Connect with us

Igbo Sunday Readings - Cycle A

Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Nkịtị

Published

on

Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 20:10-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Jeremaya

Isi Okwu: Ọ napụtara obi ndị nọ na mkpa n’aka ndị ajọ mmadụ.

Jeremaya kwuru sị: “N’ezie, anụla m izu ọjọọ nke ọtụtụ mmadụ na-agba megide m sị: ‘Egwu dịkwa n’ebe niile! Gbagide ya ama! K’anyị gbagide ya ama!

Advertisement

Ndị niile mụ na ha dị na mma na-eche mgbe ọ bụla m ga-azọhie ụkwụ daa. E leghị anya, ọnya ga-ama ya, anyị enweta ya, bọọrọ onwe anyị ọbọ ihe o mere anyị.

Ma Onyenweanyị nọnyeere m, dịka oke dikeọgụ. Ndị na-ebuso m agha ga-asụ ngọngọ. Ha agaghị e meri. Ihere ga-eju ha anya n’ọdịda ha, wee butere ha oke ọgba gharịị dị ebighị ebi, nke a na-agaghị echefu echefu.

Onyenweanyị nke igwe ndị agha, ọ bụ Gị na-enyocha ndị ezi omume: Gị bụ onye ahụ na-enyocha uche na obi mmadụ, kwee ka m jiri anya m hụ ọbọ Ị ga-abọgwata ha, maka na ọ bụ Gị ka m kpesaara olu m.

Kweere Onyenweanyị ukwe. Too Onyenweanyị maka na Onyenweanyị agbapụtala ndụ ụmụ ogbenye n’aka ike nke ndị ajọ omume.

Advertisement

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 68:8-10, 14, 17, 33-35 Az. 14

Azịza: Onyenweanyị, were nnukwu ịhụnanya Gị za m oku.

1. N’ihi Gị ka m ji ana nkọcha. Ihere ekpuchiela m ihu. Aghọọla m onye a tụpụrụ n’iwu n’ebe ụmụnne m nọ. Bịakwa ghọọ onye ọbịa n’etiti ụmụnne m, ndị otu nne mụrụ mụ na ha. Maka na obi ịnụ ọkụ maka Gị erepịala m. Nkọcha ndị na-ekwutọ Gị na-ala m n’isi. Azịza.

2. Onyenwe m, ana m arịọ Gị: Chineke m, ana m arịọ amara Gị. Na nnukwu obi ọma Gị, nyere m aka ugboro ugboro, za m oku. Onyenwe m za m oku n’ihi na obi ọma Gị ebuka. Na nnukwu ebere Gị tụgharịa chee m ihu. Azịza.

3. Ụnụ bụ ụmụ ogbenye, leenụ anya, ka obi tọọ ụnụ ụtọ. Ụnụ bụ ndị na-achọ Chineke, ka obi ụnụ jupụta n’añụrị. Maka na Onyenweanyị na-anụ olu ụmụ ogbenye. Anya Ya-anaghị apụ apụ na ndị nke Ya e ji n’agbụ. Ka eluigwe na ala too Ya. Ka osimiri na ihe niile na-emetụ ụñara n’ime ya too Onyenweanyị. Azịza.

Advertisement

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:12-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Amara e nyere kariri ọdịda a dara.

Dịka njọ si n’aka otu nwoke wee bata n’ụwa; ọnwụ sokwara njọ bata. Otu ahụ ka ọnwụ si rute mmadụ niile, maka na onye ọ bụla emeela njọ. Njọ anọọlarị n’ụwa ogologo oge tupu e nye Iwu.

Ma ebe ọ bụ na iwu adịghị, o nweghị onye e nwere ike ibo ebubo na o mere njọ nke ‘imebi iwu’. Ma ọnwụ chịrị mmadụ niile, bido n’Adam ruo na Mosis; ọ bụladị na njọ ha abụghị imebi iwu, dịka nke Adam.

Advertisement

Adam bụ onye e ji ama atụ nke Onye Ahụ gaje ịbịa. Ma amara e nyere jiri ihe buru ibu karịa ọdịda a dara. Ọ bụrụ na o were anya, na mmadụ niile sitere n’ọdịda otu nwoke nwụọ; ọ kara wee anya na amara Chineke, nke sitere n’aka otu nwoke ahụ bụ Jesu Kristi, bịara rute mmadụ niile, dịka onyinye zuru oke, e nyere na nkịtị.

MBEKU – Jọn 14:23

Aleluya, aleluya!

Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.

Aleluya!

Advertisement

OZIỌMA – 10:26-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Ụjọ mmadụ atụla ụnụ.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya sị: “Ụnụ atụla ụjọ mmadụ! N’ihi na ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi ugbu a ga-abụ ihe e kpughere ekpughe. Nke ọ bụla e zoro ezo, ga-abụ ihe a gbara n’anwụ.

Ihe M gwara ụnụ n’ọchịchịrị, kwuonụ ya n’ehihie ọcha. Ihe M takwụnyere ụnụ na ntị, kwusaanụ ya n’elu ụlọ. Ụnụ atụla egwu ndị ahụ na-egbu ahụ, ma ha enweghị ike igbu mkpụrụ obi.

Advertisement

Kama tụọnụ egwu Onye ahụ nwere “ike ime ka ahụ na mkpụrụ obi laa n’iyii n’ọkụ ala mmụọ. Ihe a na-ere ụmụ nza abụọ ọ bụghị naanị otu kọbọ? Ma nke ọ bụla n’ime ha e nweghị ike ịda n’ala, ma ọ bụrụ na Nna ụnụ amaghị.

Ma otu ọ dị, a gụọla agịrị isi ụnụ bu n’isi ọnụ. Ya mere, ụnụ atụla egwu ọ bụla. N’ihi na ụnụ dị oke ọnụ ahịa karịa ọtụtụ ụmụ nnụnụ. “Ya mere, onye ọ bụla nke ga-ekwupụta M n’ihu mmadụ, aga M ekwupụta ya n’ihu Nna M nọ n’eluigwe. Ma onye ọ bụla nke ga-agọnarị M n’ihu mmadụ, aga M agọnarị ya n’ihu Nna M nọ n’eluigwe.

Igbo Mass Readings for June 22 2026, Monde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for June 21 2026, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Advertisement

Catholic Lector is the founder of Catholiclectionary.com. I am a Theologian, a commissioned Lector, and Liturgy Minister. I lead the team that operates Catholiclectionary.com which is a Catholic Church-related website that provides you, on daily basis, with the following: (a) Catholic Daily Mass Readings (b) Reflections on the Daily Mass Readings (c) Daily Prayers (d) Catholic Hymns, and (e) Saints of the Day. I and my team work for the collective growth in spiritual lives of all the faithful.

Advertisement

Get Daily Mass Readings through Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.