Igbo Mass Readings for August 3 2025, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 3 2025, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:2; 2:21-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Eklezịastes

Isi Okwu: Gịnị ka mmadụ ritere na ndọkasị ahụ niile n’ụwa a?

Ihe niile buụ ihe efu, Onye nkwusa kwuru sị: ihe niile gbasara ndụ enweghị isi, ha abaghị uru, ha bụ nnọọ ihe efu. Ọ bụ ezie na m ji amamihe m na nghọta m na mmụta m rụsie ọrụ ike rụpụta ihe, ihe ndị a niile ka m ga-ahapụrụ onye ọzọ, onye na-arụghị ọrụ ọ bụla na ndụ ya; uru mgbalị m niile ka ọ ga-eketa, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.

Ihe ndị a abụghị naanị nzuzu, kama ha bụ ihe na- ekwesịghị ekwesị. Bịa dị, gịnị bụ uru mmadụ na-enweta na ndọgbu niile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ? Ụbọchị ya niile bụ naanị ihe mgbu na iru ụjụ, izuike adịkwaraghị ya. Abalị niile, ọ na-anọ n’ịsụ ude. Ihe ndị a juru m anya, ha bụkwa ihe efu.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 94:1-2, 6-9 Az. 7-8

Azịza: Taa ụnụ nụrụ olu Ya, ụnụ emekwala obi ụnụ ka Ọ kpọọ nkụ.

1. Bịanụ ka anyi tiere Dinwenụ mkpu ọñụ;

k’anyị ñụrịa na Chineke Onye Nzọpụta anyị.

Ka anyị bịa n’ihu Ya nye Ya ekele;

ka anyị were ukwe too Ya. Azịza.

2. Bịanụ ka anyị sekpuoro Ya bịakwa kpọrọ Ya isi ala.

Ka anyị sekpuru ala n’ihu Onyenweanyị, onye kere anyị.

N’ihi na ọ bụ Chineke anyị.

Anyị bụkwa ndị Ọ na-azụ ka atụrụ,

bịakwa bụrụ igwe atụrụ Ọ na-eduzi ụzọ. Azịza.

3. Ewoo! Ma ọ bụrụ na ụnụ anụ olu Ya taa;

Ụnụ agbachikwala obi ụnụ dịka na Meriba;

dịka n’ụbọchị ahụ na Masa n’ime ọzara,

ebe nna nna ụnụ ha nọrọ leghaa M.

E leghara ha M, ma ọ bụ ezi okwu na ha ahụla ọrụ M. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:1-5,9-11

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi

Isi Okwu: Chọwanụ ihe nke dị n’eluigwe, ebe Kristi nọ.

Ọ bụrụ na ụnụ esorola Kristi kulite n’ọnwụ, chọwanụ ihe nke dị n’eluigwe, ebe Kristi nọ n’aka nri Chukwu Nna. Ka echiche ụnụ niile bụrụ maka ihe nke eluigwe; ụnụ echezina echiche maka ihe nke ụwa a; n’ihi na ụnụ anwụọla, ndụ ụnụ dị ugbu a bụ ndụ e zowere na Kristi n’ime Chineke.

Mgbe Kristi, onye bụ ndụ anyị, ga-achawapụta ihe, ụnụ onwe ụnụ ga-eso Ya chawapụta n’ebube. Gbupịanụ ihe niile dị n’ime ụnụ gbara mgbọrọgwụ n’ihe ụwa a: ịkwa iko, njọ ruru inyi, agụụ ihe rụrụ arụ, ụdị ụtọ anụ ahụ nke ahụ a ga-agụnye n’ife arụsị.

Kwụsịnụ ịtụrụ ibe ụnụ asị. Ihe e mere bụ na e yipụla onwe ụnụ nke ochie na njọ niile e ji mara ya; ụnụ abịakwa yiri onwe ụnụ nke ọhụrụ, nke na-eto na mmụta, ebe a na-akpụ ya n’oyiyi nke Onye Ahụ Kere ya.

Isi ya bụ na e nwekwaghị ngụbọsị na onye a bụ onye Grik ma ọ bụ onye Juu; onye e biri ugwu ma ọ bụ onye a na-ebighị ugwu; onye mba ọzọ, ma ọ bụ onye Sintịa, ma ọ bụ ohu ma ọ bụ onye nwe onwe ya. Kristi bụ ihe niile dị n’ime ụnụ niile!

MBEKU – Jọn 17:17

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, okwu Gị bụ eziokwu. Were eziokwu Gị doo anyị nsọ.

Aleluya!

OZIỌMA – 12:13-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Ihe niile ndị a ị na-ekpọkọba, onye ga-eri ha?

Otu onye n’ime igwe mmadụ ahụ gwara Jesu, sị: “Onye nkuzi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke ruuru m n’ihe nna anyị hapụụrụ anyị wee laa mmụọ”. Ma Jesu sịrị ya: “Nwoke m, onye nyere m ike ikpebi, ma ọ bụ ikere gị na nwanne gị nwoke akụ na ụba dị n’obi nna gị?”

Jesu wee gwa igwe mmadị ahụ sị: “Kpacharanụ anya! Zerekwanụ inwe anya ukwu n’ụdị ọ bụla. N’ihi na akụ na ụba mmadụ anaghị egbochiri mmadụ ọnwụ.” Jesu wee tụọrọ ha ilu sị: “Ala ubi otu ọgaranya mịrị nnọọ ezi mkpụrụ.

Ọ bịa chewe n’obi ya sị: ‘Gịnị ka m ga-eme, n’ihi na ọba m nwere agaghị abacha ihe niile m mịịrị m n’ala ubi m?” Ọ garanya ahụ wee kpebie sị: “Lee ihe m ga-eme.

Aga m akwatu ọba m ndị nke ochie, bịakwa wugharịa ndị nke ka ha ibu. Ebe ahụ ka m ga-ekpokọta ọka m na ihe ọma niile m wetara n’ubi. Mgbe ahụ ka m ga-asị onwe m: ‘Onye ụwa ọma! I nweela akụ na ụba ga-ezuru gị ọtụtụ afọ na-abịa n’ihu.

Kwụsị ịdọgbu onwe gị n’ọrụ. Zuru ike. Rie nri, ñụọkwa ihe ọñụñụ, mee ka obi tọọ gị ụtọ. Nchegbu ọ bụla adịkwaghị nye gị.” Ma Chineke sịrị ọgaranya ahụ: Onye iberibe!

N’abalị taa, ka m ga-anarakwa gị ndụ ahụ m nyere gị. Akụ na ụba niile a ị kpakọrọ onye ga-eri ya?” Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọ bụla na-akpakọrọ onwe ya akụ na ụba nke ụwa a, ma ghara ime onwe ya ọgaranya n’ihu Chineke.

Igbo Mass Readings for August 4 2025, Mọnde Izuụka nke Iri na Asatọ N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for August 3 2025, Ụka nke Iri na Asatọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Last Update: July 8, 2023