Igbo Mass Readings for June 10 2029, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 10 2029, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:3-6

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hozea

Isi Okwu: Ihe m chọrọ bụ ịhụnanya, ọ bụghị aja.

Ngwanụ ka anyị mata Onyenweanyị. Ka anyị gbaanụ mbọ mara Ya. Ọbịbịa Ya bụ ihe were anya dịka chi ọbụbọ. Ikpe nkwụmọtọ Ya na-achawapụta dịka ihe ehihie.

Ọ ga-abịakwute anyị ka mmiri ozuzo; dịka nnukwu igidi mmiri na-ezosa ala n’udu mmiri.” Ifrem, gịnị ka M ga-eji gị eme? Juda, gịnị ka M ga-eme gị? Ofufe ụnụ na-efe M dị ka urukpu nke ụtụtụ.

Ọ dị ka igirigi na-ala n’isi ụtụtụ. N’ihi nke a ka M ji were ndị amụma kụọ ha ihe. Eji M okwu ọnụ M tigbuo ha. Maka na ihe M chọrọ bụ ịhụnanya, ọ bụghị aja. Ịma Chineke ka mma karịa aja nsure ọkụ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 49:1, 8, 12-15, Az. 23

Azịza: Ọ bụ ndị ezi omume ka M ga-egosi ike nzọpụta Chineke.

1. Onyenweanyị bụ Chineke ekwuola okwu wee kpọọ ụwa oku,

bido n’ọwụwa anyanwụ ruo n’ọdịda ya.

“Anaghị M abara ụnụ mba maka aja ụnụ na-achụnyere M,

n’ihi na aja nsure ọkụ ụnụ nọ M n’ihu mgbe niile. Azịza.

2. A sị na agụụ na-agụ M, agaghị M akọrọ ụnụ;

n’ihi na ụwa na ihe niile juru n’ime ya bụ nke M.

Ana M eri anụ oke ehi?

Ka ọ bụ ọbara ewu ka M na-añụ? Αzịza.

3. Ka aja ụnụ na-achụnyere Chineke bụrụ inye Ya otito.

Mezuokwa nkwa I kwere Onye Kacha Elu.

Bịa mgbe ahụ kpọkuo M na mkpa Gị.

Aga M agbapụta gị bịakwa tube gị ugo. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:18-25

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ ozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom

Isi Okwu: Ebreham si n’okwukwe wee nwee agbamume; O nyere Chineke ekele.

Ebreham nọgidere n’okwukwe na olile anya, ọ bụna mgbe olile anya na-adịghị, o wee site na nke a ghọọ “Nna ọtụtụ mba”. N’ihi na otu a ka a gwara ya n’Akwụkwọ Nsọ, sị: “Ụmụ si n’agbụrụ gị ga-adị ọtụtụ.”

Mgbe ahụ, Ebreham agbaalarị ihe dị ka narị afọ. Ma okwukwe ya ajụghị oyi, ọ bụna mgbe o chetara ahụ ya nke karala oke nka, na mgbe o chetara na Sera nwunye ya bụ nwanyị aga.

O jighịkwa ekweghị ekwe nwee obi abụọ banyere nkwa ahụ Chineke kwere ya. Kama okwukwe ya mere ka o nwee ike. Ọ na-enyekwa Chineke otito. Obi siri ya ike nke ukwu, na Chineke pụrụ imezu ihe o kwere na nkwa.

N’ihi nke a ka Chineke ji site n’okwukwe “gụnye Ebreham n’onye ezi omume.” Ma e deghị okwu a bụ “a gụrụ ya n’onye ezi omume” maka naanị Ebreham.

E dere ya n’ihi anyị onwe anyị kwa, ndị Chineke gaje ịgụ na ndị ezi omume, bụ ndị kwere n’Onye ahụ mere ka Onyenweanyị Jesu si n’ọnwụ bilie. A rarala Jesu nye ka Ọ nwụọ n’ihi mmehie anyị. Chineke mekwara ka O si n’ọnwụ bilie ka e wee gụnye anyị na ndị ezi omume.

MBEKU – 1 Sam. 3:9; Jọn 6:68

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị, kwube na nwodibo Gị na-ege ntị. Ọ bụ Gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi.

Aleluya!

OZIỌMA – 9:9-13

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere

Isi Okwu: Abịaghị M ịkpọ ndị kpọrọ onwe ha ndị eziomume. Abịara m maka ndị njọ.

Mgbe Jesu hapụrụ ebe ahụ, Ọ hụrụ otu onye ọna-ụtụ a na-akpọ Matiu, ka ọ nọ n’ụlọ ebe ọ nọ na-arụ ọrụ ịnakọta ụtụ. Jesu wee sị ya, “So m”! Matiu wee bilie soro Ya.

O ruo mgbe Jesu nọ n’oriri n’ụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna-ụtụ na ndị omenjọ bịara soro Ya na Ụmụazụ Ya nọdụ na nri. Mgbe ndị Farisii nọ n’ebe ahụ hụrụ nke a, ha jụrụ ndị Ụmụazụ Ya, sị: “Gịnị mere onye nkuzi ụnụ ji eso ndị ọna-ụtụ na ndị omenjọ eri ihe?”

Mgbe Jesu nụrụ ajụjụ ha, O kwuru sị: “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ na-akpa ndị ahụ na-adịghị ike. Ma gaanụ chọpụta ihe okwu a pụtara, ‘Achọrọ M ebere; ọ bụghị aja.’ N’ihi na abịaghị M ịkpọ ndị kpọrọ onwe ha ndị ezi omume, kama ndị kwetara na ha bụ ndị mmehie.”

Igbo Mass Readings for June 11 2029, Mọnde Izuụka nke Iri N’Oge Nkịtị

Igbo Mass Readings for June 10 2029, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.

Last Update: July 3, 2023