Igbo Mass Readings for June 25 2028, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 25 2028, Ụka nke Iri na abụọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:10-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zekaraya
Isi Okwu: Ha ga-eligide onye ahụ ha mara ube
Ọ bụ Onyenweanyị na-ekwu: A ga M ehukwasa mmụọ amara na nke ekpere n’ụlọ Devid na ndị bi na Jerusalem. Ha ga-elegide m anya, bụ onye ahụ ha mara ube.
Ha ga-eru ụjụ n’ihi ya, dị ka mmadụ si eru ụjụ n’ihi ọnwụ nke nwa mbụ ya. Mgbe ụbọchị ahụ ruru, a ga-enwe nnukwu iru ụjụ na Juda, dịka iru ụjụ nke Hadad-rimon na obosara ala Megido.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 62:2-6,8-9 Az. 2
Azịza: Onyenwe m na Chineke m, mkpụrụ obi m na-achọsị Gị ike.
1. Chineke, Ị bụ Chineke m Onye m na-achọ.
Ahụ m na-achọsị Gị ike.
Akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka Gị,
dịka ịchakịrị ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri. Azịza.
2. Otu a ka m si lee anya n’ebe Ị nọ n’ụlọ nsọ;
ka m wee hụ ike na ebube Gị.
Mana na obi ọma Gị dị mma karịa ndụ.
Egbugbere ọnụ m ga na-eto Gị. Azịza.
3. N’ihi ya ka m ga-eji na-eto Gị ugbu a m dị ndụ.
Ewelitere m aka m elu wee na-akpọku aha Gị.
Mkpụrụ obi m ga-enwe afọ ojuju,
ka onye e jiri ihe gbara abụba kpọọ oriri.
Egbugbere ọnụ m ga-eju n’añụrị,
ọnụ m wee na-ekwe otito Gị. Azịza.
4. Ị bụ enyemaka m.
N’okpuru nku Gị ka m na-eti mkpu ọñụ.
Mkpụrụ obi m na-arapara Gị n’ahụ.
I jiri aka nri Gị kuru m. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:26-29
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia
Isi Okwu: Ụnụ niile e mere mmirichukwu na Kristi eyirila Kristi dịka uwe
Ụnụ niile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe na Kristi Jesu. Ụnụ bụ ndị niile emere mmirichukwu n’ime Kristi, eyikwasala Kristi dịka uwe. O nweghịkwa nkewa ọzọ dị n’etiti onye Juu na onye Grik; n’etiti ohu na onye nwe onwe ya; n’etiti nwoke na nwanyị.
Kama mmadụ niile bụ otu n’ime Kristi Jesu. Naanị na mmadụ bụ onye otu Kristi, emeela ka onye ahụ site sonye n’agbụrụ Ebreham, bịakwa bụrụ onye ga-eketa oke na nkwa ahụ e kwere.
MBEKU – Jọn 6: 63.68
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ gị ji okwu ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 9:18-24
Ihe Ọgugu nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Gị bụ Kristi nke Chineke. Nwa nke mmadụ ga-atarịrị ahụhụ.
Otu ụbọchị, mgbe Jesu nọ naanị Ya na-ekpere ekpere n’ihu Ụmụazụ Ya, Ọ jụrụ ha ajụjụ sị: “Onye ka ndị mmadụ na-asị na M bụ”? Ha zara Ya, sị: “Ụfọdụ na-asị na Ị bụ Jọn Ome Mmirichukwu; ndị ọzọ na-asị na Ị bụ Ilaija.
Ndị ọzọ na-asị na Ị bụ otu n’ime ndị amụma agba ochie, onye siri na mmụọ lọghachi na ndụ”. Ọ jụwakwa ha ọzọ sị: “Ụnụ kwanụ? Onye ka ụnụ na-ekwu na M bụ”?
Pita wee zaa, sị: “Ị bụ E-Chiri-Echi nke Chineke”. Ma Jesu dọrọ ha aka na ntị, dọsie ha ike, ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe a. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ akara aka Nwa nke Mmadụ na Ọ ga-ahụrịrị nnukwu ahụhụ; na ndị okenye, ndị isi nchụaja, na ndị ode-akwụkwọ ga-ajụ Ya, bịakwa gbuo Ya.
Ma n’ụbọchị nke atọ. Ọ ga-esi n’ọnwụ bilite”. Jesu wee gwa mmadụ niile sị: “Onye ọ bụla chọrọ ịbụ Onye na-eso M, ya jụ onwe ya; buru obe ya ụbọchị niile na-eso M. Onye na-achọ ichekwaba ndụ ya ga-atụfu ya. Ma onye tufuru ndụ ya n’ihi M, ga-echekwaba ya.”
Igbo Mass Readings for June 26 2028, Monde Izuụka nke Iri na Abụọ N’Oge Nkịtị