Igbo Mass Readings for November 5 2023, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for November 5 2023, Ụka nke Iri Atọ na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:14-2:2. 8-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Malaki

Isi Okwu: Ụnụ agahiela ụzọ bịakwa were nkuzi ụnụ duhie ọtụtụ mmadụ ụzọ

Onyenweanyị nke igwe ndị agha kwuru sị: “Abụ M eze dị ebube. Mba niile na-atụrụ aha M egwu”. Onyenweanyị nke igwe ndị agha kwuru sị: “Ọ bụrụ na i bughi ya n’obi ịkwanyere aha M ugwu, aga M abụ gị ọnụ.

Aga M atụgharị ngọzi gị ka ọ ghọọ abụmọnụ. “N’ezie, abụọla M ya rịị ọnụ, ebe ọ bụ na i bughị ya n’obi. Ị gapụla n’okporo ụzọ ahụ, bịakwa kuziere ọtụtụ mmadụ ka ha soro gị dapụ.

Onyenweanyị nke igwe ndị agha kwuru sị: ‘I merụọla ọgbụgba ndụ Livai. N’ihi ya, emeela M ka ị ghọọ ihe nkọcha na ihe a na-asọ oyi n’ihu mmadụ niile.

Ebe Ọ bụ na ị jụrụ ịga n’okporo ụzọ M; abịakwa nwee onye i dulaara n’ikpebi ikpe”. Ọ bụ na ọ bụghị sọ otu Nna ka anyị niile nwere? Ọ bụ na ọ bụghị sọ otu Chineke ahụ kere anyị niile? Ọ bụkwanụ gịnị kpatara onye ọ bụla ji aghọgbu ibe ya, bịakwa na-emerụ ọgbụgba ndụ nna nna anyị ha?

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 130

Azịza: Onyenweanyị, chekwaba mkpụrụ obi m n’udo n’ime Gị.

1. Onyenweanyị, nganga adịghị m n’obi.

Anya ekoroghị m n’elu.

Anaghị m eme okomoko.

Anaghị m ekonye aka m ebe karịrị m ogo. Azịza.

2. Kama ihe ndị a, obi m dara jụụ,

bịakwa nọrọ jii ka nwa jụrụ ara ọhụrụ.

Adị m ka nwa jụrụ ara ọhụrụ,

nke nne ya ku n’aka. Azịza.

3. Izrel, tụkwasa obi n’Onyenweanyị,

ma ugbu a ma mgbe ebighị ebi. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:7-9, 13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Tesalonịka

Isi Okwu: Ọ bụghị sọsọ na ọ gụrụ anyị agụụ inyefe ụnụ Oziọma ahụ n’aka. Ọ sọkwara anyị inyefe ụnụ ndụ anyị.

Mgbe anyị nọ na ebe ụnụ, anyị jiri nwayọọ nọrọ ka nne na-elekọta ụmụ ya. Anya anyị jiri lekọta ụnụ, na ụdị anyị jiri chekwaba ụnụ, bụ nke na anyị hụkatara ụnụ n’anya; ruo nke na, ọ bụghị sọ na ọ gụrụ anyị agụụ inyefe ụnụ Oziọma ahụ n’aka.

Kama ọ gụkwuru anyị agụụ iwere ndụ anyị niile nyekwuo ụnụ. Ụmụnna m, ka m chetakwara ụnụ ọzọ, otu anyị si rụgbuo onwe anyị n’ọrụ, nọrọ na ndọlị abalị na ehihie; ka anyị ghara ịbụrụ onye ọ bụla n’ime ụnụ ibu arọ, mgbe anyị na-ekwusara ụnụ Oziọma Chineke.

Ihe ọzọ kpatara anyị ji enye Chineke ekele ugboro ugboro maka ụnụ bụ na, mgbe ụnụ nụrụ ozi Chineke anyị buteere ụnụ, ụnụ anabataghị ya ka akụkọ mmadụ chepụtara n’obi ya. Kama ụnụ nabatara ya na ọ bụ ozi Chineke n’ezie. Ọ gbanweela ndụ ụnụ, bụ ndị kwere ekwe.

MBEKU – Jọn 14, 5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M Ụzọ, Eziokwu na Ndụ. O nweghị onye ọ bụla ga-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.

Aleluya!

OZIỌMA – 23:1-12

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ha bụ ndị soro okwu ọnụ M, e sola omume M.

Jesu gwara igwe mmadụ na Ụmụazụ Ya sị: “Ndị Ode-Akwụkwọ na ndị Farisii anọchiela n’oche Mosis. Meenụ ihe ọ bụla ha gwara ụnụ mee. Tọọnụ ntị n’ala n’ihe ọ bụla ha na-ekwu.

Mana ụnụ esokwala ha eme ihe ha na-eme, maka na ha adịghị eme ihe ha na-ekwusa. Ha na-ekekọ ibu dị arọ, a ga-ebo ndị mmadụ n’ubu, ma ha agaghị ekwe ka otu mkpịsị aka ha metụ ya.

Ọ fọkwa ibulite ya elu! Mba! Ọ gbasaghị ha ma ọlị! Ihe niile ha na-eme bụ, ka e wee too ha; ihe dịka ikpuru obosara akwa e dere iwu n’isi, na ịgbara ya n’aka, na iyi ogologo uwe.

Ha na-achọ ịnọ n’isi oche, ebe ọ bụla a kpọrọ oriri, na ịnọ n’oche ihu, ebe ọ bụla e zukọrọ n’ekpere. Ha na-achọ ka a na-egbuchapụrụ ha n’ụzọ pụrụ iche n’ime ahịa; ka ndị mmadụ na-akpọ ha Nna anyị ukwu.

Ụnụ ekwela ka a na-akpọ ụnụ Nna anyị ukwu, ebe ụnụ nwere sọ otu Nna ukwu; ụnụ niile bụ ụmụnne. Ụnụ akpọkwala onye ọ bụla nọ n’ụwa nna, ebe ọ bụ na ụnụ nwere sọ otu Nna, Onye nọ n’eluigwe.

Ụnụ ekwela ka a kpọọ ụnụ ndị nkuzi, n’ihi na ụnụ nwere sọ otu Onye Nkuzi, Onye bụ Kristi. Onye kacha ibe ya n’etiti ụnụ, ga-abụrịrị odibo ụnụ. Onye bugoo onwe ya elu, e buda ya. Ma onye buda onwe ya ala, e bugoo ya elu.

Igbo Mass Readings for November 6 2023, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Nkịtị