụọla m anya, atụọla m anya Onyenweanyị.
O wee hulata n’ebe m nọ, bịa nụrụ olu m. Azịza.
2. O sila n’ụmị ahụhụ na olulu apịtị dọpụta m.
O guzobere m n’elu nkume, bịakwa mee ka nzọ ụkwụ m sie ike. Azịza.
3. O tinyere ukwe ọhụrụ n’ọnụ m, mee ka m bụọrọ Chineke anyị abụ.
Ọtụtụ mmadụ ga-ahụ ya, tụọ ya egwu;
ha ga-enwekwa nchekwube na Dinwenụ. Azịza.
4. Mụ onwe m bụ onye nọ na mkpa, na nwa ogbenye.
Ma Onyenweanyị na-echere m.
Gị bụ enyemaka na nzọpụta m,
Chineke m, a tụfukwala oge. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ e degaara ndị Hibru
Isi Okwu: Anyị ga-eji ndidi nọgidesie ike n’ọsọ anyị na-agba.
Ebe ọ bụ na anyị nwere ọtụtụ ndị akaebe dị otu a gbara anyị gburugburu, ka anyị wepụnụ aka n’ihe ọ bụla nke na-adọghachi anyị azụ; ọ kachasị njọ nke na-achọghị ịhapụ anyị aka.
Ngwanụ, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ nke chere anyị n’ihu. Ka onye ọ bụla ghara ilefuru anya n’ebe Jesu nọ. N’ihi na Ọ bụ Onye Ndu anyị n’okwukwe, bụrụkwa Onye na-eme ka anyị zuo oke.
N’ihi ọñụ nke ahụ e chebere ya n’ihu, O jiri ndidi die ahụhụ nke obe, n’agbanyeghị ihere nke ịnwụ n’elu obe. Site ugbu a gawa, O weere ọnọdụ n’aka nri nke oche eze Chineke.
Tuleenụ n’obi ụnụ otu Jesu si kwụrụ chịm mgbe ndị njọ busoro Ya agha. Ụnụ ga-esi na ya, ghara inwe obi ịda mba, site n’ihi obi esighị ike. N’agha ụnụ na-ebuso njọ, ụnụ alụrụbeghị ọgụ nke ịgbafu ọbara na ịnwụ anwụ.
MBEKU – Jọn 10:27
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Atụrụ M na-anụ olu M. Amaara M ha; ha na-esokwa M.
Aleluya!
OZIỌMA – 12:49-53
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Abịaghị M iweta udo, kama ọ bụ nkewa.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Abịara M ịmụnye ọkụ n’elu ụwa. Olee otu obi ga-adị M ma a sị na ọkụ ahụ ebidolarị rewe gidi gidi! E nwere mmirichukwu a ga-eme M.
Ọnụma juru M obi ebuka! Obi ga-adịgide M arọ wee ruo mgbe ọ gafere. Ụnụ chere na abịara M iweta sọ udo n’ụwa? Ana m asị ụnụ, Mba! Kama ewetara M nkewa.
N’ihi na site n’ugbu a gawa, ezi na ụlọ e nwere mmadụ ise ga-ekewa ekewa; mmadụ atọ ga-ebili megide mmadụ abụọ, mmadụ abụọ ga-ebili megide mmadụ atọ ndị ọzọ. “Nna ga-ebili imegide nwa nwoke.
Nwa nwoke ebilie imegide nna. Nne ga-ebuso nwa ya nwanyị agha. Nwa nwanyị ga-ebuso nne ya agha. Nne di na nwunye nwa ga-anọ n’esemokwu; nwunye nwa na nne di ga-anọ n’esemokwu.”
Igbo Mass Readings for August 16 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Abụọ N’Oge Nkịtị