Igbo Mass Readings for July 9 2023, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 9 2023, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 9:9-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Zekaraya

Isi Okwu: Lee, eze gị ji umeala na-abịakwute gị.

Gị bụ ada Zayọn, were obi gị nile ñụrịa nnukwu ọñụ. Gị bụ ada Jerusalem, tie mkpu ọñụ. N’ihi na lee, Eze gị na-abịakwute gị. Ọ bụ Onye Nzọpụta aka Ya kwụ ọtọ.

Ọ dị nwayọọ, bịakwa na-agba ịnyịnya ibu. Ọ nọkwasara n’elu nwa ịnyịnya ibu. Ọ ga-ebipụ ụgbọ ala nke Ifrem na ịnyịnya agha nile nke Jerusalem. Ọ ga-agbajikwa ụta agha bịakwa gwa mba nile okwu udo.

Ọgbọ ọchịchị ya ga-esite n’oke osimiri ruo n’oke osimiri nke ọzọ bịakwa site n’osimiri, ruo na nsọtụ nile nke ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 144:1-2. 8-11 13-14. Az. 1

Azịza: Chineke m na eze m, aga metogide aha Gị ruo mgbe ebịghị ebi. ma ọ bụ Aleluya.

1. Chineke m na eze m, aga m eto Gị.

Aga m agọzi aha Gị ebịghị ebi.

Aga m eto Gị kwa ụbọchị, kwa ụbọchị.

Aga m eto aha Gị ebighị ebi, ebighị ebi. Azịza.

2. Onyenweanyị bụ onye amara na onye ebere.

Ọ naghị ewe iwe ọkụ. Obi ọma Ya ebuka.

Ọ na-emere ihe nile O kere ebere. Azịza.

3. Onyenweanyị, ka ihe dum I kere kelee Gị.

Ka ndị kwere na Gị too Gị.

Ha kọọ akụkọ ebube nke alaeze Gị.

Ha kwuo okwu banyere ịdị ike Gị. Azịza.

4. Onyenweanyị kwesịrị ntụkwasa obi n’okwu Ya nile.

Ọ dịkwa asọ n’ọrụ aka Ya niile.

Onyenweanyị na-ebulite ndị nile na-ada ada.

Ọ na-ekulite ndị nile huru ehuru. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:9, 11-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ụnụ ga-ebi ndụ ka ụnụ were Mmụọ Nsọ kpagbuo mmehie nke anụ ahụ.

Ihe ụnụ chọrọ abụghị ihe nke anụ ahụ, kama ihe nke mmụọ, ebe ọ bụ na Mmụọ Chineke bi ebi n’ime ụnụ. N’ezie, ọ bụrụ na ụnụ enweghị Mmụọ nke Kristi, ụnụ abụghị ndị nke Ya.

Ọ bụrụ na Mmụọ nke Onye ahụ kulitere Jesu n’ọnwụ, bi ebi n’ime ụnụ; ọ pụtara na Onye ahụ kulitere Jesu n’ọnwụ, ga-esite na Mmụọ Ya, were ndụ nye ahụ ụnụ pụrụ ịnwụ anwụ.

Ụmụnna m, n’ihi ya, o nweghị mkpa ọ bụla ọ dị, irubere onwe anyị nke bụ anụ ahụ isi, ma ọ bụ ibi ndụ nke anụ ahụ. O bụrụ na ụnụ biwe ndụ dị otu ahụ, ụnụ ga-ala n’iyi. Ma ọ bụrụ na ụnụ were Mmụọ Nsọ pịgbuo mmerụ nke anụ ahụ, ụnụ ga-adịkwa ndụ.

MBEKU – Jọn 14:5

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: “Abụ M ụzọ, ezi okwu na ndụ. O nweghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna, e wepụ ma o si n’aka M.

Aleluya!

OZIỌMA – 11:25-30

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.

Isi Okwu: Adị M nwayọọ dịkwa umeala n’obi.

N’oge ahụ, Jesu kwuru sị: “Nna!, Onyenwe eluigwe na ụwa! Ana M ekele Gị, n’ihi na, ihe a I zonarịrị ndị oke mmụta na oke aghụghọ, ka i kpugherela ụmụntakịrị na-amaghị ihe!

Nna! E, ọ bụ otu o si masị Gị, ka I si mee ya! “Nna M weere ihe nile nyefee M n’aka. O nweghị onye ma onye Nwa bụ, ma ọ bụghị sọ Nna; otu o si bụrụ, na o nweghị onye ma onye Nna bụ, ma ọ bụghị sọ Nwa, ma ọ bụ onye ọ bụla ọ sọrọ Nwa igosi Ya.

“Bịakwutenụ M, ụnụ nile bụ ndị na-adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ, ndị e bokwara ibu dị arọ, aga M enye ụnụ ezumike. Nyaranụ ibu M n’ubu ụnụ. Mụtakwanụ ihe site n’aka m, maka na adị M nwayọọ, dịkwa umeala n’obi. Mmụọ ụnụ ga-achọta ezumike. N’ezie, ibu M dị nfe. Ibu M adịghị arọ.

Igbo Mass Readings for July 10 2023, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for July 9 2023, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 3, 2023