Igbo Mass Readings for November 26 2023, Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume) – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 26 2023, Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume) – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 34:11-12, 15-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Izikel
Isi Okwu: A bịa na nke ụnụ bụ ụmụ atụrụ m, aga m ekpeziri atụrụ na ibe ya.
Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru: “Mụ onwe M ga-elekọta igwe atụrụ M, bịakwa zụọ ha, otu onye nche atụrụ si akpọkọta igwe atụrụ ya gbasara agbasa.
Aga m agbapụta ha n’ebe niile ha gbasara, mgbe igwe ojii na ọchịchịrị gbachitechara ebe niile. Aga M eji aka M wee zụọ ụmụ atụrụ M. Aga M eme ka ha makpuru zuo ike.
Ọ bụ Onyenweanyị Chineke na-ekwu ihe ndị a. Aga M achọpụta ndị furu efu; bịakwa kpọghachite ndị gbafuru agbafu. Aga M ekechi ọnya ndị nke ihe merụrụ ahụ; bịakwa gwọọ ndị nke na-arịa ọriịa.
Aga M eduzi ha nke ọma. “Ma Onyenweanyị Chineke kwuru sị: A bịa na nke ụnụ bụ ụmụ atụrụ na ewu M, aga M ekpeziri otu atụrụ na ibe ya, bịakwa kpeziere ebulu na mkpị.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 22:1-3,5-6 Az. 1
Azịza: Dinwenụ bụ onye nche m. O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
1. Dinwenụ bụ onye nche m.
O nwekwaghị ihe m ga-achọ.
Ọ na-eduga m n’ebe ahịhịa ndụ juru eju ka m zuru ike. Azịza.
2. Ọ na-eduga m n’akụkụ mmiri doro edo.
Ọ bụ Ya na-agba m ume.
Ọ na-edu m n’ụzọ ziri ezi n’ihi aha Ya. Azịza
3. I ji aka gị kwadoro m nri m ga-eri n’ihu ndị iro m.
I ji aka Gị tee m mmanụ n’isi.
Iko m ejula n’ọnụ. Αzịza.
4. Ịhụnanya na obi ọma ga na-eso m ụbọchị ndụ m niile.
A ga m ebi n’ụlọ nke Chineke,
biri na ya ebighị ebi, ebighị ebi. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:20-26, 28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt
Isi Okwu: A ga-enyefe Chineke Nna alaeze ahụ n’aka, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ihe niile.
E meela ka Kristi si na ndị nwụrụ anwụ bilie, bịakwa bụrụ onye mbụ siri n’ọnwụ bilie. N’ihi na ebe ọnwụ sitere n’aka mmadụ mbụ ahụ bụ Adam, mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sitekwara n’aka mmadụ nke abụọ ahụ bụ Kristi.
N’ihi na dịka mmadụ niile siri nwụọ n’ime Adam, otu ahụ kwa ka mmadụ niile siri bilite n’ọnwụ n’ime Kristi, ma onye ọ bụla ga-aga n’usoro nke ya. Kristi bụ mkpụrụ mbụ nke ndị si n’ọnwụ bilie.
Mgbe Ọ bịasịrị, ndị nke Ya niile ga-esota Ya. E mesịa nke a, e nwee ngwụcha ụwa, mgbe Kristi ga-ewere alaeze ahụ nyefee n’aka Chineke Nna. Mgbe ahụ, e meriela ike ọchịchị niile, na ịkpa ike niile, na ike niile e jiri bụrụ eze n’ụwa niile.
N’ihi na Kristi ga- abụgide eze ruo mgbe e merisịrị ndị iro Ya niile, bịakwa were ndị iro Ya niile meere Ya ihe O ji agbakwasa ụkwụ. Onye iro Ya ikpeazụ a ga-ala n’iyii bụ ọnwụ.
Mgbe ihe niile bịara nọrọchaa n’okpuru ụkwụ Chukwu Nwa, Chukwu Nwa ga-abịa were onwe Ya tinye n’okpuru Chukwu Nna, ka Chineke wee bụrụ ihe niile n’ihe niile.
MBEKU – Mak 11:10
Aleluya, aleluya!
Ngọzi dịrị Onye ritere alaeze nna anyị Devid n’ekpe. Ngọzi dịrị onye bịara n’aha Onyenweanyị.
Aleluya!
OZIỌMA – 25:31-46
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ọ ga-ewere ọnọdụ n’oche eze nke ebube. Ọ ga-ekewa mmadụ na mmadụ.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi Ya, Ọ ga-anọkwasiị n’oche nke ebube Ya. A ga-eme ka mba niile zukọọ n’ihu Ya.
Ọ ga-ekewa ndị mmadụ ụzọ abụọ, otu onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta atụrụ iche n’etiti ewu. Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri Ya, debekwa ewu n’aka ekpe ya.
Mgbe ahụ, eze ga-asị ndị nọ n’aka nri Ya: “Bịanụ ndị nwere ngọzi nke Nna M. Bịanụ keta alaeze ahụ a kwadebeere ụnụ site na ntọala ụwa. “N’ihi na mgbe agụụ gụrụ M, ụnụ nyere M nri M rie.
Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ, ụnụ nyere M mmiri ka M ñụọ. Abụ M ọbịa, ụnụ wee kpọbata M. Agba M ọtọ, ụnụ wee yibe M uwe. Mgbe M na-arịa ọrịa na mgbe M nọ na mkpọrọ, ụnụ bịara leta M.”
“Mgbe ahụ, ndị ezi omume ga-aza Ya, sị: “Onyenweanyị, olee mgbe anyị hụrụ ka agụụ na-agụ Gị, wee nye Gị nri, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, wee nye Gị mmiri?
Olee mgbe anyị hụrụ ka ị bụ onye ọbịa, wee kpọbata Gị, ma ọ bụ ka Ị gba ọtọ wee yibe Gị uwe? Olee mgbe anyị hụrụ ka Ị na-arịa ọrịa ma ọ bụ ka Ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, wee bịa leta Gị?”
Eze ahụ ga-aza ha, sị: “N’ezie, agwa M ụnụ: Mgbe ọ bụla ụnụ meere ya otu n’ime ndị a dịkarịsịrị nta n’etiti ụmụnna M, ọ bụ M ka ụnụ meere ya!” Mgbe ahụ, Ọ ga-asị ndị nọ n’aka ekpe Ya: “Pụọnụ n’ihu M!
Ndị a a bụrụ ọnụ! Gaanụ n’ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadebeere ekwensu na ndị na-ejere ya ozi! N’ihi na agụụ gụrụ M, ma ụnụ enyeghị M nri rie. Akpịrị kpọrọ M nkụ, ma ụnụ enyeghị M mmiri ñụọ.
Abụ M ọbịa, ma ụnụ anabataghị M n’ụlọ. Agba M ọtọ, ma ụnụ enyeghị M uwe. Mgbe M rịara ọrịa na mgbe M nọ n’ụlọ mkpọrọ, ụnụ eletaghị M.” Mgbe ahụ, ha ga-aza Ya, sị: “Onyenweanyị, olee mgbe anyị hụrụ na agụụ na-agụ Gị, ma ọ bụ akpịrị na-akpọ Gị nkụ, ma ọ bụ na Ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ na Ị gba ọtọ, ma ọ bụ na Ị na-arịa ọrịa, ma ọ bụ na Ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma anyị ejereghị Gị ozi?”
Eze ga-aza ha sị: “N’ezie, mgbe ahụ ụnụ na-emereghị ya otu n’ime ndị dịkarịsịrị nta n’etiti ụmụnne m ndị a, ụnụ emereghị M ya.” Ndị a ga-apụ, jee, banye n’ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.
Igbo Mass Readings for November 27 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Nkịtị