Igbo Mass Readings for June 9 2024, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for June 9 2024, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 3:9-15
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Jenesis
Isi Okwu: Aga m etinye iro n’etiti ụnụ: gị na nwanyị ahụ, n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya.
Onyenweanyị Chineke wee kpọọ nwoke ahụ jụọ ya sị: “Olee ebe ị nọ”? Ọ zara Ya sị: “Anụrụ m mkpọtụ Gị n’ogige. Ma egwu na-atụ m n’ihi na agba m ọtọ, m wee zoo onwe m”.
Ọ jụkwaa ya ọzọ: “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? Ọ pụtara na ị nọ na-ata mkpụrụ osisi ahụ M gwara gị atala.” Nwoke ahụ zara ya: “Nwanyị a I tinyekọtara mụ na ya n’ebe a – ọ bụ ya nyere m mkpụrụ osisi ahụ, m wee taa ya.”
Onyenweanyị Chineke abịa jụọ nwanyị ahụ: “Ọ bụ gịnị kpatara i jiri mee ihe dị otu a?” Nwanyị a zaghachiri sị: “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, m wee taa ya.”
Onyenweanyị Chineke ewere gwa agwọ sị: “N’ihi ihe a i mere, ị ghọọla anụ a bụrụ ọnụ n’etiti ụmụ anụmanụ, na etiti anụ ọhịa niile. Afọ ka ị ga-eji na-akpụ n’ala. Ihe ruru inyi ka ị ga na-eri n’ụbọchị ndụ gị niile.
Aga m etinye iro n’etiti gị na nwanyị, n’etiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya. Ọ ga-azọpịa gị isi ma ị ga-ata Ya n’ikiri ụkwụ.”
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 129:1-8 Az. 7
Azịza: Onyenweanyị nwere ebere na uju mgbapụta.
1. Onyenweanyị, ọ bụ site n’ogbu mmiri nke ahụhụ ka m na-akpokụ Gị.
Onyenwe m, nụrụ olu m.
Gee ntị n’olu akwa m.
Za m, nyekwara m aka. Azịza.
2. Onyenweanyị, ọ bụrụ na ị hụbachaa mmehie anyị niile ama,
ọ bụ onye ga-afọdụ?
Ma mgbaghara bụ nke Gị.
N’ihi ya ka anyị ji asọpụrụ Gị. Azịza.
3. Atụkwasara m obi n’Onyenweanyị.
Mkpụrụobi m niile tụkwasara n’okwu Ya.
Izrel, chebe Onyenweanyị karịa ka onye nche abalị si eche chi ọbụbọ. Azịza
4. N’ihi na Onyenweanyị nwe obi ọma na uju mgbapụta.
Ọ ga-agbapụta Izrel na mmehie ya niile. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:13-5:1
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Abụọ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt.
Isi Okwu: Anyị Kwere ekwe, ya mere m jiri kwuwapụta okwu.
Ebe anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ kpalitere Akwụkwọ Nsọ ka o kwuo sị: “Ekwere m ekwe, ya mere m jiri kwuwapụta okwu; anyị onwe anyị kwere ekwe.
Ọ bụkwa n’ihi na anyị kwere ekwe ka anyị ji kwuwapụta okwu. Anyị makwa na Chmeke, Onye mere ka Onyenweanyị Jesu si n’ọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jesu si n’ọnwụ bilie n’oge nke anyị.
Ọ ga-akpọtakwa anyị na ụnụ n’akụkụ Ya. Ụnụ ahụla na e doziri ihe ndị a niile maka ọdịmma ụnụ; ka o wee bụrụ na mgbe a na-amụba amara n’etiti ndị mmadụ, mgbe ahụ kwa ka inye ekele na-amụba maka otito na ebube nke Chineke.
Ọ bụ ya mere na ike anaghị agwụ anyị! Kama ike ga-agwụ anyị, ọ bụrụgodụ na ihe anyị jiri bụrụ mmadụ nke dị anyị n’elu ahụ na-ala n’ureghure, ndụ ọhụrụ dị anyị n’ime mmụọ na-ebuwanye kwa ụbọchị kwa ụbọchị.
Ntakịrị ahụhụ ndị a na-agafe agafe anyị bu n’isi ugbu a, na-enye anyị ọzụzụ maka ibute nnukwu ebube dị ebighị ebi, nke gbara ọkpụrụkpụ na-enweghị atụ.
Ọ pụtara na anyị nwere anya nke na-elefuru anya n’ihe a na-ahụ anya, wee na-ele ihe a naghị ahụ anya; n’ihi na ihe a na ahụ anya na-adị nwa oge. Ma ihe a na-adịghị ahụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Anyị ma nke ọma na mgbe a kwaturu ụlọ a-lawa-a-ghara nke anyị bi n’ime ya n’ụwa a, a ga-akpọbata anyị n’ụlọ Chineke wuuru anyị n’eluigwe, nke bụ ebe obibi dị ebighị ebi, a na-ejighị aka mmadụ nkịtị wee wuo.
MBEKU – Eph. 1:17-18
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, meghee obi anyị ka anyị nụ okwu nke Nwa Gị.
Aleluya!
OZIỌMA- 30:20-35
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Isi Okwu: Ike ekwensu enweghị ike iguzo.
Jesu lọtara n’ụlọ, Ya na Ụmụazụ Ya. Oke igwe mmadụ zukọkwara ọzọ, nke mere na Jesu na Ụmụazụ Ya enweghị ohere ọ bụla iri ihe. Mgbe ndị ikwu na ibe Ya nụrụ ya, ha bịara gbalịa idulata ya n’ụlọ ha, n’ihi na ha chere n’onwe ha sị: “Isi adịghị ya mma.”
Ndị ode-akwụkwọ ndị si na Jerusalem gbadata na-ekwukwa sị: “Ajọ mmụọ ji Ya aka”. Ndị ọzọ na-ekwukwa sị: “Ọ bụ n’ike eze ajọ mmụọ a ka O ji achụpụ ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi nke a, Jesu weere ihe ọmụma atụ na-agwa ha sị” “Ekwensu, o nwere ike ịchụpụ ekwensu?
Ọ bụrụ na alaeze kewara ekewa, bịakwa nọrọ n’ibe n’ibe site n’ọgba aghara, o nweghị ike ịnọte aka tupu alaeze ahụ alaa n’iyii. Ọ bụrụ na ezi na ụlọ kewara ekewa, na-ebuso onwe ya agha, ezi na ụlọ ahụ enweghị ike ịnọte aka tupu ọ laa n’iyii.
Ọ bụrụ na ekwensu na ekwensu ibe ya na-ebuso onwe ha agha, kedụ ka alaeze ha ga-esi akwụdo? Nke ha agwụla! Ma o nweghị onye ọ bụla nwere ike ịbanye n’ụlọ dike, kwakọrọ ngwongwo o ji bụrụ ọgaranya, e wepụ ma o buru ụzọ kee dikeọgụ ahụ agbụ.
Sọ mgbe ahụ ka o nwere ike banye bukọrọ ngwongwo dị n’ụlọ ya. “N’eziokwu ka M na-agwa ụnụ, nkwutọ niile e kwutọrọ Chineke, a ga-agbaghara ha. Ma nkwutọ ọ bụla e kwutọrọ Mmụọ Nsọ, e nweghị ike ịgbaghara ya.
Onye mere ya, a ga-ama ya ikpe nke njọ dị ebighị ebi.” O kwuru ihe a maka na ha kwuru sị: “Ọ bụ ajọ mmụọ bi n’ime Ya.” Mgbe ahụ nne Ya na ụmụnne ya bịara guzo n’ezi, zie Ya ozi ka Ọ pụta n’ezi. Igwe mmadụ gbara Ya gburugburu gwara Ya sị: “Nne Gị na ụmụnne Gị nọ n’ezi na-achọ ịhụ Gị.”
O wee zaa ha sị: “Onye bụ nne m na ụmụnne m?” Mgbe o lere ndị nọ Ya gburugburu anya, Ọ sị: “Lee, ndị a bụ nne m na ụmụnne m. Onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.
Igbo Mass Readings for June 10 2024, Mọnde Izuụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume
Igbo Mass Readings for June 9 2024, Ụka nke Iri n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Abụọ.