Igbo Mass Readings for June 30 2024, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 30 2024, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 1:13-15; 2:23-24
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: Ọ bụ ekworo nke ekwensu butere ọnwụ n’ụwa.
Ọnwụ abụghị ihe Chineke mere. Imebi ihe dị ndụ anaghị amasị Ya. O kere ihe niile ka ha wee dị. Ihe niile e kere eke n’elu ụwa bụ ihe na-amụba ndụ n’ime ha.
O nweghị nke ọ bụla n’ime ha e nwere ike ịchọta nsi na-egbu egbu. Ala mmụọ adịghị ebe ọ bụla n’elu ụwa. Maka na ike ezi omume bụ anwụ anwụ. Chineke mere mmadụ ka ọ bụrụ anwụ anwụ.
O mere mmadụ n’oyiyi nke Ya bụ Chineke. Ma ọ bụ ekworo nke ekwensu, butere ọnwụ n’ụwa. Ndị otu ekwensu ga-achọpụta ụfụ ọnwụ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 30:2, 4-6, 11-13
Azịza: Onyenweanyị, aga m eto Gị, n’ihi na Ị zọpụtala m.
1. Onyenweanyị, aga m enye Gị nnukwu otito n’ihi na Ị zọpụtara m nke ọma.
I kweghị ka ndị iro chịa m ọchị.
Onyenweanyị, ọ bụ n’ala mmụọ ka isi kpọpụta m;
bịakwa chekwaba m, ka m ghara ịdị ka ndị e liri n’aja. Azịza.
2. Ụnụ bụ ndị kwerenụ, kweerenụ Onyenweanyị ukwe otito.
Nyenụ aha nsọ Ya ekele.
N’ihi na iwe Ya na-abụ sọ otu ntabi anya.
Ma obi ọma Ya na-esi na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ.
N’anyasị, ịkwa akwa ga-abata.
Ma ọñụ ga-adị na chi ọbụbọ. Azịza.
3. Biko Onyenweanyị, nụrụ, mekwaara m amara.
Biko Onyenweanyị bụrụ onye enyemaka m.
Ị gbanwoola iru ụjụ m ka ọ ghọọ ọñụ.
Biko Onyenwe m na Chineke m,
aga m enye Gị ekele mgbe ebighị ebi. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:7, 9, 13-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ebe ụnụ nwere hie nne, nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
Ụnụ bakariri ndị ọzọ n’ụba n’ihe nile – ma n’okwukwe, mana ikwuwa okwu, ma n’ịghọta ihe, ma n’inwe ịnụ ọkụ n’obi maka ihe ọ bụla, ma n’iketa oke kacha ibe ya n’ịhụnanya anyị.
N’ihi ya, anyị na-atụ anya, na ihe ụnụ ga-enye n’onyinye obi ọma nke a, ga-akarị nke ndị ọzọ. Chetanụ ka obi ọma Onyenweanyị Jesu si buo ibu! Ọ bụ ọgaranya dara ogbenye n’ihi anyị; ka O wee mee ka anyị si n’ịda ogbenye anyị, ghọọ ọgaranya.
Nke a apụtaghị na m chọrọ ka ụnụ nye n’ụzọ ihe ga-esi siere ụnụ ike n’ihi na ụnụ nyere. Kama, ebe ụnụ nwere hie nne ugbu a, ọ bụ ịhe dị mma ka ụnụ nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
Mgbe ụnụ ga-anọkwa na mkpa ha ga-enyere ụnụ aka ma ha nwee hie nne. N’ụzọ dị otu a onye ọ bụla ga-enwe ihe dị ya mkpa. Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Nwoke ahụ chịkọtara hie nne agaghị enwe karịa. Nwoke ahụ chịkọtara ihe dị nta ga-enwezukwa ihe ọ chọrọ.”
MBEKU – Jọn. 17:17
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ ezi okwu. Were ezi okwu Gị doo anyị nsọ.
Aleluya!
OZIỌMA – 5:21-43 ma ọ bụ 5:21-24, 35-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Isi Okwu: Nwa agbọghọ, asị m gị kulie.
Mgbe Jesu jichara ụgbọ mmiri kụfee n’ofe osimiri, nnukwu igwe mmadụ gbara Ya gburugburu, n’ebe Ọ nọ n’agịga mmiri. Otu n’ime ndị na-achị ụlọ nzukọ ndị Juu, onye a na-akpọ Jairọs bịara, hụ Ya, daa n’ụkwụ Ya; were obi ya niile na-arịọ Ya sị: “Nwa m nwanyị nke ntakịrị dara nnukwu ọrịa.
Biko bịa bikwasa ya aka, ka ọ dịhị, nwetakwa ume ndụ”. Jesu sooro Ya. Nnukwu igwe mmadụ nudoro sowe Jesu, na-akpagide Ya ebe niile. [Ma e nwere otu nwanyị na-arịa ọrịa ohuhu-ọbara kemgbe afọ iri na abụọ.
O teela nwanyị a gwọwara onwe ya, n’aka ndị dibịa dị iche iche. Ihe niile ọ kpatara agwụla, ebe ọ na-agwọ onwe ya. Kama ọrịa ga-adị mma, ọ na-aka njọ.
Ọ nụla maka Jesu, wee si n’azụ, ebe ahụ igwe mmadụ juru, bịa metụ Ya aka n’uwe. Maka na o kwuru n’obi ya sị: “Ọ bụrụgodụ uwe Ya ka m nwere ike imetụ aka, ahụ ga-adị m mma”.
Ihe niile mekwara dị ka nwanyị a si chee ya n’obi ya. N’ihi na mgbe o metụrụ Jesu aka ọbara ahụ kwụsịrị ịgba. Ọ matakwara na ahụ adịla ya mma. Mgbe ahụ kwa ka o metụrụ Jesu n’ahụ na ike esila n’ime Ya pụọ.
Ọ tụgharịrị n’etiti igwe mmadụ ahụ, jụwa, sị: “Onye metụrụ uwe M aka”? Ụmụazụ Ya sịrị Ya: “Ị hụrụ ebe igwe mmadụ kpagidere Gị, wee na-ajụ sị: “Onye metụrụ M aka?”
Ma Ọ nọgidere na-elegharị anya ebe niile, ka Ọ hụ onye mere ihe ahụ. Mgbe ahụ ka nwanyị ahụ ji mara jijiji, ebe ụjọ ji ya, wee gbagote; maka na ọ ghọtara ihe mere ya n’ahụ.
Ọ bịara daa n’ala n’ụkwụ Jesu, wee gwa ya ezi okwu niile. Ma Jesu sịrị ya: “Nwa M nwanyị, okwukwe gị agwọọla gị. Ngwa, lawa n’udo! Bụrụkwa onye nweere onwe ya site na ọrịa].
Mgbe Ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ndị si na be onye ọchịchị ụlọ nzukọ ahụ, bịara sị: “Nwa gị nwanyị anwụọla. Ọ dịkwa mkpa ọzọ isogbu Nna anyị ukwu?” Mgbe Jesu nụrụ ozi ahụ, Ọ gwara onye ọchịchị ahụ sị: “A tụla egwu!
Naanị ihe ị ga-eme bụ inwe okwukwe!” O kweghị ka onye ọ bụla ọzọ soro Ya jee, ma ọ bụghị Pita, Jemis na nwanne Jemis bụ Jọn. Mgbe ha bịaruru n’ụlọ onye ọchịchị ahụ, Jesu nụrụ ụzụ na mkpọtụ; ndị na-akwa akwa, na ndị na-eti mkpu ka o si dị mma.
Ọ banyere sị ha: “Gịnị ka ụnụ na-emere mkpọtụ, na-akwa akwa, na-eti mkpu? Nwata ahụ anwụghị anwụ. Ọ na-arahụ ụra.” Ma ha chịwara Ya ọchị. O wee chụpụsịa ha, kpọrọ nne na nna nwata ahụ, na Ụmụazụ Ya, wee banye ebe nwata ahụ dina.
O selitere nwata ahụ n’aka, sị ya: “Talịta kum“, nke pụtara, “Nwa agbọghọbịa, asị M gị, kulie”. Nwata nwa agbọghọbịa ahụ kuliri mgbe ahụ, bido na-agagharị. Ọ bụ nwata gbara afọ iri na abụọ.
Egwu bịara jide onye ọ bụla. Jesu dọrọ ha aka na ntị, ka ha ghara ime ka onye ọ bụla mata maka ya; bịakwa gwa ha, ka ha nye nwata ahụ nri ka o rie.
Igbo Mass Readings for July 1 2024, Mọnde Izuụka nke Iri na Atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for June 30 2024, Ụka nke Iri na atọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.