Igbo Mass Readings for February 15 2026, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
Nke a bụ Igbo Mass Readings for February 15 2026, Ụka nke Isii n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume – Afọ nke Mbụ.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – 15:15-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Sirak
Isi Okwu: E nweghị onye ọ bụla O tiiri iwu ka ọ ghara ịma Chineke.
Ọ sọ gị, inwere ike idebe iwu Chineke. Ime uche Ya bụ ihube isi. Ihe e chere gị n’ihu bụ ọkụ na mmiri. Nke ọ bụla ị chọrọ, chee aka were ya. Ihe e chere mmadụ n’ihu bụ ọnwụ na ndụ.
Nke ọ bụla onye họọrọ, e nye ya. Amamihe Onyenweanyị ebuka! Ike Ya pụrụ ime ihe niile. Ọ na-ahụzu ihe niile. Anya Chineke na-ahụzucha ihe niile O mere. Ọ na-aghọta ihe ọ bụla mmadụ na-eme. O nweghị onye ọ bụla Ọ na-edunye ka o mee njọ. O nweghịkwa onye Ọ na-enye ike ịgha ụgha.
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – 118:1-2,4-5,17-18, 33-34 Az. 1
Azịza Ngọzi dịrị ndị na-eso iwu nke Onyenweanyị.
1. Ngọzi dịrị ndị ụta na-adịrịghị;
ndị na-aga n’usoro iwu nke Onyenweanyị.
Ngọzi dịrị ndị na-edowe atụmatụ Ya,
ndị obi ha niile na-achọ Ya. Azịza
2. I nyere iwu na a ga-eleru anya ala debechaa atụmatụ Gị niile.
Ewoo! Ọ dị nnọọ ka m guzosie ike n’ịga n’okporo ụzọ iwu nke Onyenweanyị. Azịza
3. Meere nwodibo Gị amara ka m bibe ndụ wee na edebe okwu Gị.
Meghee anya m ka m wee tulee uche n’ịdị ebube nke iwu Gị. Azịza
4. Onyenweanyị, kuziere m okporo ụzọ nke iwu Gị,
ka m wee tọọ anya n’ala debechaa ha niile.
Nye m ike ileru anya ala ka m wee debe iwu Gị,
bịakwa were obi m niile debechaa ha. Azịza
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ – 2:6-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara ndị Kọrịnt
Isi Okwu: Amamihe bụ akara aka Chineke ji kwanyere anyị ugwu tupu a tọọ ntọala ụwa.
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe n’ebe ndị tozuru oke n’ime mmụọ nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, ma ọ bụ nke ndị na-achị ụwa taa, ndị amamihe na ọchịchị ha na-agafe agafe.
Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke n’ụzọ dị omimi, bụ amamihe nke Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya n’oge a maka iwetara anyị otito.
Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị na-achị ụwa n’oge a ghọtara amamihe ahụ. Ọ bụrụ na ha maara, ha agaralaghị akpọgide Onyenwe ebube n’obe. Ma dịka Akwụkwọ Nsọ si kwu: “Ihe anya na-ahụbeghị, nke ntị na-anụbeghịkwa: Ihe obi na-echeghị na ọ pụrụ ime eme, Ka Chineke dozirila ndị hụrụ ya n’anya.”
Ma ọ bụ naanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi ndị a, site n’ike Mmụọ Nsọ Ya. Mmụọ Nsọ ahụ n’Onwe Ya na-enyocha ihe niile, ọ bụna ihe omimi niile dị na Chineke.
MBEKU – Jọn 14:23
Aleluya, aleluya!
Onye ọ bụla hụrụ M n’anya ga-edebe okwu m. Nna M ga-ahụ ya n’anya. Anyị ga-abịakwute ya.
Aleluya!
OZIỌMA – 5:17-37 ma ọ bụ 5:20-22, 27-28, 33-34, 37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Isi Okwu: Ụnụ anụla ihe a gwara nna anyị ha. Ma leenụ ihe M na-agwa ụnụ.
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: (“Ụnụ echekwala na abịara M imebi iwu Mosis ma ọ bụ nkuzi ndị amụma. A bịaghị M imebi ya emebi; Kama abịara m imezu ya emezu.
N’ịgwa ụnụ eziokwu, ruo mgbe eluigwe na ala ga-agafere, ọ dịghị otu ihe ọ bụla dị nta, ọ bụna nke dịkarisịrị nta, nke a ga-esi n’iwu Chineke wepụ, ruo mgbe e mezuru ha niile.
Ya mere, onye ọ bụla ga-emebi otu n’ime iwu ndị a, ọ bụna nke dịkarisịrị nta, wee kuzikwaara ndị mmadụ ime otu ahụ, ga-abụ onye dịkarisịrị nta n’alaeze eluigwe.
Ma onye ọ bụla ga-edebe iwu ahụ, wee kuzikwaara ndị ọzọ ime otu ahụ, ga-abụ nnukwu mmadụ n’alaeze eluigwe). Asị m ụnụ, ọ bụrụ na ezi omume ụnụ akarighị nke ndị Ode-akwụkwọ na nke ndị Farisii, ụnụ apụghị ịbanye n’alaeze eluigwe ma ọlị. “Ụnụ anụla na a gwara ndị mgbe ochie sị: ‘Ụnụ egbula mmadụ.
Onye ọ bụla gburu mmadụ, a ga-ama ya ikpe, kwụgbuo ya. Ma Mụ onwe M na-agwa ụnụ sị: “Onye ọ bụla buuru nwanne ya iwe n’obi a ga-ama ya ikpe.
(Onye ọ bụla kpọrọ nwanne ya ‘Onye iberibe!” ga-aza azịza n’ụlọ ikpe. Onye ọ bụla na-akpọ nwanne ya ‘Onye Nzuzu!’ ga-eje n’ọkụ ala mmụọ. Ya mere, ọ bụrụ na i weta onyinye gị n’ihu ebe nchụaja, wee cheta n’ebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị na mma, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe nchụaja.
Buru ụzọ jee ka gị na nwanne gị mezie. Ụnụ dozisịa, bịa chee onyinye gị n’ihu Chineke. “Gị na onye gbara gị akwụkwọ, kpụrụ gị na-agaje ụlọ ikpe, mee enyi ngwa ngwa mgbe gị na ya ka nọ n’ụzọ, ka onye ahụ gbara gị akwụkwọ wee ghara inyefe gị n’aka onye ọka ikpe.
Onye ọka ikpe ewee duru gị nye ndị uwe ojii; ndị uwe ojii ewee tinye gị n’ụlọ mkpọrọ. N’ịgwa gị n’eziokwu, i nweghị ike isi ebe ahụ pụta ma ọlị, ruo mgbe ị kwụzuru ụgwọ niile i ji).
“Ụnụ anụla na e kwuru sị: “A kwala iko’, Ma ana M agwa ụnụ: “Onye ọ bụla lere nwanyị anya, ka agụụ nwanyị ahụ gụọ ya, akwasịla ya rị iko n’obi ya.
(Ya mere, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-akpatara gị ịdaba na njọ, ghụpụ ya, tufuo! Ọ kara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa idebe ya, a tụnye ahụ gị niile n’ọkụ ala mmụọ.
Ọ bụrụkwa aka nri gị na-akpatara gị ịdaba na njọ, ghụpụ ya, tufuo. Ọ kara gị mma ịtụfu otu akụkụ ahụ gị, karịa idebe ya, a tụnye ahụ gị niile n’ọkụ ala mmụọ. “Ekwukwara sị, “Onye ọ bụla chụpụrụ nwunye ya, ya nye ya akwụkwọ alụkwaghị m.
Ma ana M agwa ụnụ: Nwoke ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghị m, ma ọ bụghị n’ihi na ọ kwara iko, na-eme nwanyị ahụ ka ọ bụrụ onye na-akwa iko. Otu aka ahụ onye ọ bụla lụrụ nwanyị kewapụrụ na di, na-akwa iko).
“Ọzọ, ụnụ nụrụ na a gwara ndị mgbe ochie, sị: “A ñụla iyi ụgha, kama nyeghachi Onyenweanyị ihe ị ñụrụ n’iyi.’ Ma ana M agwa ụnụ: A ñụla iyi ma ọlị. (E jila eluigwe añụ iyi n’ihi na ọ bụ oche eze Chineke.
E jikwala ala añụ iyi n’ihi na ọ bụ oche mgbakwasị ụkwụ Chineke. E jila Jerusalem añụ iyi, n’ihi na ọ bụ obodo nke eze ukwu ahụ. E jikwala isi gị añụ iyi, n’ihi na ị pụghị ime ka otu ntụtụ isi gị dị ọcha ma ọ bụ oji).
Ya mere, ka okwu gị niile bụrụ. “E–” mgbe ị chọrọ ikwu “E-e”; ma ọ bụ “E-e” mgbe ị chọrọ ikwu “E-e”. Okwu ọ bụla kariri nke a si n’aka ajọ onye ahụ bụ ekwensu.
Igbo Mass Readings for February 16 2026, Mọnde Izuụka nke Isii N’Oge Nkịtị