Igbo Mass Readings for February 8 2026, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 8 2026, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 58:7-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Mgbe ahụ ka ihe gị ga-awa ka chi ọbụbọ.
Lee ihe Onyenweanyị kwuru: Ka gị na ndị agụụ na-agụ kee nri gị. Chekwaba ndị a na-emegbu emegbu na-enweghị ụlọ n’ụlọ gị. Mgbe ị hụrụ onye gba ọtọ, yibe ya akwa.
A gbaketakwala onye gị azụ. Mgbe ahụ ka ihe gị ga-achawapụta ka chi ọbụbọ. Ọnya gị ga-akpọ mgbe na-adịghị anya. Ezi omume gị ga-ebute gị ụzọ. Ebube nke Onyenweanyị esota gị n’azụ.
Mgbe ahụ, Ị ga-akpọ oku, Onyenweanyị aza gị. Ị ga-ebe akwa enyemaka, Ọ sị gị: “Anọ M ya.” Ọ bụrụ na ụnụ ewepụ mmegbu n’etiti ụnụ, bịakwa wepụ ebubo ụgha na ajọ okwu; ọ bụrụ na ụnụ nye ndị agụụ na-agụ ihe oriri, bịakwa mee ka obi lọtuo ndị a na-akpagbu akpagbu; ihe ga-esi n’ime ọchịchịrị chawapụtara ụnụ; itiri ewee dịrị ụnụ ka etiti ehihie.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 111:4-9 Az. 4
Azịza: Onye ezi omume bụụrụ ndị aka ha dị ọcha ihe na-achawapụta n’ọchịchịrị.
1. Onyenweanyị si n’ọchịchịrị bọọ ka chi maka ndị aka ha dị ọcha.
Ọ bụ onye amara, onye ebere na onye ezi omume.
Onye na-ebinye mmadụ ihe,
na-akwụbakwa aka ọtọ n’omume ya niile,
bụ onye ọ ga-adịrị mma. Azịza
2. O nweghị mgbe ọ bụla ọ ga-apụ n’ọnọdụ ya,
a ga- echetagide onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
Egwu akụkọ ọjọọ ọ bụla agaghị atụ ya.
Obi siri ya ike. Ọ tụkwasara ya n’Onyenweanyị. Azịza
3. Obi anaghị akụ ya kwem kwem. Ụjọ ejighị ya.
Ọ na-asaghe aka ya emere ụmụ ogbenye amara.
Obi ọma ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
A ga-ewelite mpi ya elu n’otito. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Mgbe mụ na ụnụ nọ, sọ amamihe m kwuru na m ma bụ maka Kristi, Onye a kpọgburu n’obe.
Ụmụnna m, mgbe m bịakwutere ụnụ na mbụ, ejighị m ọka-okwu ma ọ bụ mmụta gwa ụnụ ihe-omimi niile nke okwu Chineke. N’ihi na ezubere m n’oge ahụ mụ na ụnụ nọ ka m ghara ịma ihe ọzọ, karị ma ọ bụghị Jesu Kristi Onye ahụ a kpọgburu n’obe.
Mgbe m bịakwutere ụnụ, ahụ adịghị m ike. A nọdụrụ m n’etiti ụnụ n’egwu na n’oke ịma jijiji. Nkuzi m na ozi m zisara abịaghịkwa dịka okwu ire ụtọ na nke oke mmụta, ime ka ndị mmadụ kwere, kama ha bịara n’ụzọ igosi ọrụ nke Mmụọ Nsọ na nke ike Chineke. Ya mere, ọ bụghị n’amamihe nke mmadụ ka okwukwe ụnụ dabeere, kamaọ dabeere n’ike nke Chineke.
MBEKU – Jọn. 8:12
Aleluya, aleluya!
Onyenwenayị kwuru sị: “Abụ M ihe nke ụwa. Onye ọ bụla na-eso M ga-enwe ihe nke ndụ.
Aleluya!
OZIỌMA – 5:13-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ịbụ ihe, nke ụwa.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ụnụ onwe ụnụ bụ nnu nke ụwa. Ma ọ bụrụ na nnu atụfuo ụtọ ya gịnị ka a ga-eji weghachi ụtọ ya? Ọ baghịkwa uru iji mee ihe ọ bụla ọzọ ma ọ bụghị ịtụpụ ya n’ezi, ndị mmadụ azọọ ya ụkwụ.
“Ụnụ onwe ụnụ bụ ihe nke ụwa. Obodo e wuru n’elu ugwu adịghị na nzuzo. A dịghị amụnye ọkụ were ite kpuchie ya. Kama, a na-amụnye ọkụ dọba ya n’elu ihe ịdọba ọkụ, ebe ọ ga-esi na-enwuru ndị niile nọ n’ime ụlọ. Otu ahụ kwa, meenụ ka ọrụ ụnụ na-enwu ka ihé n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma niile ụnụ, wee too Nna ụnụ nke bi n’eluigwe.
Igbo Mass Readings for February 9 2026, Mọnde Izuụka nke Ise N’Oge Nkịtị