Igbo Mass Readings for July 16 2023, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 16 2023, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 55:10-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Mmiri ozuzo na-eme ka ihe a kụrụ n’ala tolite
Onyenweanyị kwuru sị: Otu ahụ mmiri ozuzo na akụ mmiri igwe si esi n’igwe agbadata n’alaghachighị azụ wee ruo mgbe o mere ka ala doro mmiri; ka ọ ghọọ ala na-eme nri na-amịtakwa mkpụrụ akụkụ, nke na-enye onye ọrụ ugbo mkpụrụ ọ ga-agha, bịakwa nye ori nri ihe oriri.
Otu ahụkwa ka okwu si M n’ọnụ pụta na-adị. Ọ naghị agba aka alaghachikwute M, n’ebughị ụzọ mezuo ihe M chọrọ, bịakwa rụchaa ọrụ ahụ M zigara ya ka ọ rụọ.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 64:10-14, Az. Luk 8:8
Azịza: Ụfọdụ mkpụrụ dara n’ala ọma mịtara mkpụrụ mmaji kwuru mmaji
1. I letala ala ahụ bịakwa husa ya mmiri.
I meela ka ọ baa ụba hie nne.
Mmiri iyi nke Chineke jupụtara na mmiri.
Ọ bụkwa Gị kwadoro nri ọka. Azịza.
2. Otu ahụ kwa ka I si dozie ala ha.
I mere ka mmiri jupụta ọbụ niile,
bịakwa mee ka mkpumkpu ala niile dị larịị.
Ọ bụ Gị gọziri ihe ala mịtara. Azịza.
3. I jiri ihe ọma kpube afọ okpueze.
Okporo ụzọ Gị na-atasisi abụba.
Ọhịa nta jupụtakwara n’abụba Gị.
Ọnụ ka ugwu jiri kwara uwe. Azịza.
4. Ọhịa yikwasara igwe atụrụ ka uwe.
Ọka kpuchiri ndagwurugwu niile.
Ha na-eti mkpu ọñụ na-ekwe ukwe. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:18-23
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-eche mgbe a ga-eme ka ndị bụ ụmụ Chineke pụta ihe.
N’ihi na echere m na ahụhụ nke oge a erughị n’ụzọ ọ bụla ịtụnyere nnukwu ebube nke Chineke ga-ekpughere anyị. N’ihi na ihe niile e kere eke ji oke agụụ na-echere mgbe a ga-eme ka ndị bụ ụmụ Chineke pụta ihè.
N’ihi na Chineke doro ihe niile e kere eke ka ihe efu. Ọ bụghị site n’ọchịchọ nke ihe e kere eke, kama, n’ihi na Chineke chọrọ ka ọ dị otu ahụ. Ma olile anya ya bụ nke a: Na otu ụbọchị ihe niile e kere eke ga-enwere onwe ha, pụọ n’agbụ nke ire ure, wee sonye n’inwere onwe ya ahụ dị ebube nke ga-adịrị ndị bụ ụmụ Chineke.
N’ihi na anyị ma na ruo ugbu a, ihe niile e kere eke jikọrọ ọnụ na-asụ ude, dịka nwanyị ime na-eme. Ọ bụghị naanị ihe e kere eke. Anyị onwe anyị kwa, bụ ndị nwetara mkpụrụ mbụ nke Mmụọ Nsọ, na-asụkwa ude n’ime mmụọ, na-atụ anya mgbe a ga-agbapụta ahụ anyị.
MBEKU – Jọn 6, 63. 68
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, okwu Gị bụ mmụọ na ndụ. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.
Aleluya!
OZIỌMA – 13:1-23 ma o bu 13:1-9
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Onye ọrụ ugbo gara ịgha mkpụrụ akụkụ.
Jesu hapụrụ ụlọ ahụ gaa n’ọnụ mmiri ebe ọ nọdụrụ ala na-ezi ndị mmadụ ihe. Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya, nke mere ka ọ baa n’ime ụgbọ mmiri.
N’ime ya ka ọ nọ na-ezi ndị mmadụ nọ n’ọnụ mmiri ahụ na-ege ya ntị ihe. O ji ilu gwa ha ọtụtụ ihe. Ọ gwara ha sị, “O nwere otu onye ọrụ ubi gara ịgha mkpụrụ n’ubi ya.
Mgbe Ọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ n’ime ha dara n’akụkụ ụzọ ebe ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo. Ma ụfọdụ n’ime ha dara n’ala dị nkume nkumne.
Ọ dịghị anya ha pupụtara, too, n’ihi na aja dị ebe ahụ emighị emi. Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, n’ihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu n’ime ala.
Mkpụrụ ụfọdụ danyere n’ala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha topụtara, ogwu ahụ kpagburu ha. Ma ụfọdụ mkpụrụ danyere n’ezi ala, mịakwa ọtụtụ mkpụrụ.
Ụfọdụ mịrị iri mkpụrụ atọ, ụfọdụ iri mkpụrụ isii, ụfọdụ kwa narị mkpụrụ. Onye nwere ntị ya nụrụ.” E mesịa, ndị Ụmụazụ ya bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Gịnị mere iji na-agwa ndị a okwu n’ilu?”
Jesu zara ha sị, “Naanị ụnụ ka dịịrị ịghọta ihe omimi nke alaeze Chineke. Emeghị ka ndị ọzọ ghọta ya. N’ihi na onye ahụ nwere ihe ka a ga-enyekwa ọzọ, ka o nweta hie nne.
Ma onye na-enweghị ihe ọ bụla ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe o nwere. Ana m agwa ha okwu n’ilu n’ihi na ọ bụ ezie na ha nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ.
Ọ bụkwa ezie na ha na-anụ ihe m na-ekwu ma ha adịghị aghọta ya. Nke a bụkwa imezu amụma ahụ Aịzaya buru sị, “Ha ga-anụ, nụkwa, ma ha agaghị aghọta.
Ha ga-ele anya, leekwa anya ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla. N’ihi na obi ha gbara abụba, dịkwa arọ. Ha mechiri ntị ha, ka ha ghara ịnụ ihe. Ha mechikwara anya ha, ka ha ghara ịhụ ụzọ.
Ha mechiri obi ha, ka ha ghara ịghọta ma tụgharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.” Ma a gọziri anya ụnụ na ntị ụnụ agọzi, n’ihi na ha na-ahụ ụzọ na-anụkwa ihe.
N’ihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-agwa ụnụ sị, ọtụtụ ndị amụma na ndị ezi omume ka ọ gụrụ agụụ ịhụ ihe ndị a anya ụnụ na-ahụ ugbu a, ma ha enweghị ike.
Ugbu a geenụ ntị mgbe m na-akọwara ụnụ ihe banyere ilu onye ọrụ ubi ahụ nke gara ghaa mkpụrụ n’ubi ya. Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke.
Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara n’ụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndị nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya.
E mesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ n’obi. Mkpụrụ nke dara n’ala nkume nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, jirikwa oke ọñụ nabata ya.
Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara n’ime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara n’ihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.
Mkpụrụ nke dara n’ala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi n’akụ nke ụwa, kpagidere okwu dị n’ime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ.
Ma mkpụrụ dara n’ala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị n’ozi ọma ahụ, ghọtakwaa ya. Ọ na-apụ kpọta iri mmadụ anọ, ma ọ bụ iri mmadụ isii, ma ọ bụ narị mmadụ, ndị a ga-eme ka ha baa n’alaeze ahụ.”
Igbo Mass Readings for July 17 2023, Mọnde Izuụka nke Iri na Ise N’Oge Nkịtị