Igbo Mass Readings for June 28 2026, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 28 2026, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 4:8-11, 14-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Ndị Eze
Isi Okwu: Onye a bụ onye nsọ Chineke. Ya zuru ike ebe ahụ.
Otu ụbọchị, Elisha bịara na Shunem ebe otu nwanyị nwere akụ hie nne bi. Nwanyị ahụ rịọrọ ya ka ọ bịa rie nri n’ụlọ ya. Mgbe ọ bụla Elisha na-agafe, ọ na-akwụsị na be nwanyị ahụ rie nri.
N’ihi ya ka nwanyị ahụ ji gwa di ya: “O doro m anya na nwoke a bụ onye nsọ nke Chineke. Ebe ọ bụ na ọ na-abịakwute anyị ugboro ugboro, ka anyị meziere ya otu ọnụ ụlọ n’ime ụlọ elu anyị, bịakwa tinyere ya otu akwa-ndina, oche ukwu na ochenta na mpanaka, ka o wee bụrụ na mgbe ọ bụla ọ bịakwutere anyị, ọ ga-anọ ebe ahụ.
Otu ụbọchị ọzọ Elisha bịakwara Shunem gaa n’ọnụ ụlọ ahụ izu ike. E mechaa, Elisha jụrụ sị: “E nwere ihe a ga-emere nwanyị a? Gehazi zara sị: “E-e, o nweghị nwa nwoke.
Di ya aghọọla agadi”. Elisha sị: “Kpọọ ya”. Mgbe a kpọrọ ya, ọ bịara guzo n’ọnụ ụzọ. Elisha wee kwe ya nkwa sị: N’oge ugbu a n’afọ ọzọ, Ị ga-eku nwa nwoke n’aka gị”.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 89:2-3, 16-17, 18-19
Azịza: Aga m ekwe ukwe ịdịmma nke Onyenweanyị ruo mgbe ebighị ebi.
1. Aga m ekwe ukwe amara nke Onyenweanyị ruo mgbe ebighị ebi.
Site na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,
ọnụ m ga-ekwupụta na I kwesịrị ntụkwasị obi.
N’ihi na I kwuru sị: “E hiwere obi ọma M ruo mgbe ebighị ebi”.
I mere ka idebe nkwa I kwere guzosie ike n’igwe. Azịza.
2. Ngọzi dịrị ndị ma maka mkpu añụrị ahụ Onyenweanyị,
ha na-aga n’ìhè nke ihu Gị.
Ha na-añụrị ọñụ n’aha Gị bido na chi ọbụbọ ruo na chi ojiji.
Ọ bụkwa ikpe nkwụmọtọ Gị na-ewelite ha elu. Azịza.
3. Maka na Ị bụ ebube nke mgbasike ha nwere.
Ọ bụ site n’amara Gị ka anyị ji eweli mpi elu.
N’ihi na ọ bụ Onyenweanyị nwe ichedo anyị.
Nchedo anyị nọ n’aka eze anyị na onye dị nsọ nke Izrel. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 6:3-4,8-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom.
Isi Okwu: Mgbe e mere anyị mmirichukwu, e likọdoro anyị na Kristi; ka anyị wee dịba ndụ ọhụrụ.
Akụziiri ụnụ na, mgbe e mere anyị mmirichukwu n’ime Kristi Jesu, e mere anyị mmirichukwu n’ime ọnwụ Ya. Ihe ọ pụtara bụ na, mgbe e mere anyị mmirichukwu, anyị soro Ya banye n’ime ili; e jikọrọ anyị na Ya n’ọnwụ Ya; ka o wee bụrụ na, otu e si were ebube Nna, si na ndị nwụrụ anwụ bilite Kristi, otu ahụ kwa ka anyị ga-esi na-ebi ndụ ọhụrụ.
Ma okwukwe anyị kwuru, na ebe anyị soro Kristi nwụọ, anyị ga-esokwa Ya adị ndụ ọzọ. Dịka anyị si mara, ebe ọ bụ na Kristi ebilitela n’ọnwụ, O nweghị ike ịnwụkwa ọzọ.
Ọnwụ enweghịkwa ike ọ bụla n’ebe Ọ nọ. Mgbe ọ nwụrụ, O jiri otu ịnwụ ọnwụ maka njọ, nwụchie ụzọ ọnwụ; nke pụtara na ndụ Ọ dị ugbu a, bụ ndụ a dịịrị Chineke. N’otu aka ahụ kwa, ụnụ ga-ewere onwe ụnụ, ka ndị nwụrụ anwụ maka njọ, bịakwa dịịrị Chineke ndụ n’ime Kristi Jesu.
MBEKU – Jọn. 8:12
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: ‘Abụ M ihe nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M, ga-enwe ihè ndụ.’
Aleluya!
OZIỌMA – 10:37-42
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Onye na-eburughị obe ya, ekwesịghị ekwesị maka M. Onye nabatara ụnụ nabatara M.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya: “Onye ọ bụla hụrụ nna ya, ma ọ bụ nne ya n’anya karịa M ekwesịghị ịbụ onye nke M. Onye ọ bụla na-eburughị obe ya, na-esote na nzọ-ụkwụ M, ekwesịghị ịbụ onye nke M.
Onye ọ bụla chọtara ndụ ya, ga-atufu ya. Ma onye ọ bụla tufuru ndụ ya n’ihi M, ga-achọta ya. “Onye ọ bụla nabatara ụnụ, nabatara M. Onye ọ bụla nabatara M, nabatara Onye ahụ zitere M.
Onye ọ bụla nabatara onye amụma, n’ihi na ọ bụ onye amụma, ga-enweta ụgwọ onye amụma. Onye ọ bụla nabatara onye ezi omume, n’ihi na ọ bụ onye ezi omume, ga-enweta ụgwọ onye ezi omume.
“Ọ bụrụgodu otu iko mmiri oyi ka mmadụ kụnyere otu n’ime ụmụntakịrị ndị a, maka na ọ bụ Nwaazụ M, n’ezie, asị M ụnụ; o nweghị ihe ga-eme ka mmadụ ahụ ghara ịnata ụgwọ ya.”
Igbo Mass Readings for June 29 2026, Emume nke Pita na Pọl dị Asọ