Igbo Mass Readings for November 19 2023, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 19 2023, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:10-13, 19-20, 30-31

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ilu

Isi Okwu: Ezigbo nwanyị zuru oke n’ọlụlụ – onye nwere ike ịchọta ya?

Olee mmadụ ahụ nwere ike chọtara onwe ya nwunye nwere ezi agwa? Ọnụ ahịa ya karịrị nke ọla ọcha na ọla edo. Di ya na-enwe ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ.

Ọ dara oke ọnụ nke na o nweghị ihe ọ bụla a ga-eji agbanwota ya. Ọ na-akpọbatara di ya ihe ọma, ọ naghị akpọbata nke ọjọọ na ndụ ya niile. Ọ na-enweta owu e ji akpa akwa nchụ oyi na akwa ụlarị, bịakwa were aka a zụrụ azụ na-ekwe akwa.

Ọ na-ejide osisi ikuku owu n’aka, bịakwa were mkpịsị aka ya na-akpagharị igwe na-agbakụ owu. Ọ na-ewetị aka ya ka o rute ụmụ ogbenye. Ọ na-esetịkwa ogwe aka ya maka igbo mkpa ndị nọ na mkpa.

Mma elu ahụ dị aghụghọ, ịma mma bụ ihe efu. Kama nwanyị na-atụ egwu Onyenweanyị bụ onye e kwesịrị inye otito. Kwụọnụ ya ụgwọ ihe ọ rụtara n’ọrụ. Ka ọrụ aka ya bụrụ ihe e ji eto ya n’ọnụ ụzọ ama niile.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 127:1-5 Az. 1

Azịza: Ngọzi dịrị ndị na-atụ Chukwu egwu.

1. Ngọzi dịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.

Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri.

Añụrị na agamnihu ga-abụ nke gị. Azịza.

2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị,

na-amị mmịmmị n’ime ụlọ gị.

Ụmụ gị ga-agarube oche nri gị,

ka ome osisi olivu. Azịza.

3. Otu a ka e si agọzi ndị na-atụ Chukwu egwu.

Ka Chukwu si na Zayọn gọzie gị.

Ka ị hụkwa agamnihu nke Jerusalem.

Dịkwa ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Tesalonịka

Isi Okwu: E kwela ka ụbọchị Onyenweanyị zute gị ka onye ohi

Ụmụnna m, ọ dịghị mkpa i degara ụnụ akwụkwọ banyere “oge” “ma ọ bụ “mgbe” ihe ndị a ga-emezu. N’ihi na ụnụ onwe ụnụ ma nke ọma na Ụbọchị Onyenweanyị ga-abịa na mberede, dịka onye ohi si abịa n’abalị.

Mgbe ndị mmadụ ga-anọ, na ekwu sị: “Udo na ume na obi iru ala adịla,” mgbe ahụ, na mberede ka mbibi ga-abịakwasị ha, dịka ihe mgbu nke na-abịara nwanyị na mberede mgbe ime na-eme ya.

Ha agaghịkwa agbalaha ya n’ọsọ. Ma ụnụ onwe ụnụ, ụmụnna m, ụnụ anọghịkwa n’ọchịchịrị. Ya mere, ụnụ ekwela ka Ụbọchị ahụ jide ụnụ na mberede dịka onye ohi. Ụnụ niile bụ ndị nke ihe.

Ụnụ niile bụkwa ndị nke ehihie. N’ihi na anyị abụghị ụmụ nke abalị ma ọ bụ ụmụ nke ọchịchịrị. Ya mere, ka anyị gharanụ ịrahụ ụra, dịka ndị ọzọ si eme. Kama, ka anyị mụrụnụ anya, nwekwaa anya udo.

MBEKU – Luk. 2:36

Aleluya, aleluya!

Na-echenụ nche; na-ekpenụ ekpere ugboro ugboro, ka ụnụ wee tozuo oke n’ịkwụrụ n’ihu Nwa nke Mmadụ.

Aleluya!

OZIỌMA – 25:14-30 maọbụ 25:14-15, 19-20

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: I kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe ntakịrị. Bata sonye n’añụrị nke nna gị ukwu.

Jesu tụụrụ Ụmụazụ Ya ilu a sị: “Otu nwoke chọrọ iga obodo ọzọ. O wee kpọọ ụmụ odibo ya, kesaa ihe o nwere tinye ha n’aka. Otu ka o nyere narị naịra ise; bịakwa nye nke abụọ narị naịra ọzọ abuo; nyekwa nke atọ otu narị naịra.

[O wee mesịa pụọ je n’ala ndị ọzọ. Ngwa ngwa odibo ahụ natara narị naịra ise jiri ego e nyere ya zụọ ahịa, wee rite uru narị naịra ise ọzọ. Otu ahụ kwa, odibo nke natara narị naịra abụọ ritekwara uru narị naịra abụọ ọzọ.

Ma odibo nke natara otu akpaego jere gwuo ala lie ego nna ya ukwu.] “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu ụmụ odibo ahụ lọghachiri; ya na ha wee pịazie.

Odibo ahụ natara narị naịra ise wetara narị naịra ise ahụ e nyere ya, bịakwa tụkwasị narị naịra ise ọzọ n’elu ya wee sị: ‘Nna m ukwu, i nyere m narị naịra ise. Lee, eritere m akpaego ise ọzọ n’uru.

[Nna ya ukwu wee sị ya: ‘Ezi nwa! I mere nke ọma! Ị bụ ezi odibo kwesịrị ntụkwasị obi. Ebe i gosịrị na ị bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi na nwa ihe ntakịrị aga m eme gị onye isi na-elekọtara m ihe buru ibu.

Bịa, banye n’ọñụ nke nna gị ukwu!” “Odibo nke natara narị naịra abụọ bịara sị: Nna m ukwu, i nyere m narị naịra abụọ. Ma lee, eritere m uru narị naịra abụọ ọzọ n’elu ya’.

Nna ya ukwu wee sị ya, ‘Ezi nwa! I mere nke ọma! Ị bụkwa ezi odibo kwesịrị ntụkwasị obi. Ebe igosịrị na ị bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi na nwa ihe ntakịrị, aga m eme gị onye isi na-elekọtara m ihe buru ibu.

Bịa banye n’ọñụ nke nna gị ukwu.” E mesịa, onye ahụ natara otu narị naịra bịara sị: ‘Nna m ukwu, ama m gị, na ị bụ mmadụ siri ike na mmete. Ị bụ onye aka ntagide.

Ị na-ewe ihe ubi n’ebe ị na-akụghị mkpụrụ ọ bụla, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe ịna-asụchaghị. N’ihi na egwu gị tụrụ m, ejere m lie ego gị ahụ n’ala. Lekwa ego gị were.’ Nna ya ukwu wee zaa ya sị: Ị bụ ajọ odibo, onye ume-ngwụ!

Ị matara na m na-ewere ihe ubi n’ebe m na-akụghị mkpụrụ ọ bụla, na-achịkọtakwa ihe ubi n’ebe m na-asụchaghị. Ihe ị gaara eme bụ itinyere m ego n’ụlọ-akụ; ka ọ ga-abụ, m lọta, m nara ego m, narakwa ụma ya.

“Ngwa, napụ ya otu narị naịra ahụ o ji, were ya nye onye ahụ nwere narị naịra ise. N’ihi na onye nwere enwe ka a ga-enyekwu ka o nwere bawanyekwuo.

Ma onye na-enweghị enwe, ọ bụna nke nta ahụ o nwere, a ga-anapụ ya. Chụpụnụ nwodibo ọjọọ a na-abaghị uru n’ọchị chịrị ebe ọ ga-anọ kwaa akwa, taakwa ikikere eze.””]

Igbo Mass Readings for November 20 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for November 19 2023, Ụka nke Iri Atọ na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 11, 2023