Igbo Mass Readings for February 9 2025, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 9 2025, Ụka nke Ise n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Atọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 6:1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Isi Okwu: Anọ m ebe a, ziga m.
N’afọ ahụ Eze Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Osebụrụwa Chineke ka Ọ nọ n’oche eze dị elu. Uwe ya sara mbara jupụta ebe nchụaja. Ndị Mmụọọma nọ Ya n’elu, nke ọ bụla n’ime ha nwere nku isi.
Ha na-etikọta mkpu ọñụ na-asị: “Nsọ, Nsọ, Nsọ, Osebụrụwa nke igwe ndị agha. Ebube ya jupụtara ụwa niile. Ntọala ụlọ ahụ mara jijiji site n’ụda olu ahụ na-eti mkpu.
Ụlọ Nsọ bịakwara jupụta n’anwụrụ ọkụ. Ekwuru m sị: “Ewoo! anọ m n’ọnọdụ dị nkịrịka. Efuola m, n’ihi na abụ m onye egbugbere ọnụ ya na-adịghị ọcha, bịakwa biri n’etiti ndị egbugbere ọnụ ha na-adịghị ọcha.
Anya m ahụla Eze ahụ, Osebụrụwa nke igwe ndị agha. Mgbe ahụ ka otu n’ime ndị Mmụọọma ahụ feere feta n’ebe m nọ. O ji mkpa were ọlọkọ ọkụ n’aka, nke o wetara n’ebe nchụaja.
O weere ọkụ ahụ daa m n’ọnụ sị: “Lee, ugbu a ihe a emetula gị n’egbugbere ọnụ; e hichapụla njọ gị; e kpochapụla mmehie gị niile.” Mgbe ahụ ka m ji nụ olu Osebụrụwa ka Ọ na-asị: “Onye ka M ga-eziga? Onye ga-abụ onye ozi anyị? M were zaa sị: “Anọ m ebe a, ziga m.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 137:1-5, 7-8 Az. 1
Azịza: Onyenweanyị, aga m agọzi Gị n’ihu ndị Mmụọọma.
1. Onyenweanyị eji m obi m niile kelee Gị.
Ị nụla okwu ọnụ m niile.
A ga m agọzi gị n’ihu ndị Mmụọọma;
aga m esekpuru Gị n’ihu Ụlọ Nsọ Gị. Azịza.
2. Ana m ekele Gị maka ịkwụdosi ike na ịhụnanya Gị,
nke kariri ihe niile anyị maara maka Gị na mbụ.
N’ụbọchị m kpọrọ oku, Ị zara m,
Ị bawanyere ike nke obi m. Azịza
3. Ndị eze niile nke ụwa ga-ekele Gị oge ha nụrụ okwu ọnụ Gị.
Ha ga-ekwe ukwe banyere ụzọ nke Onyenweanyị:
“Lekene ka ebube nke Onyenweanyị si buo ibu.” Azịza.
4. Ị na-esetị aka Gị na-azọpụta m.
Aka Gị ga-emere m ihe niile.
Onyenweanyị, ịhụnanya Gị dị ebighị ebi.
E kwekwala ka ọrụ Gị laa n’iyii. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 15:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Ana m akuzi ihe ha kuziri; Ọ bịakwa bụrụ ihe ahụ ụnụ kwere na ya.
Ụmụnna m, ugbu a, a chọrọ m ichetara ụnụ Oziọma ahụ m ziri ụnụ na mbụ, nke ụnụ natakwara, nke okwukwe ụnụ guzosikwara ike n’elu ya. Ya bụ okwu nke Oziọma ahụ m kwusaara ụnụ na mbụ, bụ nke e sitere n’ime ya na-azọpụta ụnụ, ma ọ bụrụ na ụnụ jisie ya ike.
I kwere n’ihe ọ bụla ọzọ agaghị eduru ụnụ ebe ọ bụla. Ozi ahụ dị oke mkpa e nyefere m n’aka bụkwa nke m nyefere ụnụ n’aka: nke isi ya bụ na Kristi nwụrụ n’ihi mmehie anyị niile, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu, na e liri Ya: na Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu, na O mere ka Pita hụ Ya anya, O mere ka Ụmụazụ iri na abụọ ahụ hụ Ya anya.
E mesịa, O mere ka ihe kariri narị mmadụ ise n’etiti ụmụnna anyị hụ Ya anya n’otu mgbe. Ọtụtụ n’ime ha dị ndụ ugbu a, ma ụfọdụ n’ime ha adaala n’ụra ọnwụ.
E mesịa O mere ka Jemis hụ Ya anya, e mesịa O mere ka ndị ozi niile hụ Ya anya. Na nke ikpeazụ, O mekwara ka mụ onwe m hụ Ya anya, dịka a ga-asị na m bụ nwa a mụkworo amụkwo, pụtara ụwa mgbe a na-atụbaghị anya ya.
N’ihi na mụ onwe m dịkarisịrị nta n’etiti ndị ozi, ebe m na-ekwesịghị ka a kpọọ m onye ozi, n’ihi na esogburu m Nzukọ Chineke. Ma site n’amara Chineke, abụ m ihe m bụ.
Ọ pụtakwara ihé n’ọrụ m na amara Ya nke o nyere m nke na-abụghị n’efu. Kama adọgburu m onwe m n’ọrụ karịa ndị ozi niile. Ọ bụ ezie na ọ bụghị n’ike aka m kama site n’amara Chineke nke sooro m.
Ma ọ bụ m, ma ọ bụ ndị ozi ndị ọzọ, otu ihe ahụ ka anyị na-ekwusa; otu ihe ahụ kwa, ka ụnụ kweere.
MBEKU – Jọn. 15:15
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị kwuru sị: “Ana m akpọ ụnụ ndị enyi M, n’ihi na emeela M ka ụnụ mata ihe niile M mụtara n’aka Nna M”.
Aleluya!
OZIỌMA – 5:1-11
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Isi Okwu: Ha hapụrụ ihe niile, sowe Ya.
O rue otu mgbe, Jesu wee guzo n’ụzọ osimiri Genesaret na-akuzi ihe. Oke igwe mmadụ wee zukọọ, na-adagide Ya, ka ha wee nụrụ okwu Chineke. O wee hụ ụgbọ mmiri abụọ ka ha gbara n’ụsọ osimiri ahụ.
Ma ndị ọkụ-azụ, ndị nwe ụgbọ abụọ ahụ, esila n’ime ha rịpụta, na-asa ụgbụ ha. Jesu rịba n’otu n’ime ụgbọ abụọ ahụ nke bụ nke Saịmọn, wee rịọ ya ka o si n’ala nupụ ụgbọ mmiri ya nwantịntị.
Jesu we nọdụ n’ụgbọ mmiri ahụ, si ebe ahụ na-ezi igwe mmadụ ihe. Ma mgbe Jesu kwubiri okwuchukwu Ya. Ọ sịrị Saịmọn, “Nupụ ụgbọ gị n’ogbu mmiri, wụnyekwa ụgbụ gị niile n’ebe miri emi, ka i wee gbute ọtụtụ azụ.
Saịmọn wee zaa ya, sị: “Nna anyị, kemgbe abalị anyị mụ anya, nọ na ndọlị n’ebe a; ma anyị egbuteghị azụ ọ bụla. Ma otu I kwuru, aga m awụnye ụgbụ m niile.” Saịmọn na ndị ya na ha so wee wụnye ụgbụ ha.
Ha wee kụta oke igwe azụ, nke mere na ọ fọdụrụ ihe nta ka ụgbụ ha dọkaa. Ha wee feere ndị ọkụ-azụ ibe ha aka, ndị nọ n’ụgbọ- mmiri nke ọzọ, ka ha bịa nyere ha aka.
Ha wee bịa, gbujuo ụgbọ abụọ ahụ azụ, nke mere na ụgbọ ha malitere imikpu. Mgbe Saịmọn Pita hụrụ ọrụ ebube nke a, o wee gbuoro Jesu ikpere ala, na-ekwu sị: “Onyenweanyị, si n’ebe m nọ pụọ, n’ihi na abụ m onye mmehie.”
Ụdị igbu-azụ nke a wee tụ Saịmọn Pita na ndị niile ya na ha so n’anya. Otu a ka o mekwara Jemis na Jọn, ụmụ Zebedi ndị ha na Saịmọn so egbu azụ. Jesu wee sị Saịmọn, “A tụla egwu! Site ugbu a, ị ga na-anwụta mmadụ na ndụ.” Ha wee kwọpụta ụgbọ ha n’elu ala, hapụ ihe niile wee soo Ya.
Igbo Mass Readings for February 10 2025, Mọnde Izuụka nke Ise N’Oge Nkịtị