Igbo Mass Readings for June 23 2024, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 23 2024, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 38:1,8-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Job

Isi Okwu: E be a ka ebili mmiri ụnụ ga-akwụsị.

Onyenweanyị sitere n’etiti oke ifufe zaa Job sị ya: Onye kara akara nye osimiri iwu ebe ọ ga-ejedebe, mgbe ọ sọpụtara dị ka a ga-asị na o si n’akpa nwa pụta?

Onye yikwasịrị ha igwe ojii na ọchịchịrị dị ka uwe? Onye kpaara ha oke n’ọnụ mmiri sị ha, “Ebe a ka ụnụ ga-asọrute, ebe a ka ebili mmiri ụnụ ga-akwụsị”?

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 106:23-26, 28-31. Az. 1

Azịza: Nyenụ Onyenweanyị ekele. Ịhụnanya Ya dị ebighị ebi. Ma ọ bụ Aleluya

1. Ndị nyara ụgbọ mmiri n’oke osimiri,

ndị gara ịzụ ahịa n’ofe iyi hụrụ aka ọrụ nke Onyenweanyị.

Ha hụrụ ọrụ ebube Ya n’ime mmiri miri emi. Azịza.

2. Okwu ọnụ Ya malitere oke ifufe nke guzobere ebiri mmiri niile n’elu.

Ha wugoro n’eluigwe bịakwa sụdaruo n’ime ala.

Obi lọrọ ha mmiri n’ọnọdụ ọjọọ ha. Azịza.

3. Ha kpọkuru Onyenweanyị na nnukwu nsogbu ha.

O wee zọpụta ha na mkpa ha niile.

Ọ gbọjara oke ifufe ka ọ daa jụụ bụrụ nwa ikuku nta.

Ụzọ ebiri niile ewee jụrụ gba nkịtị, Aziza.

4. Ha ñụrịrị ọñụ na O mere ihe obi jiri lọ ha.

O dugidere ha duruo ha ebe ahụ ha chọrọ ịganụ.

Ha nyere Onyenweanyị ekele n’ihi obi ọma Ya,

na ọrụ ebube Ọ rụụrụ ụmụ mmadụ. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 5:14-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt

Isi Okwu: Ugbu a okike ọhụrụ anọchiela.

Ịhụnanya Kristi na-eri anyị ọnụ, mgbe ọ bụla anyị tụgharịrị ya n’uche, na otu nwoke nwụchiteere mmadụ niile ọnwụ. Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ niile kwesịrị ịnwụ.

Ma ihe kpatara O jiri nwụchitere mmadụ niile ọnwụ bụ, ka ndị dị ndụ ghara ịdị ndụ maka onwe ha; kama ka ha dịrị ndụ maka Onye ahụ nwụchiteere ha ọnwụ, bịakwa bilite na ndụ maka ha.

N’ihi ya, site ugbu a gawa n’ihu, ọ bụghị ihe dị n’usoro anụ ahụ ka anyị ji elekwa onye ọ bụla anya. Ọ bụrụgodụ ezie, na e nwere mgbe anyị ma Kristi n’anụ ahụ, ọ bụkwaghị n’anụ ahụ ka anyị ma Ya ugbu a. Maka onye ọbụla nọ n’ime Kristi, e nweela ihe okike ọhụrụ. Ihe okike ochie agaala. Nke ọhụrụ anọchiela anya ya.

MBEKU – Luk 19:38

Aleluya, aleluya!:

Ngọzi dịrị Eze bịara n’aha Onyenweanyị. Udo dịịrị ụwa! Ebube dịịrị igwe!

Aleluya!

OZIỌMA – 4:35-41

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Onye ka nwoke a bụ ifufe na ebili mmiri na erubere isi?

N’oge anyasị ụbọchị ahụ, Jesu gwara ndị Ụmụazụ ya sị, “Ka anyị banyenụ n’ụgbọ mmiri gafee n’ofe ọzọ nke osimiri a. Ha wee hapụ igwe mmadụ ahụ, bakwuru Jesu n’ụgbọ ebe Ọ nọ, kwọrọ ya n’ụgbọ gafee.

Ụfọdụ ụgbọ mmiri sokwara ha n’azụ. Mgbe ha nọ n’ụzọ na-aga, oke ifufe dị ike bidoro ife. Ebili mmiri bidoro na-amagharị, mmiri bidokwara ịbanye n’ime ụgbọ ha.

Mmiri banyere n’ụgbọ ha dị ukwuu ruo na ụgbọ ha chọrọ imikpu n’ime mmiri. Mgbe ihe ndị a niile na-eme, Jesu nọrị n’ime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye n’isi ya.

Ha wee kpọtee ya, sị: “Nna anyị ukwu, ọ dịghị emetụ gị n’obi na anyị niile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?” Jesu biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sị, “Dere jii!” Ngwangwa, ifufe ahụ kwụsịrị ifegharị, ebe niile dekwaara jii.

O wee jụọ Ụmụazụ ya sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ ụnụ? Ebee ka okwukwe ụnụ gara?”

Ha niile tụrụ egwu, jụrịtaa onwe ha sị, “Onye ka nwoke a bụ? Nwoke a ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha n’iwu?”

Igbo Mass Readings for June 24 2024, Emume Ọmụmụ Jọn Ome Mmirichukwu

Igbo Mass Readings for June 23 2024, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023