Igbo Mass Readings for July 23 2023, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for July 23 2023, Ụka nke Iri na Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:13, 16-19
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Isi Okwu: Njọ adịghị, mgbaghara agaghị adị.
E wepụ Gị bụ onye ahụ na-elekọta ihe niile anya, o nweghị chi ọzọ dịnụ. Ọ pụtara na ọ dịghịzi mkpa, ịkọwabara onye ọ bụla, na ikpe mara onye Ị mara ikpe, n’ihi na ike Gị bụ isi iyi ebe ikpe nkwụmọtọ si apụta.
Ebe ọ bụ na ihe niile nọ Gị n’ọba aka, I ji ebere eleru ha niile anya. Maka na Ị na-egosi ike Gị, ebe a jụrụ ikwere na Ị bụ dike tozuru etozu. A bịa na ndị ma onye Ị bụ, Ị na-abara ha mba na ha ejighị akọ biri.
Ma ọ bụ eziokwu na ike niile nọ Gị n’ọba aka, I ji ebere ekpe ikpe, bịakwa were nwayọọ na-achịkwaba anyị, maka na ike na-eso Gị mgbe ọ bụla Ị chọrọ ya.
Ihe ndị a na-eme ka I jiri kuziere ndị nke Gị na ndị na-ekpe ikpe kwụ ọtọ tosiri inwekwa obi ọma. I nyekwara ụmụ Gị ohere inwe olile anya na Ị ga-ekwe ka ha chegharịa na njọ ha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 85:5-6, 9-10. 15-16 Az. 5
Azịza: Onyenweanyị, Ị dị mma bụrụkwa onye na-agbaghara mmehie
1. Onyenweanyị, Ị dị mma bụrụkwa onye na-agbaghara mmehie.
Obi ọma Gị ebuka n’ebe ndị na-akpọku Gị nọ.
Biko Onyenwe m, tọọ ntị n’ala nụrụ ekpere m.
Za m oku m na-akpọ Gị. Azịza.
2. Onyenweanyị, mba niile I kere ga-abịa kpọọrọ Gị isi ala.
Ha ga-eto aha Gị.
Maka na I buka; ọrụ Gị dị ebube.
Sọ Gị bụ Chineke. Azịza.
3. Onyenweanyị, Ị bụ Chineke onye ebere na onye amara.
Ị naghị ewe iwe ọkụ.
Ị dị egwu n’obi ọma na imezu nkwa I kwere.
Chee m ihu meere m ebere.
Were ike Gị nye nwodibo Gị. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:26-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Mmụọ Nsọ na-arịọtara anyị arịrịọ n’ụzọ okwu ọnụ na-apụghị ịkọwa.
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka n’ime adịghị ike anyị. N’ihi na anyị amaghị ka e si ekpe ekpere dịka o kwesịrị. Ma Mmụọ Nsọ n’onwe ya ji ịsụ ude, nke ọnụ na-apụghị ịkọ, na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Ma Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bu n’uche. N’ihi na Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ.
MBEKU – Jọn 15:15
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Ana m akpọ ụnụ ndị enyi M, n’ihi na emeela M ka ụnụ mara ihe niile Nna gwara m.
Aleluya!
OZIỌMA – 13:24-43 ma ọ bụ 13:24-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Hapụ ka ha abụọ towe ruo n’oge owuwe ihe ubi.
Jesu tụụrụ igwe mmadụ ilu ọzọ, sị: “Alaeze eluigwe dị ka onye ọrụ ubi kụrụ ezi mkpụrụ n’ubi ya. Ma n’otu abalị, mgbe onye ọrụ ubi ahụ nọ n’ụra, onye iro ya gara n’ubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa n’etiti ezi mkpụrụ ọka ahụ ọ kụrụ. Mgbe mkpụrụ ọka ndị ahụ bidoro ito, ahịhịa ahụ bidokwara ito.
Ma ndị na-ejere onye ọrụ ubi ahụ ozi bịara jụọ ya ajụjụ sị, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’ ‘Onye ọrụ ubi ahụ zara ha sị, Ọ bụ onye iro m kụrụ ahịhịa ndị a.’
Ndị na-ejere ya ozi sịrị, ‘K’anyị gaanụ fopụtasịa ha.’ Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, Ọ dịghị! n’ihi na mgbe ụnụ na-achọ ifopụ ahịhịa ndị ahụ, ụnụ nwere ike site n’amaghị ama fopụ ezi mkpụrụ.
Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ tokọtaa, tutuu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. N’oge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunụ ụzọ fopụtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha n’ukwu n’ukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka ndị a tinye ha n’ọba.”] Jesu tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ Mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ n’ubi ya.
Ọ bụ ezie na ha bụ mkpụrụ dịkasịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ añara, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ n’ubi.
Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-arụ akwụ ha n’alaka ya.” Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dịka ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa n’ụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.” O ge niile ka Jesu na eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu.
O nweghị oge ọ bụla Ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu. O mere nke a ka okwu ndị amụma kwuru mezuo, n’ihi na ha buru amụma sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọ bụla na-amaghị site n’oge ekere ụwa.” E mesịa, Jesu hapụrụ igwe mmadụ ahụ n’ezi baa n’ụlọ.
Ndị Ụmụazụ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru n’ubi a kụrụ ọka.” Jesu zara ha sị, “Ọ dị mma. Lee ihe nkọwa ya bụ: nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ mụ onwe m. Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ n’ubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ.
Ahịhịa ahụ puru n’ubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ekwensu. Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge.
Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị niile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị niile na-arụ ọrụ ọjọọ.
Ha ga-atụba ndị a n’ime ọkụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze. Ma ndị niile bụ ụmụ Chineke ga-enwu dị ka anyanwụ n’ime alaeze Nna ha. Ndị nwere ntị ịnụ ihe ha nụrụ!
Igbo Mass Readings for July 24 2023, Mọnde Izuụka nke Iri na Isii N’Oge Nkịtị