Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:12-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe

Isi Okwu: Ndị na-achọ amamihe na-achọta ya

Amamihe na-amụkesị amụkesị. Ọ naghị atụnwụ atụnwụ. Ndị niile ọ na-amasị na-ahụ ya n’otu ntabi anya. Ndị niile na-achọ ya na-achọta ya. Amamihe na-eme ka a mata ya, tupu ihe na-agụ mmadụ agụụ n’obi apụta ihè.

Onye ọ bụla sitere n’ụzọ ụtụtụ chọwa amamihe, ìhè anaghị aghọ ya, n’ihi na ọ ga-ahụ ya ebe ọ nọdụrụ ala n’ọnụ ụzọ ama ya. Iche echiche banyere amamihe bụ inwe akọ n’uju ya.

Onye ọ bụla mụ anya abalị n’ihi ya ga-akwụsị ndọkasị ahụ n’oge na-adịghị anya. N’ihi na o ji ụkwụ ya na-agagharị; na-achọ ndị na-achọ ya. Ọ na-eji ihu ọchị na-apụkwute ha n’ụzọ, bịakwa na-ezute ha ebe naanị ha nọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 62:2-8. Az. 2

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka Gị.

1. Biko, Chineke m, Ị bụ Chineke onye m na-achọ.

Agụụ Gị na-ata m ahụ.

Akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka Gị,

dịka ala kpọrọ nkụ,

nwụrụ anwụ na-enweghị mmiri ọ bụla. Azịza.

2. Otu a ka anya m siri tọ n’ebe Ị nọ n’ụlọ nsọ Gị,

ka m were hụ ike na ebube Gị.

N’ihi na obi ọma Gị dị ọgọ karịa ndụ n’onwe ya.

Egbugbere ọnụ m ga na-aja Gị mma. Azịza.

3. Otu a ka m ga-esi na-eto Gị na ndụ m niile.

Aga m achịliri Gị aka elu wee na-akpọku aha Gị.

Mmụọ m ga-enwe afọ ojuju ka onye a kpọrọ nnukwu oriri.

Egbugbere ọnụ m ga-eji iti mkpu ọñụ were too Gị. Azịza.

4. Aga m echeta Gị n’elu akwa m,

bịakwa tụgharịa uche na Gị n’oge nche abalị.

Ị bụ enyemaka m.

Ọ bụkwa n’okpuru nku Gị ka m na-eti mkpu ọñụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:13-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ Pọl degaara ndị Tesalonịka

Isi Okwu: Chineke ga-akpọlite ndị niile nwụrụ n’ime Kristi

Ụmụnna m, anyị chọrọ ka ụnụ mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara n’ụra ọnwụ. Mgbe ụnụ maara nke a ụnụ agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ ụnụ adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ n’etiti ụnụ.

N’ihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jesu nwụrụ ma sitekwa n’ọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jesu ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kristi niile nwụrụ anwụ soro Jesu lọghachi na ndụ.

N’ihi na, ihe m na-agwa ụnụ ugbu a si n’ọnụ Onyenweanyị n’onwe ya. Anyị bụ ndị dị ndụ mgbe Onyenweanyị ga-alọta, agaghị eburu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ bilite.

N’ihi na Onyenweanyị n’onwe ya ga-esi n’eluigwe rịdata. Mgbe Ọ na-arịdata Ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, Ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke.

Mgbe ahụ ndị Kristi niile dara n’ụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si n’ọnwụ bilite. Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ n’ụwa, ka a ga-eweli elu n’ime igwe ojii, ịga izute Onyenweanyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-akasirịta ibe ụnụ obi mgbe niile.

MBEKU – Matiu. 24: 42. 44

Aleluya, aleluya!

Na-echenụ nche. Dịkwanụ nkwadebe n’ihi na ụnụ amaghị mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa.

Aleluya!

OZIỌMA – 25:1-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Nwoke na-agba akwụkwọ abịala. Gaanụ zute ya.

Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu sị: “Lee ihe a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe: Ụmụagbọghọ iri buuru iheọkụ ha, gawa izute nwoke na-agba akwụkwọ. Ise n’ime ha bụ ndị nzuzu, ise bụkwa ndị nwere uche.

Ndị nzuzu ahụ buuru iheọkụ ha, ma ha eburughị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha. Ma ndị ahụ nwere uche buuru iheọkụ ha, burukwa mmanụ na karama mmanụ ọkụ ọzọ.

Mgbe nwoke na-agba akwụkwọ nọrọ ogologo oge n’abịaghị, ha niile robere ụra dinara ala rahụ ụra. Ma n’etiti abalị, a nụrụ olu tiri mkpu sị: Nwoke na-agba akwụkwọ abịawala! Ngwanụ! Gawanụ zute ya!”

Mgbe ahụ ka ụmụagbọghọ niile ahụ jiri teta, bịakwa dozie iheọkụ ha. Ma ndị nzuzu gwara ndị nwere uche sị: Biko, wụnyetụrụnụ anyị mmanụ ụnụ, n’ihi na iheọkụ anyị na-anyụ anyụ.

Ma ndị nwere uche zara sị: Mba! Eleghị anya mmanụ anyị ji, agaghị ezuru anyị na ụnụ. Ihe ka mma bụ: jekwurunụ ndị na-ere ya, zụrụnụ nke ụnụ. Ma mgbe ha jere ịzụta mmanụ, ka nwoke na-agba akwụkwọ ji bịaruo.

Ndị kwadoro akwado sooro ya banye n’ime ụlọ, ebe a na-akpọ oriri agbamakwụkwọ. E wee mechie ụzọ. “Ụmụagbọghọ ndị ọzọ ahụ mesịrị bịaruo, na-asị: ‘Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Megheere anyị ụzọ!” Ma ọ zara ha sị: ‘N’ịgwa ụnụ ezi okwu, amaghị m ndị ụnụ bụ!” Ya mere, mụrụnụ anya n’ihi na ụnụ amaghị ụbọchị ma ọ bụ mgbe oge ahụ ga-abụ.

Igbo Mass Readings for November 13 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 11, 2023