Igbo Mass Readings for October 26 2025, Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for October 26 2025, Ụka nke Iri Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 35:12-14,16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Isi Okwu: Arịrịọ nke onye dị umeala na-emepe urukpu
Dinwenụ bụ ọkaikpe, Onye anaghị asọ mmadụ anya. Ọ naghị asọpụrụ ọgaranya iji megide nwa ogbenye. Ọ na-atọ ntị n’ala n’olu ndị a na-emegbu emegbu.
Ọ naghị eleghara anya n’arịrịọ nwa ogbenye, ma ọ bụ na nke nwanyị isimkpe, oge ọ na-akọsara Ya akụkọ ụwa ya. A na-anụ olu onye ọ bụla ji ezi obi na-efe Chineke; Ekpere onye umeala na-adụpu urukpu.
Arịrịọ ya anaghị ezu ike ruo mgbe ọ garuru ebe ọ na-aga. Ekpere ya anaghị adụla azụ, wee ruo mgbe Onye Kacha Elu zara ya oku ahụ ọ na-akpọ; wee ruo mgbe Okpe ikpe ziri ezi, biri ikpe, wee zọpụta onye ezi omume. Osebụrụwa agaghị atụfu oge ikpepụta ya, nke ọ na-ala oge n’iyi ịbịa nyere ha aka.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:2-3. 17-19.23. Az. 7
Azịza: Nwa ogbenye a kpọkuru, Osebụrụwa nụrụ olu ya
1. Aga m ekele Osebụrụwa mgbe niile,
otito ya ga-adị na egbirigbe ọnụ m mgbe niile;
Ọ bụ na Dinwenụ ka mkpụrụ obi m ga na-etu ọnụ.
Ndị umeala ga anụ, nwee obi añụrị. Azịza.
2. Onyenweanyị ekpebiela n’obi ya ịla ndị ajọ omume n’iyi,
Ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha n’ụwa.
Ma ndị ezi omume kpọkuo Osebụrụwa, ọ na-anụ olu ha,
Ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. Azịza
3. Dinwenụ nọ ndị obi gbawara nso;
ndị egwepịagoro mmụọ ha Ọ ga-azọpụta ha.
Dinwenụ na-agbapụta mkpụrụ obi ụmụodibo ya.
Ndị niile zobere onwe ha n’ime ya agaghị enwe amamikpe ọbụla. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:6-8. 16-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara Timoti
Isi Okwu: Ihe fọrọnụ bụ okpu eze nke ezi omume a ga-enye m
Ya bụrụ ma nke m, e bidola iwụfu ndụ m, ka a ga-asị na ọ bụ mmánya e ji achụ aja. Oge m ji ala mmụọ eruola. Alụgidela m ezigbo ọgụ ahụ ruo na ngwụcha.
Agbagidela m ọsọ ahụ, ruo ebe ọ gwụrụ. E jisiri m okwukwe ahụ ike. Ugbu a, sọ otu ihe fọdụrụnụ bụ, okpu eze nke ezi omume ahụ, e chekwabara maka m: nke ahụ Onyenweanyị, bụ Okpe ikpe ziri ezi ga-enye m n’Ụbọchị ahụ.
Ma ọ bụghị sọ m ka a ga-enye ya; kama, a ga-enyekwa ya ndị niile ọ na-agụ agụụ n’obi, ịhụ mgbe Ọ ga-apụta ihe. N’oge a kpọlitere ebubo ahụ e boro m, ọ dịghị onye ọ bụla bịara ịgbara m akaebe.
Ha niile hapụrụ naanị m. Ka a gharakwa ịna ha ụgwọ ihe ahụ ha mere! Nke bụ ezi okwu bụ na Onyenweanyị kwụnyeere m, bịakwa gbaa m ume; nke mere na e jiri m kwusaa Oziọma ahụ n’uju, ka ndị ọgọmmụọ nụrụ ya.
Otu a ka e si gụpụta m n’ọnụ ọdụm. Onyenweanyị ga-agbapụta m na mbọ niile a na-agba iji megide m. Ọ ga-eduru m n’udo dubata n’alaeze Ya nke eluigwe. Ka otito niile dịrị Ya, ebighị ebi, ebighị ebi! Amen.
MBEKU – 2 Kọr. 5:19
Aleluya, aleluya!
Chineke nọ n’ime Kristi, na-eme ka ya na ụwa dị na mma. O tinyela n’aka anyị ụzọ e si eme ka Chineke na mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
Aleluya!
OZIỌMA – 18:9-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Onye ọna-ụtụ ahụ lara n’ụlọ ya, ya na Chineke adịrị na mma, karịa onye Farisii ahụ.
Jesu tụrụ ilu a maka ndị ahụ na-anya isi, na ha bụ ndị ezi omume, si otu a na-eleda ndị ọzọ anya: “Mmadụ abụọ gara ikpe ekpere n’Ụlọ Nsọ Chineke.
Otu n’ime ha bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye Ọna-ụtụ. Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ si otu a kpe ekpere ya nye Chineke sị: ‘Chineke! Ana m ekele m gị, n’ihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị anya ukwu, ndị omegbu, ndị na-akwa iko.
Ana m enye Gị ekele pụrụ iche, maka na-adịghị m ka nwa-onye Ọna-ụtụ a nọ ebe a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ n’izu ụka. Ana m eji otu ụzọ n’ụzọ iri, nke ihe niile m kpatara tụọ mmamma.”
“Ma onye Ọna-ụtụ ahụ guzoro n’azụ, n’ime Ụlọ Nsọ. Ụjọ ekweghị ya iwelite anya lee eluigwe. Kama o tiri aka n’obi sị: ‘Chineke m! Meere m ebere! Abụ m onye mmehie!
“N’ezie, mgbe onye Ọna-ụtụ a na-ala n’ụlọ ya, ya na Chineke dị na mma, karịa onye nke ọzọ. N’ihi na, onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda n’ala, ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”
Igbo Mass Readings for October 27 2025, Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Nkịtị