Igbo Mass Readings for July 14 2024, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 14 2024, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 7:12-15

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Emọs

Isi Okwu: Gaa, buoro ndị nke m amụma

Amazịa, Onye nchụaja nke Betel wee sị Emọs: “Nwa-ọhụ-ụzọ, ngwa laa. Gbalaa n’ala Juda. Gaa ebe ahụ buwe amụma bute ihe ị ga-eri. Ma e bukwala amụma ọzọ na Betel n’ihi na ọ bụ ebe nchụaja nke eze, bịakwa bụrụ ụlọ nsọ nke onye eze.

Ma Emọs zara Amazịa sị: Abụghị m onye amụma. Esoghịkwa m n’otu ndị amụma. Abụ m onye nche atụrụ na onye na-achọ osisi sikamọ mma. Ma Onyenweanyị kpọọrọ m ebe m na-eso igwe atụrụ wee sị m: ‘Gaa buoro ndị nke M bụ Izrel amụma.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 84:9-14 Az, 8

Azịza: Onyenweanyị, kwe ka anyị hụ obi ọma Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

1. Aga m anụ ihe Onyenweanyị Chineke ga-ekwu,

n’ihi na Ọ ga-ekwupụta udo maka ndị nke Ya.

N’ezie, nzọpụta Ya dị ndị na-atụrụ Ya egwu nso.

Ebube Ya bi ebi n’ala anyị. Azịza.

2. Obi ọma na eziokwu ga-ezukọta.

Ikpe nkwụmọtọ na udo esutula ọnụ.

Eziokwu ga-esi n’ala epulite.

Ikpe nkwụmọtọ wee si n’eluigwe na-eledata anya. Azịza.

3. Onyenweanyị ga-emere anyị amara.

Ala anyị ga-amịta ihe mmaji kwuru mmaji.

Ikpe nkwụmọtọ ga-ebute ụzọ na-aga.

Nzọpụta wee na-esota na nzọ ụkwụ ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 1:3-14

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Efesọs

Isi Okwu: Tupu Chineke atọọ ntọala, Ọ họpụtara anyị.

Ekele dịrị Chineke na Nna nke Onyenweanyị Jesu Kristi. N’ihi na O sitere n’ebe kachasị elu nke eluigwe, were ngọzi niile nke Mmụọ Nsọ, gọzie anyị n’ime Kristi.

Tupu Chineke atọọ ntọala ụwa, Ọ họpụtara anyị n’ime Kristi ịbụ ndị nke Ya: ka anyị wee dịịrị Ya nsọ, bụrụkwa ndị na-enweghị ntụpọ n’ihu Ya. N’ihi oke ịhụnanya Chineke, Ọ kara ya aka na mbụ, na Ya ga-eme ka anyị bụụrụ Ya ụmụ, site n’aka Jesu Kristi.

Nke a bụ ọchịchọ Ya na otu O si dị Ya mma n’obi. Ya mere, ka anyị toonụ Chineke n’ihi amara Ya dị ebube, nke Ọ wụkwasịrị anyị n’efu n’ime Nwa Ya Ọ hụrụ n’anya!

E jiri ọbara Kristi gbapụta anyị n’ịbụ ohu. Ọ bụkwa n’ime Kristi ka a gbaghaara mmehie anyị niile. Ụba amara nke Chineke nyere anyị ebuka! O jiri oke amamihe mee ka anyị ghọtazuo ihe omimi ahụ; nke bụ atụmatụ Ọ kwadebere na Kristi.

Atụmatụ Ọ ga-emezu mgbe oge zuru, nke bụ, ịchịkọta ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’elu ụwa n’okpuru Kristi. [Ọ bụ n’ime Kristi ka a họọrọ anyị. N’ihi na site na mbụ Chineke kara ya aka, bịakwa họpụta anyị na anyị bụ ndị ọ manyerela inye Ya otito, ebe ọ bụ na anyị bụ ndị mbụ chekwubere na Kristi.

Chineke ji aka Ya na- emezu ihe niile, dịka ntụpụta na nzube nke ọchịchọ Ya si dị. Ọ bụkwa n’ime Kristi ka a họọrọ ụnụ, mgbe ụnụ nụrụ okwu nke eziokwu ahụ na mbụ, bụ Oziọma nke wetaara ụnụ nzọpụta, nke pụtara na ụnụ kwesiri ike na Kristi.

Chineke jikwara Mmụọ Nsọ, nke O kwere anyị na nkwa, kaa ụnụ akara. Mmụọ Nsọ n’onwe Ya bụkwa Onye ga na-ahụ na anyị nwetazuru ihe niile Chineke kwere anyị na nkwa ruo mgbe Chineke gbapụtasịrị ndị nke Ya, ka e wee too ebube Ya].

MBEKU – Jọn 10.27

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị kwuru sị: Atụrụ m na-anụ olu M. Ama M ha. Ha na-esokwa M.

Aleluya!

OZIỌMA – 6:7-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị nsọ nke Mak dere

Isi Okwu: Ọ malitere izipụ ha.

Jesu kpọrọ Ụmụazụ Ya iri na abụọ wee malite izipụ ha abụọ, abụọ; wee nye ha ike ịchụpụ na imeri ndị mmụọ ọjọọ niile. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ghara iji ihe ọ bụla n’ije ha, ma ọ bụghị naanị mkpa n’aka.

Ọ sị ha ebula nri, ma ọ bụ akpa onye ije, ma ọ bụ wụnye ego n’akpa ego ha je n’ukwu. Ma Ọ sị ha yiri akpụkpọ ụkwụ, ma onye achịkwala uwe ime abụọ.

Ọ gwakwara ha, sị: “Ụlọ ọ bụla ụnụ hụrụ onwe ụnụ n’ime ya, birinụ n’ebe ahụ, ruo mgbe ụnụ hapụrụ obodo ahụ. Ọ bụrụ na ndị bi n’obodo ọ bụla anabataghị ụnụ; ọ bụrụkwa na ha ajụ ịña ntị n’okwu ụnụ, mgbe ụnụ na-apụ n’ebe ahụ, tichapụnụ aja dị n’ọbụ-ụkwụ ụnụ, ka ọ bụrụ ihe ga-agba ha akaebe n’isi.

Ha wee palie ije, na-ekwusa mkpa ọ dị na mmadụ niile ga-echegharị. Ha chụpụrụ ndị mmụọ ọjọọ, were mmanụ tee ọtụtụ ndị ọrịa, wee mee ka ha nweta ahụ mgbasike.

Igbo Mass Readings for July 15 2024, Ncheta Bonaventure dị Asọ, Bishọp na Dọktọ

Igbo Mass Readings for July 14 2024, Ụka nke Iri na Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.

Last Update: July 3, 2023