Igbo Mass Readings for August 10 2025, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for August 10 2025, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 18:6-9

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Amamihe

Isi Okwu: I sitere n’otu ihe ahụ I jiri megwara ndị iro anyị ajọ ihe ha mere anyị, were mee anyị ndị dị otito site n’ịkpụdebe n’ebe Ị nọ.

E buuru nna anyị ha amụma maka abalị ahụ, ka ha were ọnụ nwee obisike, mgbe ha hụrụ ụdị nkwa ha tụkwasara nchekwube ha na ya. Nke a bụ ihe ndị nke Gị na-atụ anya ya: nzọpụta ndị ezi omume na mbibi nke ndị iro ha.

N’ihi na aka ahụ I jiri megwata ndị iro anyị ajọ ihe ha mere anyị, bụkwa aka I jiri meere anyị ọgọ site n’ịkpọta anyị n’ebe Ị nọ. Ụmụ ọma nke ndị ezi omume gara na-achụ aja na nzuzo. Aja nsọ ahụ ha jiri otu obi chụọ, bụ ihe Chineke chọrọ ka e mee.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 32:1, 12, 18-20. 22. Az. 12

Azịza: Ha nwère isi ọma bụ ndị Onyenweanyị họọrọ ka ha bụrụ ndị nke Ya.

1. Ụnụ, ndị ezi omume, werenụ mkpu ọñụ ñụrịwa na Dinwenụ,

n’ihi na ndị kwụ ọtọ n’obi kwesịrị ịnara otito.

Ha nwere isi ọma bụ ndị Onyenweanyị bụ Chineke ha;

ndị Ọ họọrọ ka ha bụrụ ndị nke Ya. Azịza.

2. Onyenweanyị na-echekwaba ndị na-atụrụ Ya egwu;

ndị tụkwasara obi n’ịhụnanya Ya;

ka Ọ zọpụta mkpụrụobi ha n’ọnwụ,

bịakwa debe ha ndụ n’oge ụkọ nri. Azịza.

3. Mkpụrụobi anyị na-eche Onyenweanyị,

n’ihi na Ya bụ enyemaka na nchedo anyị.

Onyenweanyị, chakwasị anyị ebere Gị,

ebe anyị tụkwasara nchekwube anyị na Gị. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 11:1-2.8-19 maọbụ 11:1-2, 8-12

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ e degaara ndị Hibru

Isi Okwu: Ebreham na atụ anya obodo Chineke jiri aka Ya chọpụta, chọọ mma; obodo ahụ Chineke jiri aka ya wuo.

Ọ bụ sọ okwukwe na-enye anyị obisike, na ngọzi ahụ anyị na-atụ anya ya ga-abụ nke anyị. Ọ bụkwa site n’okwukwe ka o jiri wee anyị anya, na ihe ahụ a naghị ahụ anya ugbu a, bụ ihe dị adị n’eziokwu.

Ọ bụ okwukwe ka e ji mara nna nna anyị ha. Okwukwe ka Ebreham ji rube isi n’oku a kpọrọ ya, wee bilie gawa n’ala nke ga-abụ oke e kenyere ya na ụmụ ụmụ ya. O biliri gawa njem n’amaghị ebe ọ na-eje.

O jiri okwukwe bata, ka onye bịara abịa, n’ala ahụ e kwere ya na nkwa; bịakwa biri ka ọbịa n’ala ahụ e kwere ya na nkwa; ya na Aịzik na Jekọp, bụ ndị ya na ha so rite oke n’otu nkwa ahụ e kwere.

Ha biri n’ụlọ ikwuu n’ala ahụ, wee na-atụ anya oke obodo, nke Chineke ga-abụ Onye tọrọ ntọala ya, Onye chepụtara ka e si ewu ya, na Onye ga-ewu ya. Ọ bụ site n’okwukwe ka Sera, bụ nwanyị aga, na agadi nwanyị gafere n’ịtụ ime, ji nwee ike ịtụ ime.

N’ihi na o kwere na Onye ahụ kwere ya nkwa, ga-emezuru ya ihe O kwere ya na nkwa. Ọ bụ otu a ka e sitere n’otu nwoke dịka osisi kpọrọ nkụ, nweta ụmụ ụmụ ọnụ ọgụgụ ha karịrị agụta agụta; ụmụ ụmụ ọnụ ọgụgụ ha dịka kpakpando nke igwe na aja dị n’akụkụ osimiri.

[Ndị a niile nwụrụ n’okwukwe, mgbe ha anatabeghị ihe ahụ e kwere ha na nkwa. Ma ha siri n’ebe dị anya hụ ihe e kwere na nkwa, wee nabata ya; bịakwa ghọta nke ọma na ha bụ ndị ọbịa na ndị ije n’elu ụwa.

Ndị si otu a akọwa onwe ha na-egosi na ha na-achọ ebe ga-abụ ebe obibi n’eziokwu. Ihe ha bu n’obi abụghị ala mbụ ahụ ha si n’ime ya pụta. N’ihi na a sị na ha bu ala mbụ ahụ n’obi, ha nwere ohere ịlaghachi n’ebe ahụ.

Ma otu ọ dị, ha na-achọ ala ka mma, nke bụ ụlọ ahụ e wuuru anyị n’eluigwe. Ọ bụ ya mere, ihere adịghị eme Chineke ma a kpọọ Ya Chineke ha. N’ihi na ọ bụ ha ka O wuuru obodo ahụ. Okwukwe ka Ebreham ji were nwa ya bụ Aịzik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa.

Ebreham ka Chineke kwere nkwa ịmụta ọtụtụ ụmụ. Ọ bụ ezie na ọ hụbeghị ụmụ ndị a e kwere ya na nkwa, ma o jikeere iji naanị otu nwa ahụ ọ mụtara chụọrọ Chineke aja.

Chineke gwara ya, sị, “Site n’aka Aịzik ka aha gị ga-esi aga n’ihu.” Ebreham nwere okwukwe na Chineke nwere ike ime ka onye nwụrụ anwụ kulite. E nwere ike ịsị na Aịzik bụ ihe ọmụma atụ onye e siri n’ọnwụ kulite.]

MBEKU – Mt. 24:42-44

Aleluya, aleluya!

Mụrụnụ anya, dịnụ nkwadebe, n’ihi na ụnụ amaghị mgbe Nwa nke Mmadụ ga-eji abịa.

 Aleluya!

OZIỌMA – 12:32-48 maọbụ 12:35-40

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere

Isi Okwu: Hụkwanụ na ụnụ dị njikere.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya: [“Igwe atụrụ ntakịrị M, ụjọ atụla ụnụ, maka na ọ masịrị Nna ụnụ inye ụnụ alaeze. Reenụ ihe ụnụ nwere. Nyenụ ụmụ ogbenye onyinye.

Nwetaranụ onwe ụnụ akpa ego nke na-adịghị aka nka; akụ na ụba nke na-adịghị agwụ agwụ n’eluigwe, ebe onye ohi ọ bụla na-enweghị ike ịbịa nso; ebe ahụhụ ala na-enweghị ike imebi ya.

N’ihi na ebe akụ na ụba mmadụ nọ, ka obi ya nọ.] Hụkwanụ na ụnụ jikeere ejike; na iheọkụ ụnụ na-enwu ọkụ. Dịnụ ka ndị na-eche mgbe nna ha ukwu ga-esi n’oriri agbamakwụkwọ lọbata.

Jikerenụ imeghere ya ọnụ ụzọ ngwa ngwa ọ kụrụ aka n’ụzọ. Ngọzi dịrị ụmụ odibo nna ha ukwu hụrụ ebe ha mụ anya mgbe ọ lọbatara! N’eziokwu ka M na-agwa ụnụ, ọ ga-eyiri uwe e ji agba odibo, bịakwa buziere ha erimeri n’ọnọdụ Ọ kwadooro ha.

O nwere ike ịlọbata n’etiti abalị, ma ọ bụ n’oge chi ọbụbọ. Ngọzi ga-adịrị ụmụ odibo ahụ, ma ọ bụrụ na ọ lọkwutere ha, ebe ha nọ n’ọnọdụ njikere. Ụnụ ma nke ọma, na ọ bụrụ na onye nwe ụlọ maara oge onye ohi ji abịa, ọ gaghị ekwe ka e gwupuo ụlọ ya.

N’otu aka ahụ kwa, mụrụnụ anya, dịnụ na njikere, n’ihi na Nwa nke Mmadụ na-abịa, n’oge ụnụ na-adịghị ele anya Ya. Pita jụrụ Ya sị: “Onyenweanyị, ọ bụ anyị ka Ị na- atụrụ ilu a, ka ọ bụ onye ọ bụla ka Ị na-atụrụ ya?”

Onyenweanyị zara ya: “Onye ka i chere, bụ nwodibo ahụ, majuru ihe afọ, kwesịrị ntụkwasị obi; onye nna ya ukwu ga-ekenye ọrụ ilekọta ezi na ụlọ ya, ka ọ na-enye ndị ezi na ụlọ ya nri na mgbe ya?”

Ị ga-abụ odibo a gọziri agọzi ma ọ bụrụ na nna gị ukwu alọta hụ gị ka ị na-eme ihe ahụ ọ chọrọ. N’ezie, O doro m anya na mgbe ọ lọtara, Ọ ga-etinye gị n’ọnọdụ ị ga-anọ na-elekọta ihe niile O nwere.

Kama, ị bụrụ odibo ahụ nke na-asị n’ime onwe ya, nna m ukwu ga-anọ ọdụ tupuu ọ lọta, ị malite iti odibo ndị nwoke na ndị nwanyị ọzọ i kwesịrị ilekọta anya ihe, i bidokwa na-eso ndị na-añụbiga mmanya, bụrụ onye mmanya na-egbu, nna gị ukwu ga-alọta n’ụbọchị ahụ, na oge ahụ ị na-atụghị anya ya, ọ ga-atakwa gị ahụhụ, tinye gị n’ebe a na-edebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi.

Ya mere, odibo ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma jụ ijikere chere nna ya ukwu, ma ọ bụ kpebie ịhapụ ime ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-eti ya ezigbo ihe otiti. Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka O mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị.

N’ihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne n’aka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne n’aka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya n’aka.

Igbo Mass Readings for August 11 2025, Mọnde Izuụka nke Iri na Itoolu N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for August 10 2025, Ụka nke Iri na Itoolu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.

Last Update: July 8, 2023