Igbo Mass Readings for March 26 2023, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ
Nke a bụ Igbo Mass Readings for March 26 2023, Ụka nke Ise N’oge Ncheta Ahụhụ Kristi – Afọ Nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 37:12-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Izikel
Onyenweanyị kwuru sị: “Ugbu a, ana M aga imeghe ala ili ụnụ. Ndị nke M, ihe M bu n’obi bụ isi n’ala ili ụnụ kulite ụnụ, bịakwa dughachị ụnụ azụ n’ala Izrel.
Ndị nke M, ụnụ ga-amata na abụ M Osebụrụwa, mgbe M meghere ala ili ụnụ bịakwa si n’ala ili kulite ụnụ. Aga m etinyekwa mmụọ M n’ime ụnụ; ụnụ ewere bịa dị ndụ.
Aga M emekwa ka ụnụ gaa birikwa n’ala ụnụ ọzọ. Ụnụ ga-amatakwa na Mụ onwe M bụ Dinwenụ, bụ Ọkaa Omee. Ọ bụ ihe a ka Onyenweanyị kwuru.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 129 Az. 7
Azịza. Ebere na uju mgbapụta dị n’ebe Onyenweanyị nọ.
1. Onyenweanyị, site n’ime mmiri miri emi ka m si akpọku Gị.
Onyenweanyị nụrụ olu m.
Biko tọọ ntị n’ala nụrụ olu akwa m ji arịọ Gị arịrịọ. Azịza.
2. Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị hụwachaa mmehie anyị ama,
Onyenweanyị ọ bụ onye ga-afọ?
Ma n’ebe Ị nọ ka a na-achọta mgbaghara.
N’ihi ya ka anyị ji akpọrọ Gị isi ala. Azịza.
3. Mkpụrụobi m na-eche Onyenweanyị.
Atụkwasara m obi n’okwu Ya.
Mkpụrụobi m na-achọ Onyenweanyị,
karịa otu onye nche abalị si eche chi ọbụbọ.
Ka onye nche abalị chewe chi ọbụbọ,
ma Izrel chewe Onyenweanyị. Azịza.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 8:8-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Isi Okwu: Mmụọ nke Onye ahụ kulitere Jesu n’ọnwụ bi n’ime ụnụ.
Ndị na-ebi ndụ irubere anụ ahụ ha isi apụghị ime ihe na-amasị Chineke. Ma otu ọ dị, ụnụ onwe ụnụ anaghịzi adị ndụ dị ka anụ ahụ si chọọ. Kama ụnụ na-adị ndụ dị ka Mmụọ Nsọ si chọọ, ma ọ bụrụ na Mmụọ nke Chineke na-ebi n’ime ụnụ n’eziokwu.
N’ihi na onye ọ bụla na-enweghị Mmụọ nke Kristi abụghị onye nke Ya. Ma ọ bụrụ na Kristi bi n’ime ụnụ, ọ bụ ezie n’ahụ ụnụ nwụrụ anwụ n’ihi mmehie, ma Mmụọ Nsọ ga-enye ụnụ ndụ, n’ihina Chineke agụnyela ụnụ na ndị ezi omume.
Ọ bụrụ na Mmụọ nke Chineke, Onye ahụ mere ka Jesu si n’ọnwụ bilie, bi n’ime ụnụ, Onye ahụ mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, ga-esitekwa n’aka Mmụọ Nsọ Ya nke bi n’ime ụnụ, mee ka ahụ ụnụ nke pụrụ ịnwụ anwụ dị ndụ.
MBEKU – Jọn 11:25-26
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
Onyenweanyị kwurụ sị: Abụ M mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye ọ bụla kwere na M agaghị anwụ anwụ.
R/ Otito na ebube dịrị Gị, O Dinwenụ, Jesu Kristi.
OZIỌMA – 11:1-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Isi Okwu: Abụ M mbilite n’ọnwụ na ndụ.
N’oge ahụ, otu nwoke a na-akpọ Lazarọs dara n’ọrịa. Nwoke a bi na Betani nke bụ obodo Meri na nwanne ya bụ Mata. Meri nke a bụ nke ahụ tere ụkwụ Onyenweanyị mmanụ, werekwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ Ya.
Ma nwanne ya, Lazarọs dara n’ọrịa. Ụmụnne nwanyị abụọ ndị a zigaara Jesu ozi, sị Ya: “Onyenweanyị, enyi Gị nwoke na-arịa ọrịa.” Ma mgbe Jesu nụrụ ya, Ọ sịrị: “Ọrịa nke a abụghị nke ga-ewetara Lazarọs ọnwụ, kama nke ga-ewetara Chineke otito, ka e wee site na ya nye Nwa Chineke otito.”
Jesu hụrụ Mata na nwanne ya nwanyị, na Lazarọs n’anya, ma mgbe Ọ nụrụ na Lazarọs na-arịa ọrịa, Ọ nọkwuuru ụbọchị abụọ n’ebe ahụ. Mgbe ụbọchị abụọ ahụ gasịrị, Ọ sịrị ndị Ụmụazụ Ya: “Ka anyị jeenụ Judia ọzọ.”
Ụmụazụ Ya sịrị Ya: “Onye nkuzi, ugbu a ka ndị Juu na-achọ ụzọ ịtụ Gị nkume. Ị na-ejekwa ebe ahụ ọzọ?” Ma Jesu zara sị: “Ọ bụ na ọ bụghị elekere iri na abụọ dị n’ehihie?
Ọ bụrụ na mmadụ ejegharịa n’ehihie, Ọ gaghị akpọbi ụkwụ, n’ihi na o nwere ihe nke ụwa a iji hụ ụzọ. Ma ọ bụrụ na mmadụ ejegharịa n’abalị ọ ga-akpọbi ụkwụ, sọọ ngọngọ, n’ihi na ihe adịghịkwa iji duzi ya.
Mgbe Jesu kwusịrị ihe ndị a, Ọ sịrị Ụmụazụ Ya: “Enyi anyị Lazarọs adala n’ụra. Ma ana M aga ka M kpọtee ya n’ụra.” Ụmụazụ Ya wee sị Ya: “Onyenweanyị, ọ bụrụ na o dina n’ụra, ahụ ga-adị ya mma.”
Mgbe Jesu na-ekwu banyere ọnwụ Lazarọs, Ụmụazụ Ya chere na Ọ na-ekwu banyere ịda n’ụra nke efu. Jesu wee kọọrọ ha ihe merenụ, sị: “Lazarọs anwụọla.
Ma n’ihi ụnụ ana M añụrị ọñụ na anọghị M n’ebe ahụ mgbe ọ nwụrụ, ka ụnụ wee kwere. Ngwanụ ka anyị jekwurunụ ya.” Tọmọs, onye a na-akpọ Ejima, were gwa ndị Ụmụazụ Jesu ibe ya sị: “Ka anyị soronụ Ya jee, ka anyị sorokwa Ya nwụọ!”
Mgbe Jesu bịaruru. Ọ hụrụ na ozu Lazarọs anọọla ụbọchị anọ n’ili. Betani dị Jerusalem nso, ihe dị ka kilomita anọ. Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị Juu bịara ka ha kasie Mata na Meri obi maka ọnwụ nwanne ha nwoke.
Mgbe Mata nụrụ na Jesu abịala, o jere zute Ya. Ma Meri nọdụrụ n’ụlọ. Mata wee sị Jesu: “Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị nọbu n’ebe a, nwanne m nwoke agaralaghị anwụ!
Ma ama m na, ọ bụna ugbu a, Chineke ga-enye gị ihe ọ bụla ị rịọrọ n’aka Ya.” Jesu wee sị ya: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Mata wee sị Ya: “Ama m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie na mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”
Jesu wee sị ya: “Mụ onwe M bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye ọ bụla kwere na M, a sịkwarị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ. Ọzọkwa, onye ọ bụla dị ndụ bịakwa kwere na M, ọ gaghị anwụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi. I kwere nke a?”
O wee sị Jesu, “Ee Onyenweanyị, ekwere m na Ị bụ Kristi ahụ, bụrụkwa Nwa Chineke, Onye ahụ ga-abịa n’ụwa a.” Mgbe Mata kwusịrị nke a, o jere kpọọ nwanne ya nwanyị, bụ Meri, na nzuzo, sị ya: “Onye nkuzi nọ n’ebe a.
Ọ na-akpọkwa gị.” Mgbe Meri nụrụ ya, o bilie ọsọ ọsọ jekwuru Jesu. Ma Jesu abịarubeghị n’ime obodo nta ahụ, kama ọ ka nọ n’ebe Mata zutere ya.
Mgbe ndị Juu, ndị ha na Meri nọ n’ụlọ, ndị na-akasikwa ya obi hụrụ ka Meri biliri ngwa ngwa pụọ, ha sochiri ya azụ. N’ihi na ha chere na ọ na-aga n’ili ka o bee akwa n’ebe ahụ.
Mgbe Meri bịaruru n’ebe Jesu nọ, wee hụ Ya, ọ dara n’ala n’ụkwụ Jesu, na-asị Ya: “Onyenweanyị, ọ bụrụ na Ị nọbu n’ebe a, nwanne m nwoke agaghịrị anwụ.”
Mgbe Jesu hụrụ Meri ka ọ na-akwa akwa; mgbe Ọ hụkwara ndị Juu ndị so ya bịa ka ha na-akwakwa akwa, Ọ sụrụ ude n’ime mmụọ Ya. O metụkwara Ya n’obi nke ukwu.
O wee jụọ ha sị: “Olee ebe ụnụ liri ya?” Ha wee sị Ya: “Onyenweanyị, bịa ka Ị hụ.” Jesu wee kwaa akwa. Ndị Juu kwuru, sị: “Lee, otu O si hụ ya n’anya.”
Ụfọdụ n’ime ha na-ekwukwa, sị: “Onye a meghere anya onye ahụ kpuru isi, ọ pụghị ime ka nwoke a ghara ịnwụ anwụ?” Jesu sụrụ ude n’ime onwe Ya ọzọ, wee bịaruo n’ili ahụ.
Ma ili ahụ bụ ọgba, nke e ji nkume kpuchie ọnụ ya. Jesu wee sị: “Bupụnụ nkume ahụ!” Mata, nwanne nwanyị nke nwoke ahụ nwụrụnụ, wee sị Ya: “Onyenweanyị ọ na-esi isi ugbu a.
N’ihi na ọ nwụrụ kemgbe ụbọchị anọ.” Jesu wee sị ya: “Agwaghị M gị na ọ bụrụ na i kwere ị ga-ahụ ebube Chineke?” Ha wee bupụ nkume ahụ. Jesu wee welie anya elu sị: “Nna, ekelee m Gị na Ị nụrụ olu M.
Ama M na Ị na-anụ olu M mgbe niile. Ma n’ihi igwe mmadụ ndị guzo ebe a ka M ji ekwu nke a, ka ha wee kwere na ọ bụ Gị onwe Gị zitere M.” Mgbe O kwusịrị nke a, O jiri oke olu kpọọ oku, sị: “Lazarọs! pụta!”
Onye ahụ nwụrụ anwụ wee pụta. E jiri akwa ozu kekọtaa aka ya na ụkwụ ya. E jikwa akwa ozu kee ihu ya. Jesu wee sị ha: “Tọpụnụ ya ka ọ laa.” Ọtụtụ ndị Juu bịara ileta Meri hụrụ ihe a mere, kwere na ya.
Igbo Mass Readings for March 27 2023, Mọnde Izuụka nke Ise n’Oge Lent
TO ALL OUR READERS
Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.