Igbo Mass Readings for July 7 2024, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 7 2024, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 2:2-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Izikel

Isi Okwu: Ha bụ ndị na-enupụ isi, ha ga-amata na onye amụma nọ n’etiti ha.

Mmụọ nke Onyenweanyị banyere n’ime m. Ọ bịakwara mee ka m guzo ọtọ n’ụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ na-agwa m okwu sị: “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị Izrel, ndị bụ mba na-enupụ isi, ndị nupụrụ isi megide m.

Ha na nna nna ha enupụla isi ha megide m, ruo ọ bụladị ugbu a m na-ekwu okwu. Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isi ike, na ndị nnupụ isi. Gwa ha ihe ndị a sị ha.

Lee ihe Onyenweanyị Chineke kwuru. Ha bụ ndị na-enupụ isi, n’ihi ya, ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị, ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma nọ n’etiti ha.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 122:1-2, 3-4. Az. 2

Azịza: Anya anyị wụkwasara n’Onyenweanyị ruo mgbe Ọ ga egosi anyị ebere Ya.

1. Gị bụ onye ahụ nọdụrụ ala n’oche eze nke igwe,

eweliteere m Gị anya m elu,

n’ụdị ahụ anya ohu si ele aka nke nna ya ukwu. Azịza.

2. Dịka anya odibo nwanyị si ele aka nne ya ukwu,

otu ahụ kwa ka anya anyị si ele Onyenweanyị Chineke,

wee ruo mgbe O meere anyị ebere. Azịza.

3. Onyenweanyị, meere anyị ebere.

Biko, meere anyị ebere.

N’ihi na nleda anya e ledara anyị akarịala.

Obi agbapịala anyị n’ebe ndị nganga ji anyị akpa ọchị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 12:7-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt.

Isi Okwu: Obi dị m ụtọ nke ukwuu mgbe m na-anya isi n’ime adịghị ike m.

Ka m wee ghara ịfụli onwe m elu karịa, n’ihi ihe ịtụ n’anya na oke mkpughe Chineke kpugheere m, e tinyere ihe mgbu n’anụ ahụ m, ka ọ na-adụ m dịka ogwu.

Ihe mgbu a dị n’anụ ahụ m na-eti m aka dịka mmụọ ozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụli onwe m elu karịa. Ugboro atọ ka m rịọrọ Onyenweanyị arịrịọ banyere ihe a, ka ọ pụọ n’ahụ m.

Ihe Ọ zara m bụ: “Amara M ezuorela gị! N’ihi na ike M na-apụta ihe mgbe ike mmadụ na-adịghị.” Ya mere, obi dị m ụtọ nke ukwu mgbe m na-anya isi n’ime adịghị ike m niile, ka ike nke Kristi wee rịdakwasị m, birikwa n’ime m.

Ya mere, n’ihi Kristi, ka m na-anagide adịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, mkpa, nsogbu niile, na ihe ndakwasị dị iche iche. N’ihi na mgbe m na-adịghị ike n’anụ ahụ ka m nwere ike na mmụọ karịa.

MBEKU – Jọn 1:12.14

Aleluya, aleluya!

Okwu Chineke ghọrọ mmadụ wee binyere anyị. O nyere ndị nabatara Ya ike ịghọ ụmụ Chineke.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:1-6

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere

Isi Okwu: Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọ bụla ma e wepụ n’aka nna ya.

Jesu wee si n’ebe ahụ pụọ laghachi n’obodo amụrụ Ya. Ụmụazụ Ya sokwa Ya gaa. Mgbe ụbọchị izuike ruru, Ọ malitere izi ihe n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Ibobo wee nwụọ ndị niile nụrụ nkuzi Ya n’ahụ, nke mere na ha malitere ịjụ sị: “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a niile?

Olee ụdị amamihe e nyere Ya? Leekwa ọrụ ebube nke a rụrụ site n’aka Ya. Nwoke a, ọ bụghị nwa kapịnta, nwa Meri, na nwanne Jemis, na Josef, na Judas, na Saịmọn?

Ụmụnne Ya ndị nwanyị, ọ bụ ha anọghị n’ebe a n’etiti anyị?” Ha wee hie ụzọ n’okwukwe ha, jụ ịnabata Ya. Jesu wee sị ha: “Onye amụma nwere nsọpụrụ ebe ọ bụla ma e wepụ n’ala nna ya, n’etiti ndị ikwu na ibe ya, na n’obi nna ya.”

N’ihi ekweghị ekwe ha, O nwezighị ike ịrụ ọrụ ebube ọ bụla n’ebe ahụ, ma e wepụ na O bikwasịrị ndị ọrịa olemole aka Ya, wee mee ka ahụ ha dị ike. Ekweghị ekwe ha wee juu Ya anya.

Igbo Mass Readings for July 8 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume

Igbo Mass Readings for July 7 2024, Ụka nke Iri na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023