Igbo Mass Readings for June 18 2034, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 18 2034, Ụka nke Iri na otu n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 12:7-10, 13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Samuel
Isi Okwu: Onyenweanyị na-agbaghara njọ gị; Ị gaghịkwa anwụ.
Netan gwara Devid sị: “Lee ihe Osebụrụwa Chineke nke Izrel kwuru: Etere M gị mmanụ wee chie gị Eze Izrel. Azọpụtara M gị n’aka Sọl; bịakwa were ụlọ nna gị ukwu na ndị nwunye ya nye gị n’aka.
E nyere M gị ụlọ nke Izrel na nke Juda. Ọ bụrụ na nke a ezughị, aga m enye gị ya mmaji abụọ. Gịnị kpatara i jiri lelia Dinwenụ, bịakwa kpasuo Ya iwe? I jirila mma agha mefuo Uria onye Hitaịt, bịakwa kuchiri nwunye ya, ka ọ bụrụ nwunye gị; bịakwa were mma agha ndị Amọn gbufuo ya.
Bido ugbu a gawa, mma agha agaghị apụ apụ n’ụlọ gị, ebe i leliri m wee kuchie nwunye Uria onye Hitaịt, ka ọ bụrụ nwunye gị”. Devid sịrị Netan: “Emehiela m Onyenweanyị!” Netan wee gwa Devid: “N’aka o ji bụrụ Onyenweanyị, ọ gbaghaara gị njọ gị. Ị gaghị anwụ n’ihi mmehie a.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 31:1-2.5.7. 11 Az. 5
Azịza: Onyenweanyị, gbaghara ikpe ọmụma dịrị njọ m.
Añụrị dịrịị onye a gbaghaara mmehie ya;
onye e hichapụrụ njọ ya.
Añụrị dịrịị onye ahụ Dinwenụ na-eboghị njọ ọ bụla;
onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị na mmụọ. Azịza.
2. Ugbu a ekwupụtela m njọ m.
Ezobeghị m mmehie m.
Ekwuru m sị: “Aga m ekwupụtere Onyenweanyị mmehie m.”
Onyenweanyị, ọ bụ Gị gbaghaara ikpe ọmụma dịịrị njọ m. Azịza.
3. Onyenweanyị, Gị bụ ebe m na-agbaba,
Gị na-azọpụta m na nsogbu.
I ji mkpu nzọpụta gbaa m gburugburu. Azịza.
4. Ụnụ ndị ezi omume! ñụrịbanụ na Dinwenụ!
Ụnụ ndị kwụ ọtọ n’omume! bịanụ, tiwapụnụ mkpu ọñụ. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:16. 19-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshia
Isi Okwu: Adị m ndụ ugbu a, ma ọ bụghị m dị! Kama ọ bụ ndụ nke Kristi, Onye bi n’ime m.
Anyị nabatara na ọ bụghị idebezu ihe e dere n’iwu, kama ọ bụ inwe okwukwe na Kristi, na-eme mmadụ onye ezi omume. Ọ pụtara na esitere m n’Iwu nwụọra Iwu, ka m wee nwee ike ibi ndụ ugbu a maka Chineke.
Eso m Kristi koro n’obe. Ugbu a, adị m ndụ, ma ọ bụghị ndụ m ka m ji biri. Kama ọ bụ ndụ Kristi. Onye bi n’ime m. Ndụ m dị ugbu a n’anụ ahụ, eji m okwukwe biri, okwukwe n’ime Nwa Chineke, Onye hụrụ m n’anya, bịakwa were onwe Ya chụọ aja n’ihi m.
E nweghị m ike ịgbaba onwe m aka onyinye Chineke. Ọ bụrụ na Iwu nwere ike ime anyị ndị ezi omume, ọ pụtara na e nweghị uru e ritere n’ọnwụ Kristi.
MBEKU – 1 Jọn. 4:10
Aleluya, aleluya!
Chineke buru ụzọ hụ anyị n’anya, wee zite Nwa Ya, Onye na-ekpochapụ njọ anyị.
Aleluya!
OZIỌMA – 7:36 8:3 ma ọ bụ 7:36-50
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: N’ihi na ịhụnanya ya ebuka, a gbagharala ya ọtụtụ njọ ya.
Οtu onye Farisii kpọrọ Jesu oku ka ọ bịa rie nri n’ụlọ ya. Mgbe Jesu garuru n’ụlọ onye Farisii ahụ, wee soro ya dabere n’oche maka iri nri; otu nwanyị a ma ama n’obodo ahụ dịka onye njọ batara.
Nwanyị ahụ nụrụ na Jesu na-eri nri na be onye Farisii ahụ, wee buru otu udu mmanụ alabasta. Nwanyị ahụ cheere n’azụ, n’ụkwụ Jesu, na-akwa akwa; anya mmiri ya na-awụsa n’ụkwụ Jesu.
O jiri agịrị isi ya na-ehicha Ya ụkwụ; o suturu Ya ọnụ n’akụkụ ụkwụ Ya niile, bịakwa were mmanụ ahụ na-ete Ya n’ụkwụ. Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ Jesu oriri hụrụ ihe a o kwuru n’obi ya sị: “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara-amata ụdị mmadụ nwanyị a na-akpatụ ya aka bụ, na o nweghị ebe a na-akpọzi ya aha n’ obodo.”
Ma Jesu welitere okwu ahụ wee sị ya: “Saịmọn, o nwere ihe m chọrọ ịgwa gị.” Saịmọn zara sị: “Nna anyị ukwu, kwuo ihe ọ bụ.” Ọ sị ya: “Otu onye na-ebinye ego nwere mmadụ abụọ ji ya ụgwọ.
Otu ji ya ụgwọ narị naịra ise; nke ọzọ ji ya ụgwọ naịra iri ise. Ma o nweghị nke ọ bụla n’ime ha nwere ego e ji akwụghachi ya bụ ụgwọ. N’ihi ya, obinye ego ahụ kagburu ụgwọ ahụ ha ji ya.
N’ime ha mmadụ abụọ, olee nke ga-ahụ onye mbinye ego ahụ n’anya karịa?” Saịmọn wee zaa sị: “Eche m na ọ bụ onye ahụ a kagbuuru ụgwọ karịrị ụgwọ nke onye nke ọzọ.”
Jesu wee sị ya: “I zatara ya”! O wee tụgharịa chee nwanyị ahụ ihu, sị Saịmọn: “Ị hụla nwanyị a? Abatara m n’ụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ịsa ụkwụ. Ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya saa M ụkwụ, bịakwa were agịrị isi ya hichaa ha.
I jighị isutu ọnụ kelee m, ma kemgbe M batara n’ebe a, nwanyị a ezubeghị ike iji ọnụ ya na-esutu ụkwụ m. Ị wụsakwaghị m mmanụ ọ bụla n’isi, ma lee na nwanyị a eteela m mmanụ n’ụkwụ.
N’ihi ya, ana M agwa gị, na ọ ga-abụrịrị na a gbagharala ya njọ ya; na a gbagharala ya ọtụtụ njọ: ma ọ bụghị ya, o nweghị ike igosịpụta ụdị nnukwu ịhụnanya dịka nke a.
Onye a gbaghaara njọ ntakịrị bụ onye gosiri ịhụnanya ntakịrị. Jesu wee sị nwanyị ahụ: “A gbagharala gị mmehie gị niile.” Ndị Ya na ha na-eri nri malitere na-ajụrịta onwe ha ajụjụ sị: “Onye bụ nwoke a, na-agbaghara njọ”?
Ma Jesu sịrị nwanyị ahụ: “Okwukwe gị azọọla gị. Laa n’udo”. [Mgbe ihe a gasịrị, Jesu gagharịrị n’obodo ukwu na obodo nta dị iche iche, na-ekwusa Oziọma nke alaeze Chineke.
Ụmụazụ iri na abụọ soro ya agagharị, tinyekwara ụfọdụ ụmụnwanyị a gwọrọ ọrịa na-enye ha nsogbu na ndị mmụọ ọjọọ ji. Onye dị ka Meri, nke a na-akpọ Magdalin, onye ajọ mmụọ asaa siri n’ime ya pụọ, na Joana, nwunye Chuza, onye bụ odibo Herọd, na Suzana, na ụfọdụ ndị ọzọ ji aka ọrụ ha na-egboro ha mkpa ha].
Igbo Mass Readings for June 19 2034, Mọnde Izuụka nke Iri na Otu N’Oge Nkịtị