Igbo Mass Readings for May 5 2024, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 5 2024, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 10:25-26, 34-35, 44-48

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: A wụsara onyinye nke Mmụọ Nsọ Ọ bụna n’isi ndị mba ọzọ.

Mgbe Pita batara, Kọneliọs zutere ya, daa n’ala n’ụkwụ ya, wee kpọọrọ ya isi ala. Ma Pita kuliri ya, sị ya: “Bilie! Abụ m mmadụ dịka gị”. Pita wee bido okwuchukwu ya, sị: “Ugbu a ka m na-aghọta n’ezi okwu, na Chineke abụghị onye na-asọ mmadụ anya.

Kama na mba ọ bụla, onye na-atụ egwu Ya, nke na-arụkwa ọrụ ezi omume, ka Ọ na-anara nke ọma. Pita ka kpụ okwu n’ọnụ, mgbe Mmụọ Nsọ dakwasịrị ndị niile nụrụ okwuchukwu ya.

E nwere ndị Juu kwere na Kristi, sokwa n’agbụrụ ndị e biri ugwu nọ n’ebe ahụ. Ha na Pita soro si na Jopa bịa n’ebe ahụ. Ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu ịhụ na Chineke wụsara onyinye nke Mmụọ Nsọ Ya, ọ bụna n’isi ndị mba ọzọ.

N’ihi na ha na-anụ ka ndị mba ọzọ ahụ na-ekwu n’asụsụ ọzọ dị iche iche, na-eto ịdị ebube Chineke. Pita kwukwara sị: “Ndị a anatala Mmụọ Nsọ otu anyị natara.

Mmadụ efu ọ pụrụ igbochi iji mmiri mee ha mmirichukwu?” Mba! O wee nye ike ka e mee ha mmirichukwu n’aha Jesu Kristi. E mesia, ha rịọrọ Pita ka o binyere ha ụbọchị olemole.

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 97:1-4 Az. 2

Azịza: Onyenweanyị emeela ka mba niile hụ ike nzọpụta Ya.

1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ n’ihi na Ọ rụọla ọrụ ebube.

Aka nri Ya na ogwe aka Ya dị asọ enwetarala Ya nzọpụta. Azịza.

2. Onyenweanyị emeela ka a mata nzọpụta Ya.

O meela ka anya ụmụ mba hụ ikpe nkwụmọtọ Ya.

O chetala obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi nke O mere maka Ụlọ Izrel. Azịza.

3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.

Ụwa niile, kweerenụ Onyenweanyị ukwe añụrị.

Gụọnụ egwu; kwebenụ ukwe otito. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 4:7-10

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ nke Jọn dị asọ dere

Isi Okwu: Chineke bụ ịhụnanya

Ndị m hụrụ n’anya! Ka anyị hụrịtaanụ ibe anyị n’anya, n’ihi na ịhụnanya si na Chineke pụta. Onye ọ bụla nwere ịhụnanya bụ nwa Chineke. Ọ makwaara Chineke.

Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke. N’ihi na Chineke bụ ịhụnanya. Otu a ka Chineke si gosi ịhụnanya Ya n’ebe anyị nọ: O zitere Nwa Ọ mụrụ naanị Ya n’ụwa ka anyị wee dị ndụ site n’aka Ya.

Otu a ka ịhụnanya ahụ dị. Ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke n’anya. Kama na Chineke hụrụ anyị n’anya wee zite Nwa Ya, ka Ọ bụrụ ihe ịjụrụ Ya obi maka mmehie anyị.

MBEKU – Jọn. 14:23

Aleluya, aleluya!

Onye ọ bụla hụrụ M n’anya na-ejidesi okwu M ike. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.

Aleluya!

OZIỌMA – 15:9-17

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: O nweghị ịhụnanya karịrị nke a na mmadụ ga-atụfu ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.

Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Otu Nna M si hụ M n’anya ka M si hụ ụnụ n’anya. Nọgidenụ n’ime ịhụnanya M. Ọ bụrụ na ụnụ edebe iwu M ụnụ ga-anọgide n’ime ịhụnanya M dịka M si edebe iwu nke Nna M, wee nọgide n’ịhụnanya Ya.

“Agwara M ụnụ ihe ndị a ka ọñụ M wee zuo oke n’ime ụnụ, na ka ọñụ ụnụ wee zuokwa oke. Nke a bụ ihe M nyere ụnụ n’iwu: Ka ụnụ hụrịta ibe ụnụ n’anya, dịka Mụ onwe si hụ ụnụ n’anya.

Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya nke karịrị nke a: Na mmadụ ga-atụfu ndụ ya n’ihi ndị enyi ya. Ụnụ bụ ndị enyi M, ma ọ bụrụ na ụnụ edebe iwu M nyere ụnụ.

Anaghị M akpọ ụnụ ndị ohu ọzọ. N’ihi na ohu adịghị ama ihe onye nwe ya na-eme. Kama ana M akpọzi ụnụ ndị enyi M. N’ihi agwala M ụnụ ihe niile M nụrụ n’ọnụ Nna M.

Ọ bụghị ụnụ họpụtara M, kama ọ bụ M họpụtara ụnụ, wepụtakwa ụnụ iche ka ụnụ jee, mịa ọtụtụ mkpụrụ, ka mkpụrụ ụnụ wee dịrị gawa. Nke a ga-eme ka Nna M nye ụnụ ihe ọ bụla ụnụ rịọrọ Ya n’aha M. Leenụ ihe m na-enye ụnụ n’iwu: “Hụrịtaanụ ibe ụnụ n’anya.”

Igbo Mass Readings for May 6 2024, Mọnde Izuụka nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi

Igbo Mass Readings for May 5 2024, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Abụọ.

Last Update: April 5, 2023