Igbo Mass Readings for November 24 2024, Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume) – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 24 2024, Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume) – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:13-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye amụma Daniel

Isi Okwu: Ọ natara ike ọchịchị na ebube na-alaeze

Ka m nọkwa na-ahụ ọhụ n’abalị, ahụrụ m onye dị ka Nwa nke Mmadụ ka O si n’urukpu nke igwe na-abịa. Mgbe O rutere na nke Onye Ahụ na-adị site na mbụ, e mere ka O guzoro n’ihu Ya.

Onye ahụ dị ka Nwa nke Mmadụ, natara ike ọchịchị na ebube na alaeze. Obodo dị iche iche na agbụrụ dị iche iche na-asụ asụsụ niile wee na-efe Ya. Ọchịchị Ya bụ ọchịchị dị ebighị ebi, nke a na-enweghị ike ịnapụ Ya. Alaeze Ya bụ nke na-agaghị emebi emebi.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 92:1-2.5 Az. 1

Azịza: Dinwenụ bụ eze. O yi ebube eze ka uwe.

1. Dinwenụ bụ eze. O yi ebube eze ka uwe.

Dinwenụ jiri ike kee onwe Ya n’ukwu. Azịza.

2. O meela ka ụwa kwụrụ chịm,

ghara ịnọgharị n’ọnọdụ ya.

Onyenweanyị, oche eze Gị sitere na mgbe ochie guzosie ike.

Ị na-adịkwa adị tupuu oge ọ bụla ebido. Azịza.

3. N’ezie, atụmatụ Gị kwesịrị ntụkwasị obi.

Ịdị nsọ kwesịrị ụlọ Gị.

Onyenweanyị, otu a ka ọ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:5-8

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe

Isi okwu: Eze na-achị ndị eze niile nọ n’ụwa, mee k’anyị bụrụ ndị ga na-efe Chineke.

Jesu Kristi bụ Onye akaebe kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye mbụ e siri na ndị nwụrụ anwụ wee mụọ, na Eze na-achị ndị eze niile nọ n’ụwa. Ọ bụ Onye ahụ hụrụ anyị n’anya, nke na O jiri ọbara Ya gbapụta anyị na njọ.

O wee mee ka anyị bụrụ alaeze nke jupụtara na ndị nchụaja, ndị ga na-efe Chineke nke Ya na Nna nke Ya. Ka ebube niile, na ike niile dịịrị Ya, ebighị ebi ebighị ebi! Amen.

Ọ bụ Onye ahụ na-abịa n’igwe ojii. Mmadụ niile ga-ahụ Ya. Ndị ahụ mara Ya ube ga-esokwa hụ Ya. Ebo niile dị n’ụwa ga-erukwara Ya ụjụ. Ọ bụ ka o siri mee! Amen. Onyenweanyị Chineke kwuru sị: “Abụ M Isi Mbido na Isi Ngwụcha. Onye ji ike niile ahụ dị ugbu a, Nke ahụ dịbu adị, na Nke ahụ na-abịanụ.”

MBEKU – Mak. 11:9.10

Aleluya, aleluya!

Ngọzi dịrị Onye ritere alaeze nna anyị Devid n’ekpe. Ngọzi dịrị onye bịara n’aha Onyenweanyị.

Aleluya!

OZIỌMA – 18:33-37

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Gị onwe gị ekwuola na m bụ eze

Paịlet jụrụ Jesu: “Ị bụ eze ndị Juu?” Jesu zara ya: “Ị na-ekwu nke a n’onwe gị, ka ọ bụ na ndị ọzọ gwara gị okwu banyere M?” Paịlet wee zaghachi: “Abụ m onye Juu?

Ọ bụ ndị ala gị na ndị isi nchụaja kpụụrụ Gị nyefee m n’aka. Gịnị ka I mere?” Jesu zara sị: “Alaeze M abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze M bụ nke ụwa a ndị M na-achị gaara-alụ ọgụ, ka a ghara inyefe M n’aka ndị Juu.

Ma otu ọ dị, alaeze M abụghị ụdị nke a.” Mgbe ahụ, Paịlet jụkwara Ya sị: “Ọ pụtaranụ na Ị bụ eze?” Jesu zara, sị: “Gị onwe gị ekwuola na M bụ eze. Ihe e ji mụọ M, na ihe M ji bịa n’ụwa bụ ka M gbaara eziokwu ahụ akaebe. Onye ọ bụla guzoro n’eziokwu na-anụ olu M.”

Igbo Mass Readings for November 25 2024, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for November 24 2024, Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume) – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 11, 2023