Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka Nke Iri Atọ na abụọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka Nke Iri Atọ na abụọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ.

Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka Nke Iri Atọ na abụọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume - Afọ nke Mbụ
Igbo Mass Readings for November 12 2023, Ụka Nke Iri Atọ na abụọ N’oge Na-Adanyeghi N’emume – Afọ nke Mbụ

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:12-16

Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe.

Isi Okwu: Ndị na-achọ amamihe na-achọta ya.

Amamihe na-amụkesị amụkesị. Ọ naghị atụnwụ atụnwụ. Ndị niile ọ na-amasị na-ahụ ya n’otu ntabi anya. Ndị niila na-achọ ya na-achọta ya.

Amamihe na-eme ka a mata ya, tupu ihe na-agụ mmadụ agụụ n’obi apụta ihe. Onye ọ bụla sitere n’ụzọ ụtụtụ chọwa amamihe, ihe anaghị aghọ ya, n’ihi na ọ ga-ahụ ya ebe ọ nọdụrụ ala n’ọnụ ụzọ ama ya.

Iche echiche banyere amamihe bụ inwe akọ n’uju ya. Onye ọ bụla mụ anya abalị n’ihi ya ga-akwụsị ndọkasị ahụ n’oge na-adịghị anya.

N’ihi na o ji ụkwụ ya na-agagharị; na-achọ ndị na-achọ ya. Ọ na-eji ihu ọchị na-apụkwute ha n’ụzọ, bịakwa na-ezute ha ebe nnanị ha nọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps. 62:2-8. Az. 2

Azịza: Onyenwe m na Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị.

1. Biko, Chineke m,

Ị bụ Chineke onye m na-achọ.

Agụụ Gị na-ata m ahụ.

Akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ maka Gị,

dịka ala kpọrọ nkụ,

nwụrụ anwụ na-enweghị mmiri ọ bụla. Azịza.

2. Otu a ka anya m siri tọ n’ebe Ị nọ n’ụlọ nsọ Gị dị ọgọ karịa ndụ n’onwe ya.

Egbugbere ọnụ m ga na-aja Gị mma. Azịza.

3. Otu a ka m ga-esi na-eto Gị na ndụ m niile.

Aga m achiliri Gị aka elu wee na-akpọku aha Gị.

Mmụọ m ga-enwe afọ ojuju ka onye a kpọrọ nnukwu oriri.

Egbugbere ọnụ m ga-eji iti mkpu ọñụ were too Gị. Azịza.

4. Aga m echeta Gị n’elu akwa m,

bịakwa tụgharịa uche na Gị n’oge nche abalị.

Ị bụ enyemaka m.

Ọ bụkwa n’okpuru nku Gị ka m na-eti mkpu ọñụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:13-18

Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonika

Isi Okwu: Chineke ag-akpọlite ndị niile nwụrụ n’ime Kristi.

Ụmụnna m, anyị chọrọ ka ụnụ mata ihe banyere ndị otu anyị ndị dara n’ụra ọnwụ. Mgbe ụnụ maara nke a ụnụ agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ ụnụ adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ n’etiti ụnụ.

N’ihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jesu nwụrụ ma sitekwa n’ọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jesu ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kristi niile nwụrụ anwụ sor Jesu lọghachi na ndụ.

N’ihi na, ihe m na-agwa ụnụ ugbu a si n’ọnụ Onyenweanyị n’onwe ya. Anyị bụ ndị dị ndụ mgbe Onyenweanyị ga-alọta, agaghị eburu ndị dara n’ụra ọnwụ ụzọ bilite.

N’ihi na Onyenwenayị n’onwe ya ga-esi n’eluigwe rịdata. Mgbe Ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, Ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu.

Ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kristi niile dara n’ụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si n’ọnwụ bilite.

Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ n’ụwa, ka a ga-eweli elu n’ime igwe ojii, ịga izute Onyenweanyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-akasịrịta ibe ụnụ obi mgbe niile.

MBEKU – Matiu 24:42. 44

Alleluịa, Alleluịa:

Na-echenụ nche. Dịkwanụ nkwadebe n’ihi na ụnụ amaghị mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa.

Alleluịa.

OZIỌMA – Matiu 25:1-13

Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Nwoke na-agba akwụkwọ abịala, Gaanụ zute ya.

Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu sị: “Lee ihe a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe: Ụmụagbọghọ iri buuru iheọkụ ha, gawa izute nwoke na-agba akwụkwọ.

Ise n’ime ha bụ ndị nzuzu; ise bụkwa ndị nwere uche. Ndị nzuzu ahụ buuru iheọkụ ha, ma ha eburughị mmanụ ọkụ ga-ezuru ha.

Ma ndị ahụ nwere uche buuru iheọkụ ha, burukwa mmanụ na karama mmanụ ọkụ ọzọ.

Mgbe nwoke na-agba akwụkwọ nọrọ ogologo oge n’abịaghị, ha niile robere ụra dinara ala rahụ ụra.

Ma n’etiti abalị, a nụrụ olu tiri mkpu sị: ‘Nwoke na-agba akwụkwọ abịakwala! Ngwanụ! Gawanụ zute ya!’

Mgbe ahụ ka ụmụagbọghọ niile ahụ jiri teta, bịakwa dozie iheọkụ ha. Ma ndị nzuzu gwara ndị nwere uche sị: ‘Biko, wụnyetụrụ anyị mmanụ ụnụ, n’ihi na iheọkụ anyị na-anyụ anyụ.’

Ma ndị nwere uche zara sị: ‘Mba! Eleghị anya, mmanụ anyị ji agaghị ezuru anyị na ụnụ. Ihe ka mma bụ: jekwurunụ ndị na-ere ya, zụrụnụ nke ụnụ.’

Ma mgbe ha jere ịzụta mmanụ, ka nwoke na-agba akwụkwọ ji bịaruo. Ndị kwadoro akwado sooro ya banye n’ime ụlọ, ebe a na-akpọ oriri agbamakwụkwọ. E wee mechie ụzọ.

“Ụmụagbọghọ ndị ọzọ ahụ mesiri bịaruo, na-asị: ‘Nna anyị ukwu! Nna anyị ukwu! Megheere anyị ụzọ!’ Ma ọ zara ha sị: ‘N’ịgwa ụnụ eziokwu, amaghị m ndị ụnụ bụ!’

Ya mere, mụrụnụ anya n’ihi na ụnụ n’ihi na ụnụ amaghị ụbọchị ma ọ bụ mgbe oge ahụ ga-abụ.

Igbo Mass Readings for November 13 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Nkịtị