Igbo Mass Readings for May 14 2023, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 14 2023, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 8:5-8, 14-17

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Ha bikwasịrị ha aka n’isi ha wee nata Mmụọ Nsọ.

Filip jere otu obodo dị n’ala Sameria gwa ha okwuchukwu maka Kristi. Igwe mmadụ ndị obodo ahụ weere otu obi ñaa ntị n’ozi Filip n’ihi na ha hụrụ ọrụ ebube dị iche iche nke Filip n’onwe ya rụrụ.

N’ihi na site n’ọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ siri n’ahụ ọtụtụ ndị ha ji pụta na-eti mkpu n’oke olu. E mekwara ka ahụ dị ọtụtụ mmadụ ike, ma ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ma ndị dara ngwọrọ.

Oke ọñụ wee dị n’obodo Sameria. Mgbe Ụmụazụ nọ na Jerusalem nụrụ na ndị Sameria anabatala okwu Chineke, ha zigaara ha Pita na Jọn. Mgbe ha bịaruru, ha kpeere ndị kwere ekwe ekpere, ka ha nata Mmụọ Nsọ.

N’ihi na Mmụọ Nsọ adakwasịbeghị onye ọ bụla n’ime ha. Naanị ihe e mere ha bụ mmirichukwu n’aha Onyenweanyị Jesu. N’oge ahụ, Pita na Jọn wee bikwasị ha aka n’isi, ha wee nata Mmụọ Nsọ.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 65:1-7, 16, 20 Az. 1

Azịza: Ka ụwa niile tiere Chineke mkpu ọñụ.

Ma ọ bụ Aleluya

1. Ụwa niile, tierenụ Chineke mkpu ọñụ.

Kweerenụ aha Ya ukwe otito.

Kwuputanụ otito Ya dị ebube.

Gwanụ Chineke: “Aka ọrụ Gị adịka omimi.” Azịza.

2. Ka ụwa niile sekpuoro Gị,

bịakwa kwee ukwe otito Gị.

Bịanụ lee ọrụ nke Chineke.

Leenụ ọrụ ebube Ọ rụụrụ ụmụ mmadụ. Azịza.

3. Ọ gbanwoola oke osimiri ka ọ ghọọ ala akọrọ.

Ha weere ụkwụ kufee osimiri.

N’ihi ya, ka anyị ñụrịanụ ọñụ n’ime Ya.

O ji ike dị egwu na-achịru mgbe ebighị ebi. Azịza.

4. Ndị niile na-asọpụrụ Chineke, ngwa geenụ ntị.

Ka m kọọ akụkọ ọrụ ebube Ọ rụụrụ m.

Ngọzi dịrị Chineke onye na-ajụghị ịña ntị n’arịrịọ m.

Ọ jụghịkwa igosi m obi ọma Ya. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 3:15-18

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pita dị asọ dere

Isi Okwu: E mere ka Ọ nwụọ n’anụ ahụ, meekwa ka ọ dị ndụ na mmụọ.

Sọpụrụnụ Kristi n’ime obi ụnụ. Nyekwanụ Ya ọnọdụ dịka Onyenwe ụnụ. Jikerekwanụ mgbe ọ bụla ịza ajụjụ ọ bụla mmadụ ga-ajụ ụnụ banyere olile anya ahụ ụnụ nwere.

Ma werekwanụ nwayọọ na nsọpụrụ kpee ọnụ ụnụ. Mekwaanụ ka akọnuche ụnụ dị ọcha, ka ọ ga-abụ, mgbe ndị mmadụ na-ekwutọ ụnụ n’ihi omume ọma ụnụ ji biri n’ime Kristi, ihere emee ha n’ihe ha na-ekwu.

N’ihi na ọ ka mma, ma ọ bụrụ uche nke Chineke, ka ụnụ hụ ahụhụ n’ihi na ụnụ na-eme ezi ihe, karịa ụnụ ịhụ ahụhụ n’ihi na ụnụ na-eme ihe ọjọọ. N’ihi na Kristi nwụrụ n’ihi ụnụ.

Ọ nwụrụ naanị otu mgbe n’ihi mmehie ụnụ. Onye ezi omume nwụrụ n’ihi ndị ajọ omume, ka O wee dugara ụnụ Chineke. N’ihi na e mere ka Ọ nwụọ n’anụ ahụ, ma e mekwara ka Ọ dị ndụ na mmụọ.

MBEKU – Luk 24:32

Aleluya, aleluya!

Onyenweanyị Jesu, kọwaara anyị okwu Gị nke ọma. Mee ka okwu Gị na-amụnye ọkụ ịhụnanya n’obi anyị.

Aleluya!

OZIỌMA – 14:15-21

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: A ga M arịọ Nna, Ọ ga-enyekwa ụnụ Onye-Nkasi-obi ọzọ.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya: “Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ M n’anya, ụnụ ga-edebe iwu M niile. Aga M ekpekwara Nna M, Ọ ga-enyekwa ụnụ Onye Nkasi Obi ọzọ ka Ọ nọnyere ụnụ ruo mgbe ebighị ebi.

Onye Nkasi Obi ahụ bụ Mmụọ nke eziokwu, Onye ụwa na-apụghị ịnabata, n’ihi na ụwa adịghị ahụ Ya. Ụwa amaghịkwa Ya. Ma ụnụ ma Ya. N’ihi na Ọ nọnyeere ụnụ, birikwa n’ime ụnụ.

“Agaghị M ahapụ ụnụ dịka ndị na-enweghị nne na nna. Kama, aga M abịakwute ụnụ. Ọ fọdụrụ nwa oge ntakịrị ụwa agaghị ahụkwa M ọzọ. Ma ụnụ ga na-ahụ M n’ihi na adị M ndụ; Ụnụ onwe ụnụ ga-adịkwa ndụ.

N’ụbọchị ahụ, ụnụ ga-amata na anọ M n’ime Nna M; marakwa na ụnụ nọ n’ime M, Mụ onwe M nọkwa n’ime ụnụ. “Onye ọ bụla natara iwu M na-edebe ha bụ onye hụrụ M n’anya. Onye hụrụ M n’anya ka Nna M ga-ahụ n’anya. Aga M ahụkwa onye ahụ n’anya, bịakwa gosi ya onwe M.”

Igbo Mass Readings for May 15 2023, Mọnde Izuụka nke Isii n’oge Iista

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 14 2023, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Mbụ.

Catholic Sunday and Daily Mass Readings for 2024 (Kindle eBook & Paperback)

X
Scroll to Top

Receive Daily Mass Readings and Reflections via Email

You have successfully subscribed to the newsletter

There was an error while trying to send your request. Please try again.

Catholic Lectionary will use the information you provide on this form to be in touch with you and to provide updates and marketing.