Igbo Mass Readings for October 27 2024, Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 27 2024, Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 31:7-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Jeremaya
Isi Okwu: A ga m akpọlata ndị isi na ndị ngwụrọ.
Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Were ọñụ tiere Jekọp mkpu. Were ọñụ wụlite elu n’isi obodo niile. Kwupụtanụ otito ụnụ, kwuonụ sị: Onyenweanyị agbapụtala ndị nke Ya.
Ọ gbapụtala ndị ọnwụ gbufọrọ n’ala Izrel. Leenụ anya, aga M esite n’ala ndị Ugwu akpọlata ha. Aga M esi n’akụkụ ụwa niile akpọkọta ha ọnụ; bịakwa kpọlata ma ndị isi, ma ndị ngwụrọ nọ n’agbata ha.
Ma ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme ga na-alọta n’igwe, n’igwe. Anya mmiri ka ha bu wee pụọ mana aga M akasi ha obi, mgbe M na-edulata ha. Aga M esi n’okporo ụzọ dị larịị, si n’iyi dufee ha iyi, ka ihe ọ bụla ghara ịkpọ ha n’ụkwụ. N’ihi na abụụrụ M Izrel Nna. Ifrem bụ diọkpara M.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 125. Az. 3
Azịza: Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe dị egwu! Añụrị juru anyị obi.
1. Mgbe Onyenweanyị kpọlatara ndị Zayọn e jidere n’agha,
ọ dị anyị ka ọ bụ ihe mere na nro.
Mgbe ahụ, ọnụ anyị juru n’ọchi.
Ire anyị juru n’ọñụ. Azịza.
2. Mgbe ahụ, ihe e kwuru n’ala mba niile bụ:
“Onyenweanyị emeerela ha nnukwu ihe dị egwu.”
Onyenweanyị emeerela anyị nnukwu ihe dị egwu.
N’ezie, obi dị anyị ụtọ. Azịza.
3. Onyenweanyị, mee ka ụmụ anyị a kpọpụrụ n’agha, laghachikwa n’ala anyị;
dịka mmiri iyi dị iche si alaghachi n’ime osimiri.
Ndị ji anya mmiri ghaa mkpụrụ akụkụ, ga-eji iti mkpu ọñụ ewe ihe ubi. Azịza.
4. Ọ bụ ezie na ha beere akwa, bere akwa buru mkpụrụ akụkụ ọghịgha pụwa.
Ma lee ka ha kweere ukwe ọñụ, kwere ukwe ọñụ, buru ihe owuwe ubi n’ukwu, n’ukwu na-abata. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi e degaara Ndị Hibru
Isi Okwu: Ị bụ Ụkọchukwu ebebe n’usoro nke Melkizedek
Nnukwu Ụkọchukwu ọ bụla bụ mmadụ, e siri n’agbụrụ mmadụ họta, bịakwa debe ya iche, ka ọ bụrụ onye nnọchite anya mmadụ, na onye na-agba ụkọ n’agbata mmadụ na Chineke; ka ọ na-achụnye onyinye na aja maka njọ.
Otu a ka o si bụrụ, na ọ ga-enwe obi ebere maka ndị na-amaghị ihe, ma ọ bụ ndị na-aghọtaghịnụ; ebe ọ bụ na-adịghị ike mmadụ soro kee ya agbụ. N’ihi ya ka o ji achụ aja njọ, maka onwe ya na maka ndị mmadụ.
O nweghị mmadụ na-eji aka ya, eburu ugwu dị otu a, ebokwasa onwe ya n’isi. Kama onye ọ bụla e nyere ugwu ahụ bụ, onye Chineke kpọrọ oku, otu e si kpọọ Erọn.
N’otu aka ahụ kwa, ọ bụghị Kristi jiri aka Ya tube onwe Ya ugo, nke ịbụ Nnukwu Ụkọchukwu. Kama Ọ natara ya n’aka Onye ahụ sị Ya: Nwa M ka Ị bụ! Taa ka M ghọrọ Nna Gị!” O kwukwara n’ebe ọzọ sị: “Ị bụ Ụkọchukwu ruo mgbe ebighị ebi n’usoro nke Melkizedek.
MBEKU – Jọn 8: 12
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị “Abu M Ihe nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M ga-enwe ihè nke ndụ”.
Aleluya!
OZIỌMA – 10:46-52
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Nna m ukwu, mee ka m hụba ụzọ
Mgbe Jesu na Ụmụazụ Ya na oke igwe mmadụ so ha, na-ahapụ Jeriko, otu onye arịrịọ kpuru isi, a na-akpọ Batimeus, (nke pụtara, nwa Timeus), nọdụrụ n’akụkụ ụzọ.
Mgbe ọ nụrụ na ọ bụ Jesu onye Nazaret na-agafe, ọ malitere iti mkpu na-asị: “Jesu, Nwa Devid meere m ebere!” Ọtụtụ mmadụ bidoro ịbara ya mba, na-agwa ya ka o mechie ọnụ.
Ma mgbe ahụ ka o tibere mkpu nke ka nke sị: “Nwa Devid, meere m ebere!” Jesu wee guzo, sị: “Kpọtanụ ya ebe a.” Ha kpọrọ onye ahụ kpuru isi, sị ya: “Obi sie gị ike! Kulite! Ọ na-akpọ gị!”
O wee ghapụ akwa ọ ghara n’ahụ. Wụlite elu; wee gakwuru Jesu. Jesu jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị chọrọ ka M meere gị?” Onye isi ahụ zara Ya: “Nna m ukwu, mee ka m hụba ụzọ ọzọ!” Jesu zara ya: “Ngwa lawa! Okwukwe gị azọọla gị.” N’otu ntabi anya ahụ ka o bidoro hụwa ụzọ bịakwa soro Ya na-aga n’ụzọ.
Igbo Mass Readings for October 28 2024, Emume Ncheta Saịmọn na Jude dị Asọ
Igbo Mass Readings for October 27 2024, Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.