Igbo Mass Readings for November 10 2024, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 10 2024, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 17:10-16

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Ndị Eze

Isi Okwu: Nwanyị ahụ metere nwa nri wetara ya Ilaija

Onye amụma Ilaija biliri gawa Zarefat. Mgbe o rutere n’ọnụ ụzọ ama obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị isimkpe na-atụtụkọta nkụ. Ilaija wee kpọtụrụ ya sị: Biko were iko kutere m nwantịntị mmiri ọñụñụ.

Mgbe nwanyị ahụ gawara ikute mmiri, ọ kpọkwara oku ọzọ sị ya: “Biko, chịtara m ụfọdụ ibiri be achịcha n’aka gị ka m taa.” Ma nwanyị ahụ zara ya, sị: “N’aha Onyenweanyị Chineke dị ndụ, enweghị m nri ọ bụla a dara n’ọkụ.

Sọ otu njụ aka nri ọka fọọrọ m n’okpokoro, ya na nwa mmanụ ntakịrị fọrọ n’ala ite. Ihe m na-akpakọta ugbu a bụ nwa nkụ ntakịrị m ga-eji esi ihe mụ na nwa m nwoke ga-eri.

Nri nke bụ e richaa, e chere ọnwụ.” Ma Ilaija sịrị ya: “Ụjọ atụla gị. Gaa mee ihe ahụ i kwuru. Ma buru ụzọ ghee achịcha wetara m. E mechaa, i nwere ike gaa kwadoo nri nke gị na nwa gị ga-eri.

N’ihi na Onyenweanyị Chineke nke Izrel kwuru sị: “Okpokoro nri ọka agaghị atọgbọrọ chakoo, mmanụ agaghị akọ n’ite wee ruo n’ụbọchị Onyenweanyị ga- ezite mmiri n’elu ụwa.”

Nwanyị ahụ mere ihe dịka Ilaija gwara ya. Nwanyị ahụ na nwa ya nwoke na Ilaija riri nri ahụ. Okpokoro atọgbọrọghị chakoo; mmanụ akọghị n’ite mmanụ, dịka Onyenweanyị siri n’olu Ilaija kwuo.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 145:7-10. Az. 2

Azịza: Mkpụrụ obi m, too Onyenweanyị. Ma ọ bụ Aleluya.

1. Onyenweanyị na-emezu nkwa O kwere ruo mgbe ebighị ebi.

Ọ na-ekpeziri ndị a na-emegbu emegbu ikpe.

Ọ bụ Ya na-enye ndị agụụ na-agụ nri,

bịakwa na-atọhapụ ndị e ji n’ụlọ mkpọrọ. Azịza.

2. Onyenweanyị na-eme ka ndị kpuru isi hụwa ụzọ.

Onyenweanyị na-ekulite ndị e ji n’ala.

Onyenweanyị hụrụ ndị ezi omume n’anya.

Onyenweanyị na-echekwaba ndị ọbịa. Azịza

3. Onyenweanyị na-elekọta nwa enweghị nne na nna na nwanyị isimkpe.

Ọ bụ Ya na-ahịgharị ụzọ ndị arụrụala.

Onyenweanyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.

Zayọn, Chineke gị ga-achị ruo na ndụdụgandụ nịle, aleluya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 9:24-28

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi E degaara Ndị Hibru

Isi Okwu: Kristi jiri onwe ya chụọ otu aja iji buru njọ ọtụtụ mmadụ n’isi ya

Kristi abanyeghị n’Ebe Nsọ nke e jiri aka mee; nke bụ ihe e mere n’oyiyi ebe ahụ bụ Ebe Nsọ n’ezie. Kama, Ebe Nsọ nke Ọ banyere bụ eluigwe n’onwe ya, ka O wee na-eche onwe Ya n’ihu Chineke, maka ọdịmma nke anyị.

Ọ dịghị mkpa na Ọ ga-eji onwe Ya chụọ aja ugboro ugboro, otu onye isi nchụaja si ewere ọbara na-abụghị nke ya, na-abanye n’ebe nsọ kwa afọ, kwa afọ. A sị na ọ dị otu ahụ, ọ pụtara na Kristi nọ n’ịta ahụhụ, n’ịta ahụhụ, kemgbe ụwa bidoro.

Ma nke bụ ezi okwu bụ na Ọ pụtara ihè otu mpụta, ugbu a bụ ngwụcha nke oge ikpeazụ, ka O wee melaa njọ kpam kpam, site n’iji onwe Ya chụọ aja.

Ebe ọ bụ na mmadụ na-anwụ sọ otu ugboro; nke ahụ gaa, ọ bụrụ ikpe; n’otu aka ahụ kwa, Kristi jiri onwe Ya chụọ otu aja, iji buru njọ ọtụtụ mmadụ n’isi Ya. Mgbe ọ ga-abịa nke ugboro abụọ, ọ bụghịkwa ịbịa maka njọ. Kama, Ọ bụ maka iji nzọpụta kwụọ ndị na-eche Ya ụgwọ.

MBEKU – Eph. 1, 17-18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị meghee obi anyị, ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 12:38-44 maọbụ 12:41-44

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Nwanyị isimkpe a tinyere karịa ndị ọzọ.

Mgbe Jesu na-akụzi nkuzi, Ọ gwara ndị mmadụ sị: “Kpacharanụ anya maka ndị Ode-Akwụkwọ, ndị ọ na-atọ ụtọ iyiri uwe buru ibu na-akpagharị; a na-egbuchapụrụ ha n’ọma ahịa n’ụzọ pụrụ iche; ndị na-ewere ihu oche ebe a na-ekpe ekpere, na-anọ n’isi oche ebe a na-akpọ oriri.

Ọ bụ ha na-erikpọ ego ụmụnwanyị isimkpe, bịakwa were ogologo ekpere na-eme ka e too ha. Amamikpe chere ha ga-akarị nke ndị ọzọ. Ọ nọdụrụ chee ihu n’igbe-akụ, wee na-ele ndị na-etinye ego n’igbe-akụ.

Ọtụtụ ndị ọgaranya tinyere ego buru ibu. Ma otu nwanyị isimkpe dara ogbenye, tinyere mkpụrụ ego ntakịrị abụọ na-akarighị otu kọbọ. Jesu kpọrọ Ụmụazụ Ya, sị ha: “N’ịgwa ụnụ eziokwu, ihe nwanyị isimkpe a dara ogbenye tinyere, karịrị nke onye ọ bụla tinyere n’igbe akụ a.

N’ihi na ndị ọzọ a niile manyere aka n’ụba ha, tinye ihe mara ụma n’akụ na ụba ha. Ma nwanyị a manyere aka n’ụbịam ya, tinye naanị ihe o nwere, o jiri chere onwe ya.”

Igbo Mass Readings for November 11 2024, Ncheta Martin nke Tours dị Asọ, Bishọp

Igbo Mass Readings for November 10 2024, Ụka nke Iri Atọ na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 11, 2023