Igbo Mass Readings for July 30 2023, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 30 2023, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:5, 7-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Ndị Eze

Isi Okwu: Ịrịọrọ ka e nye gị onyinye nke ịkpa oke n’etiti mma na njọ.

Na Gibiọn Onyenweanyị jiri abalị bịakwute Solomọn na nrọ. Chineke sịrị ya: “Rịọ M ihe ọ bụla ị chọrọ ka M nye gị.” Solomọn zara Ya: “Biko Onyenwe m, Chineke m, I chiela m bụ nwodibo Gị eze, m nọchie n’ọnọdụ nna m Devid.

Ma abụ m nwantakịrị. Amabeghị m ihe m ga-eme. Ana m agbara Gị odibo n’etiti agbụrụ ahụ Ị họtara ahọta, ndị ahụ karịrị agụta agụta n’ọnụ ọgụgụ. N’ihi ya, nyenụ nwodibo Gị akara obi e ji aghọta ihe, ka m wee chịzie ndị nke Gị nke ọma, wee chọpụta ihe dị iche n’etiti ihe ọma na ihe ọjọọ.

Maka na onye pụrụ ịchịkwata ndị nke Gị a bụ agụta agụta?” Arịrịọ a Solomọn rịọrọ masịrị Onyenweanyị. Chineke ewee sị ya: “Ebe ọ bụ na ị rịọghị M ka i nwee ogologo ndụ; ị rịọghị m akụ na ụba.

Ị rịọghịkwa ka e wepụ ndụ ndị iro gị, kama ị rịọrọ ka e nye gị nghọta ime ihe dị mma. N’ihi ihe a ị rịọrọ, aga M emere gị ihe ị rịọrọ. Aga M enye gị obi amamihe na nghọta nke mmadụ na-enwebeghị kemgbe ụwa bidoro; nke mmadụ na-agaghịkwa enwe ruo na ngwụcha ụwa.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 118:57, 72, 76 -77, 127-130. Az. 97

Azịza: Onyenweanyị ahụrụ m iwu Gị n’anya.

1. Onyenweanyị, ekwuru m na oke m ketara bụ idebe okwu Gị.

Okwu si Gị n’ọnụ dara oke ọnụ n’anya karịa nde nde ọlaọcha na olaedo. Azịza.

2. Ka obi ọma Gị kasie m obi dịka nkwa I kwere ụmụ odibo Gị si dị.

Ka obi ebere Gị bịakwute m ka m wee biwe ndụ, maka na iwu Gị na-amasị m. Azịza.

3. N’ihi na ahụrụ m atụmatụ Gị n’anya karịa ọkachamma dị n’ọla edo.

Ebe ọ bụ na echere m ihu n’usoro iwu Gị, akpọrọ m ụzọ ọjọọ ọ bụla asị. Azịza.

4. Iwu I tiiri anyị dị egwu. Ọ bụ ihe kpatara m ji edebe ha. Ikpughe okwu Gị na-agba ihe niile n’anwụ, bịakwa na-enye ndị umeala ezi nghọta. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:28-30

Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Pọl asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Chineke chọrọ ka anyị, ghọọ ezigbo onyinye nke Nwa Ya.

Anyị ma na ihe niile na-arụkọ ọrụ maka ọdịmma nke ndị hụrụ Chineke n’anya; ndị ahụ hụrụ Chineke n’anya bụ ndị Ọ kpọrọ dịka nzube Ya si dị. Ndị ahụ Ọ maara n’isi mbido, ka O kenyere akara aka nke iketa oke n’oyiyi nke Nwa Ya, Nwa wee bụrụ onye buru ụzọ mụ, n’etiti ọtụtụ ụmụnna.

Ọ bụ ndị ahụ O nyere ụdị akara aka ahụ ka Ọ kpọrọ. Ọ bụkwa ndị ahụ Ọ kpọrọ ka Ọ gụnyere na ndị ezi omume. Ndị ahụ Ọ gụnyere na ndị ezi omume bụ ndị O nyere otito.

MBEKU – Eph. 1,17-18

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, meghee obi anyị ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.

Aleluya!

OZIỌMA – 13:44-52 maọbụ 13:44-46

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: O rere ihe niile o nwere wee zụrụ ala ubi ahụ.

Jesu gwara igwe mmadụ okwu sị: “Alaeze eluigwe dị ka akụ nke e zoro n’otu ala ubi. Mgbe otu nwoke hụrụ akụ ahụ, o kpuchiri ya ihe. O wee were ọñụ laa, ree ihe niile o nwere, bịa zụrụ ala ubi ahụ. “Ọzọ, Alaeze eluigwe dị ka onye na-azụ ahịa nke na-achọ nkume dara oke ọnụ ahịa.

Mgbe ọ hụrụ ụdị nkume ahụ dara oke ọnụ ahịa, o wee laa n’ụlọ ya, rechaa ihe niile o nwere, wee zụta nkume ahụ dara oke ọnụ ahịa. [“Alaeze eluigwe dịkwa ka ụgbụ a wụnyere n’osimiri.

Ụgbụ ahụ wee kpokọta ụdị ihe dị iche iche. Mgbe ụgbụ ahụ juru, ndị ọkụ azụ dọpụta ya, debe ya n’akụkụ mmiri. Ha wee nọdụ ala na-etinye ihe bara uru n’okpokoro, bịakwa wufuo ihe na-abaghị uru. “Otu a ka ọ ga-adị n’ọgwụgwụ oge.

Ndị mmụọ ozi ga-apụta, kewapụta ndị ajọ omume n’etiti ndị ezi omume. Ha ga-enuba ndị ajọ omume n’oke ọkụ na-ere gidigidi, ebe ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adị.”

Jesu wee jụọ ha sị: “Ụnụ ghọtakwara ihe niile a M kwuru?” Ha wee zaa Ya, sị “E.” O wee sị ha: “Onye ode-akwụkwọ ọ bụla e nyere ọzụzụ maka alaeze nke Chineke dị ka nna nwe ụlọ nke na-esi n’ụlọ-akụ ya na-ewepụta ihe ochie na ihe ọhụrụ.”

Igbo Mass Readings for July 31 2023, Mọnde Izuụka nke Iri na Asaa N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for July 30 2023, Ụka nke Iri na Asaa n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 4, 2023