Igbo Mass Readings for May 25 2025, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

Nke a bụ Igbo Mass Readings for May 25 2025, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:1-2, 22-29

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Ọrụ Ndị Ozi

Isi Okwu: Anyị na Mmụọ Nsọ e kpebiela ka a ghara ibo ụnụ ibu arọ karịa naanị ihe ndị a dị mkpa.

N’oge ahụ, ụfọdụ mmadụ wee si na Judia bịa na Antiọk na-akuziri ndị ụmụnna n’ime Kristi, sị: “A gaghị azọpụta ụnụ ma ọ bụrụ na e bighị ụnụ ugwu dịka Iwu Mosis si kwu.”

Ha na Pọl na Banabas rụrịtara ụka nke ukwu maka nke a. N’ihi nke a, Ụmụazụ wee kpebie ka Pọl na Banabas, na ụfọdụ ndị isi ndị ọzọ nọ na Antiọk, soro gaa Jerusalem hụ Ụmụazụ na Ndị Okenye nke Nzukọ Kristi banyere okwu a.

Mgbe ahụ, Ụmụazụ na Ndị Okenye wee kpebie ịhọpụta ndị ozi a ga-eziga na Antiọk, tinyekwuoro Pọl na Banabas. Ha wee họpụta Judas, onye a na-akpọkwa Basabas, na Saịlas, ndị bụ ndị a na-asọpụrụ n’etiti ụmụnna. Ha nyekwara ha akwụkwọ ozi ha ga-eji gaa ozi a:

“Anyị bụ ndị Ụmụazụ na Ndị Okenye, na ụmụnna ụnụ! Anyị na-ewetara ụnụ ozi ekele. Ụmụnna anyị ndị bi na Antiọk, na Siria, na Silisia; Ụnụ niile bụ ndị a mụrụ na mba ọzọ!

Anyị na-ekele ụnụ ekele n’ime Onyenweanyị. Anyị anụla na ụfọdụ ndị otu anyị siri ebe a bịakwute ụnụ, na-esogbu ụnụ, were okwu mee ka obi lọọ ụnụ mmiri.

Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla ha natara ike n’aka anyị ime ihe dị otu a. N’ihi nke a anyị ezukọọla, were otu obi kpebie izitere ụnụ ndị ozi ụfọdụ, ha na ndị anyị hụrụ n’anya, bụ Banabas na Pọl, ndị werela ndụ ha tụnye n’ihi aha na ozi nke Onyenweanyị Jesu Kristi.

Anyị ezitela Judas na Saịlas, ndị ga-akọwara ụnụ ihu na ihu, ihe anyị dere n’akwụkwọ ozi. N’ihi na ọ dị anyị na Mmụọ Nsọ mma, ka a ghara ibo ụnụ ibu arọ banyere omenala ndị Juu karịa naanị ihe ndị a dị mkpa: Ụnụ erila ihe ọ bụla ejiri chụọ aja nye arụsi; ụnụ erila ọbara; ụnụ erila anụ a nyagburu anyagbu; ụnụ akwala iko. Ụnụ jide onwe ụnụ, ghara ime ihe ndị a, ụnụ ga-eme nke ọma. Nọdụnụ mma!”

ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 66:2-3,5-6,8 Az. 4

Azịza: Chineke m, ka mba niile too Gị.

Ma ọ bụ Aleluya

1. Ka Chineke meere anyị ebere gọzie anyị.

Ya mee ka ihè Ya chakwasa anyị.

Ka e si otu a mata ụzọ Gị n’elu ụwa;

mba niile ewee mata nzọpụta Gị. Azịza.

2. Ka ụwa niile ñụrịa bịakwa tee egwu ọñụ.

Maka na Ị kwụbara aka ọtọ wee na-achị mba niile.

Ọ bụ Gị na-eduzi obodo niile dị n’ụwa. Azịza.

3. Chineke m, ka mmadụ niile too Gị.

Ka mmadụ niile too Gị.

Ka Chineke gọzie anyị;

ka akụkụ ụwa niile tụọrọ Ya egwu. Azịza.

IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 21:10-14, 22-23

Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Mkpughe

Isi Okwu: O wee gosi m obodo Nsọ ahụ si n’eluigwe n’arịdata.

Mmụọ ozi ahụ wee bulie m n’ike Mmụọ Nsọ, buga m n’otu ugwu dị oke elu. O wee gosi m Obodo Nsọ ahụ, bụ Jerusalem, ka o si n’eluigwe n’ebe Chineke nọ, na-arịdata.

O jupụtara n’ebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkasịrị oke ọnụ ahịa, dịka nkume jaspa, dị ka nkume krịstal. Obodo ahụ nwekwara mgbidi dị oke elu, nke nwere ọnụ ụzọ iri na abụọ; nwekwaa ndị mmụọ ozi iri na abụọ ndị na-eche ọnụ ụzọ ahụ nche.

E dekwasịkwara n’ọnụ ụzọ iri na abụọ ahụ, aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izrel. N’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke mgbidi ahụ, ọnụ ụzọ atọ dị; n’akụkụ ọdịda anyanwụ ọnụ ụzọ atọ dịkwa; n’akụkụ ugwu, ọnụ ụzọ atọ dị, n’akụkụ ndịda, ọnụ ụzọ atọ dịkwa.

E wuru mgbidi obodo ahụ n’elu nkume ntọala iri na abụọ. E dekwasịkwara aha Ụmụazụ iri na abụọ nke Nwatụrụ ahụ, n’elu nkume iri na abụọ ahụ. Ọ dịghịkwa ụlọ nsọ ọ bụla m hụrụ n’ime obodo ahụ.

N’ihi na Onyenweanyị Chineke nke pụrụ ime ihe niile, Ya na Nwatụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ ya. Ihe sị n’anyanwụ ma ọ bụ n’ọnwa adịghịkwa obodo ahụ mkpa, n’ihi na ebube Chineke na-enye ya ihe; oriọna ya bụkwa Nwatụrụ ahụ.

MBEKU – Jọn 14:23

Aleluya, aleluya!

Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahụkwa ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.

Aleluya!

OZIỌMA – 14:23-29

Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere

Isi Okwu: Mmụọ Nsọ ga-echetara ụnụ ihe niile M gwara ụnụ.

Jesu gwara ndị Ụmụazụ Ya, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ M n’anya, ọ ga-edebe okwu M. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwutekwa ya, mee ya ebe obibi Anyị.

Onye na-ahụghị M n’anya agaghị edebe okwu M. Ma okwu nke ụnụ na-anụ abụghị nke M, kama nke Nna M, bụ onye zitere M. Agwala M ụnụ ihe ndị a ugbu a Mụ na ụnụ ka nọ.

Ma Onye Nkasi Obi ahụ, bụ Mmụọ Nsọ, Onye Nna M ga-ezite n’aha M, ga-akuziri ụnụ ihe niile. Ọ ga-emekwa ka ụnụ cheta ihe niile M gwara ụnụ. “Udo ka M na-ahapụrụ ụnụ.

Udo nke M ka M na-enye ụnụ. Ọ bụghị dịka ụwa si enye udo ka M si enye ya ụnụ. Ka obi ụnụ ghara ịlọ mmiri, ka ụnụ gharakwa ịtụ ụjọ. Ụnụ anụla na agwara M ụnụ na aga M ala, na e mesia aga M alaghachikwute ụnụ.

Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ M n’anya, ụnụ gaara añụrị ọñụ na ana M alakwuru Nna M. N’ihi na Nna M buru ibu karịa M. Ugbu a, agwala M ụnụ ihe a tupu o mezuo, ka ọ ga-abụ mgbe o mezuru ụnụ ekwere.

Igbo Mass Readings for May 26 2025, Mọnde Izuụka nke Isii n’oge Iista

TO ALL OUR READERS

Please don’t scroll past this. If you donate just ₦2000, or whatever you can, Online Catholic Lectionary could keep thriving for years. Take a minute to donate. Show the world that access to Online Catholic Lectionary matters to you and saves you from frequent buying of printed bulletin. Thank you.

Igbo Mass Readings for May 25 2025, Ụka Nke Isii N’oge Ncheta Mbilite N’Ọnwụ Kristi – Afọ nke Atọ.

Last Update: April 5, 2023