Igbo Mass Readings for August 9 2026, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 9 2026, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 19:9, 11-13

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mbụ nke Ndị Eze

Isi Okwu: Kwụrụ n’elu ugwu n’ihu Onyenweanyị.

Mgbe Ilaija ruru Horeb, Ugwu nke Chineke, Ọ banyere n’otu ọgba nkume ịrahụ ụra. Onyenweanyị nyere ya iwu sị ya, “Bilie, pụọ gaa guzo n’ihu m n’elu ugwu a.”

Mgbe Ilaija gara guzo n’ebe ahụ, Onyenweanyị sitere n’ebe ahụ gafee mee ka oke ifufe dị ike fekwasị ugwu ahụ. Ifufe a mere ka nkume dị n’ugwu ahụ gbawaa, ma Onyenweanyị n’onwe ya anọghị n’ime ifufe ahụ.

Mgbe ifufe ahụ gasịrị, Onyenweanyị mere ka oke ala ọma jijiji dịrị n’ugwu ahụ, ma Onyenweanyị anọkwaghị n’ala ọma jijiji ahụ. Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ dị ukwuu nwuru n’ugwu ahụ.

Ma Onyenweanyị anọghị n’ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara. Mgbe Ilaija nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo n’ọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 84:9-14 Az. 8

Azịza: Onyenweanyị mee ka anyị hụ obi ọma Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

1. Aga m anụ ihe Chineke na-ekwu,

Onyenweanyị ebe ọ bụ olu na-ekwupụta udo.

N’ezie, nzọpụta dị ndị na-atụrụ Ya egwu nso.

Ebube Ya bi ebi n’ala anyị.

Azịza: Onyenweanyị mee ka anyị hụ obi ọma Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

2. Obi ọma na ezi okwu ezukọọla.

Ezi omume na udo ebiela ọma.

Ezi okwu ga-esi n’ala epulite.

Ezi omume wee si n’igwe ledata anya.

Azịza: Onyenweanyị mee ka anyị hụ obi ọma Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

3. Onyenweanyị ga-eji aka Ya eme amara.

Ala anyị ga-amịta mkpụrụ mmaji kwuru mmaji.

Ezi omume ga-ebute ya ụzọ na-aga.

Mgbapụta wee sọta na nzọ ụkwụ ya.

Azịza: Onyenweanyị mee ka anyị hụ obi ọma Gị. Nyekwa anyị nzọpụta Gị.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 9:1-5

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara Ndị Rom

Isi Okwu: Aga m ekwe ka a ma m ikpe, ma a sị na nke a ga-enyere ụmụnne m aka.

Ihe a m na-ekwu ugbu a, anaghị m ekwu ka e too m. Eji m Kristi na-ekwu eziokwu. Akọ na uche m, na Mmụọ Nsọ na-agbara m akaebe na ọ bụghị asị ka m na-atụ.

Ihe ahụ m na-ekwu bụ na ọnụma juru m obi nke ukwuu. Oke ihe mwute na ihe mgbu dị m n’obi karịrị akarị, nke na, aga m ekwe ka m bụrụ onye a bụrụ ọnụ; ka mbụrụ onye e kewapụrụ na Kristi, ma ọ bụrụ na nke a ga-enyere ụmụnna m, ndị Izrel aka, ndị mụ na ha bụ otu agbụrụ!

Ha bụ agbụrụ Chineke jiri mere ụmụ. O tubere ha ugo, Ya na ha bịakwa gbaa ndụ. Ọ bụ ha ka e nyere Iwu, bụrụkwa ha ka e nyere usoro ziri ezi e si ekpe ekpere n’Ụlọ Nsọ.

Ọ bụ ha ka e kwere nkwa dị iche iche. Ha sitere n’agbụrụ nna nna anyị ochie ha, ndị tọrọ ntọala okwukwe. Nke ka nke bụ na Kristi si na agbụrụ ha pụta – ka ngọzi dịrị Kristi Onye bụ Chineke ebighị ebi, ebighị ebi! Amen.

MBEKU – Luk. 19:38

Aleluya, aleluya!

Ngọzi dịrị eze na-abịa n’aha Onyenweanyị. Udo dịrị ụwa. Ebube dịrị igwe.

Aleluya!

OZIỌMA -14:22-33

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Gwa m ka m bịakwute Gị.

Mgbe igwe mmadụ ahụ rijuchara afọ, Jesu gwara Ụmụazụ Ya ka ha banye n’ụgbọmmiri, buru Ya ụzọ kwọfee n’ofe mmiri. Ma ya onwe Ya nọdụrụ n’azụ, na-eme ka igwe mmadụ ahụ laa.

Mgbe O zilasịrị igwe mmadụ ahụ, Ọ gbagooro n’elu ugwu nọdụ naanị Ya, ka O kpee ekpere. N’oge mgbede, naanị Ya nọ ebe ahụ. Ma ụgbọmmiri ahụ ejemiela n’ime osimiri, ebe ebiri mmiri dị egwu na-ebugharị ya, n’ihi na oke ifufe na-efe.

Ma ihe dị ka elekere anọ nke abalị, mgbe okeọkpa kwara, Jesu gaara ije n’elu mmiri, na-abịakwute ha. Mgbe Ụmụazụ Ya hụrụ Ya ka Ọ na-aga ije n’elu mmiri, obi fepụrụ ha. Ha jiri ụjọ tie mkpu sị: “Ọ bụ mmụọ”!

Ma, ngwa ngwa, Jesu tiri, sị ha; “Ụjọ atụla ụnụ! Ọ bụ M! Nweenụ obisike”! Ọ bụ Pita zaghachiri Ya sị: “Onyenweanyị, ọ bụrụ na ọ bụ Gị, gwa m ka m jere ije n’elu mmiri bịakwute Gị.”

Jesu sị ya: “Ngwa, bịa!” Pita rịpụtara n’ụgbọmmiri, wee jere ije n’elu mmiri na-ejekwuru Jesu. Ma mgbe ọ chịgharịrị ya n’obi ya, na oke ifufe siri ike na-eku ya n’ahụ, egwu tụtụ ya.

Ọ malite imikpu na mmiri, wee tie mkpu sị: “Onyenweanyị, zọpụta m!” Ngwa ngwa Jesu wee setịa aka ghọta Pita, sị ya: “Gị, onye obere okwukwe! N’ihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ?” Mgbe ha batara n’ụgbọmmiri ahụ, oke ifufe ahụ wee febie. Ndị nọ n’ụgbọmmiri ahụ wee kpọọrọ Ya isiala na-ekwu sị: “N’ezie, Ị bụ Nwa Chineke.

Igbo Mass Readings for August 10 2026, Emume Ncheta Lawrence dị Asọ – Dikin na Onye egburu maka Okwukwe.

Igbo Mass Readings for August 9 2026, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.